LUK 1:34-38
LUK 1:34-38 Bible Nso (IGBOB)
Meri we si mọ-ozi ahu, Ìhe a gēsi aṅa me, ebe ọ dighi nwoke m'mara? Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke. Le kwa, Elizabet onye-ikwu-gi, ya onwe-ya aturuwo kwa ime nwa-nwoke n'agadi-ya: nke a bu kwa ọnwa nke-isi ya, bú onye anākpọ nwanyi-àgà. N'ihi na ọ dighi okwu ọ bula si Chineke n'ọnu puta nke nāgaghi-adi irè. Meri we si, Le, abum orù-nwanyi nke Onye-nwe-ayi; ya dirim ka okwu-gi si di. Mọ-ozi ahu we pua n'ebe ọ nọ.
LUK 1:34-38 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?” Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke. Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga. Nʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.” Meri zaghachiri sị, “Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.