Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 1:1-55

LUK 1:1-55 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ebe ọ bụ nʼọtụtụ mmadụ agbalịala otu ha nwere ike i detu nʼusoro ihe niile mezuru nʼetiti anyị. Dị ka e nyefere ha nʼaka anyị idebe bụ ndị ahụ sitere na malite jiri anya ha hụ ihe niile, ndị jikwa okwu a eje ozi. Ekpebikwara m, ebe mụ onwe m nyocharala ihe niile nke ọma site na mmalite, ka m dere gị ihe niile nʼusoro, Tiofilọs, gị onye dị elu a na-asọpụrụ. Nke a ga-eme ka ị mata nke bụ eziokwu banyere ihe ndị ahụ e ziri gị. Nʼoge Herọd bụ eze Judịa, ọ dị otu onyeisi nchụaja aha ya bụ Zekaraya, onye si nʼotu ndị nchụaja nke Abija. Elizabet bụ nwunye ya, site nʼagbụrụ Erọn. Ha abụọ bụ ndị ezi omume nʼihu Chineke. Ha debere iwu na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere na-enweghị ntụpọ ọbụla. Mana ha amụtaghị nwa, nʼihi na Elizabet bụ nwanyị agaa, ha abụọ emeela nnọọ agadi. O ruru mgbe ọ bụ ndị otu Zekaraya ga-eje ozi, ọ nọ dịka onye nchụaja na-eje ozi nʼihu Chineke. A họpụtara ya site nʼife nza dị ka omenaala ndị nchụaja si dị ka ọ bụrụ ya ga-abanye nʼime ime ụlọnsọ Onyenwe anyị ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ. Mgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere. Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye guzo nʼaka nri nke ebe ịchụ aja nke ihe na-esi isi ụtọ mere ka ọ hụ ya anya. Mgbe Zekaraya hụrụ ya, obi fepụrụ ya, ọ tụkwara oke egwu. Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya sị, “Zekaraya atụla egwu, Chineke anụla ekpere gị. Elizabet nwunye gị ga-atụrụ ime mụtara gị nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jọn. Ọ ga-abụrụ gị ihe oke ọṅụ na obi ụtọ, ọtụtụ mmadụ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ọmụmụ ya. Nʼihi na ọ ga-abụ onye dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gaghị aṅụkwa mmanya ọbụla, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-egbu egbu nʼihi na site nʼafọ nne ya ọ ga-abụ onye emejupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ ga-akpọghachite ọtụtụ ụmụ Izrel nye Onyenwe ha bụ Chineke ha. Ma ọ ga-aga nʼihu Onyenwe anyị nʼike mmụọ na ike nke Ịlaịja, tụgharịa obi ndị bụ nna nʼebe ụmụ ha nọ. Meekwa ka ndị isiike tụgharịa obi, lekwasị anya nʼamamihe nke ndị ezi omume, na ijikere ụmụ mmadụ nʼihi Onyenwe anyị.” Zekaraya sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu m ga-esi mata na nke a ga-adị otu a? Abụrụla m agadi. Nwunye m akakwaala nka.” Mmụọ ozi zara ya sị, “Abụ m Gebrel. Ana m eguzo nʼihu Chineke. Ezitere m ka m bịa gwa gị okwu ma wetara gị oziọma a. Ma lee, ị ga-ada ogbi, ị gaghị ekwukwa okwu ọbụla, tutu ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu nʼihi na i kwenyeghị nʼokwu m, nke ga-emezu mgbe oge ya ruru.” Mgbe ihe ndị a niile na-eme, mmadụ ndị ahụ nọkwa na-eche Zekaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe o mesịrị pụta, o nwekwaghị ike ikwuru ha okwu. Ha ghọtara na ọ hụrụ ọhụ nʼime ụlọnsọ ahụ nʼihi na ọ bụ aka ka o ji gwa ha okwu. Mgbe oge ịrụ ọrụ ya gwụsịrị, ọ laghachiri nʼụlọ ya. Mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, Elizabet bụ nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nʼime ụlọ ọnwa ise. Ọ sịrị, “Onyenwe anyị emeerela m nke a. O gosila m ihuọma ya nʼụbọchị ndị a, ma wepụkwara m ihere nʼetiti ndị nke m.” Ma nʼọnwa isii ya, Chineke zigara mmụọ ozi ya, bụ Gebrel, ka ọ gaa nʼobodo Nazaret nke dị nʼime Galili. Ka o jekwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere nʼagbụrụ Devid, kwere nkwa ịlụ. Aha nwaagbọghọ a bụ Meri. O jekwuru ya sị ya, “Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị.” Ma obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara. Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ. Ma lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs. Ọ ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.” Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?” Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke. Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga. Nʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.” Meri zaghachiri sị, “Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa. Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda. Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet. Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ. O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa. Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ. Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.” Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. O gosila ike aka ya; ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha. O sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu. O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu. O nyerela odibo ya bụ Izrel aka, ọ na-echetakwa imere ya ebere. Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”

LUK 1:1-55 Bible Nso (IGBOB)

Ebe ọtutu madu tinyere aka-ha ide akwukwọ banyere ihe ahu nke emezuworo n'etiti ayi, ha dere ihe ndi mbu ji anya ha hu ihe ndia burukwa ndi na-ekwuputa ozioma, gwara ayi, ọ di-kwa-ram nma, ebe m'soro ihe nile nke-ọma site na mbu, ka m'dere gi ka o si me, Teọfilọs di oké ebube; ka i we mata na ihe nile ejiworo okwu ọnu zí gi bu ihe kwesiri itukwasi obi. N'ubọchi Herod, eze Judia, otù onye-nchu-àjà di, aha-ya bu Zakaraias, nke si n'òtù obodo Abaija puta: o nwe-kwa-ra nwunye nke si n'etiti umu-nwanyi Eron puta; aha nwayi ahu bu Elizabet. Ha abua bu ndi ezi omume n'iru Chineke, nāga n'ihe nile Onye-nwe-ayi nyere n'iwu na n'ihe nile Ọ guru n'ihe ziri ezi nādighi ita uta. Ha ejighi kwa nwa, n'ihi na Elizabet bu nwanyi-àgà, ha abua aghọwo kwa agadi. Ma o rue, mb͕e ọ nālu ọlu nchu-àjà n'iru Chineke dika ha si-eme kwa ubochi, dika omume ọlu nchu-àjà nādi, ọlu ibà n'ulo nsọ nke Onye-nwe-ayi na isure ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ ruru ya site n'ife nzà. Ọra ndi-Ju nile nēkpe kwa ekpere n'èzí n'oge hour isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. Ewe me ka ọ hu mọ-ozi Onye-nwe-ayi ka o guzoro n'aka-nri ebe-ichu-àjà ebe a na-eme ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. Mb͕e Zakaraias huru ya obi we lọ ya miri, ọ tu-kwa-ra egwu. Ma mọ-ozi ahu siri ya, Atula egwu, Zakaraias: n'ihi na a nuwo aririọ-gi, nwunye-gi Elizabet gāmu-kwa-ra gi nwa-nwoke, i gākpọ kwa aha-ya Jọn. I gēnwe kwa ọṅù na obi-utọ; ọtutu madu gāṅuri kwa ọṅu n'ọmumu-ya. N'ihi na ọ gābu onye uku n'anya Onye-nwe-ayi, ọ gaghi-aṅu kwa manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ma-ọli; agēme kwa ka o juputa na Mọ Nsọ, ọbuná site n'afọ nne-ya. Ọtutu madu nime umu Israel ka ọ gēme kwa ka ha chigharikwute Onye-nwe-ayi Chineke-ha. Ya onwe-ya gāga kwa n'iru Ya nime mọ na ike Elaija, ime ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ime kwa ka ndi nānughi ihe chigharia iga n'uche ndi ezi omume; idozi nye Onye-nwe-ya otù ndi nke akwadebeworo Ya. Zakaraias we si mọ-ozi ahu, Òle ihe m'gēji mara nka? n'ihi na mu onwem bu agadi, nwunyem aghọwo kwa agadi. Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mu onwem bu Gebriel, onye nēguzo n'iru Chineke; ezite-kwa-ram igwa gi okwu, na izì gi ozi ọma ndia. Le kwa, i gēkpuchi ọnu, i gaghi-apu kwa ikwu okwu, rue ubọchi ahu mb͕e ihe ndia gēme, n'ihi na i kweghi okwum ndia, nke gēmezu n'oge-ha. Ndi-Ju we nēle anya Zakaraias, o ju-kwa-ra ha anya n'ebe ọ nānọ ọdù n'ulo nsọ. Ma mb͕e ọ putara, ọ pughi igwa ha okwu: ha we mara na ọ hururi ọhù n'ulo nsọ: ya onwe-ya we nēfere ha aka, nānọgide kwa n'ob͕i. O we rue, mb͕e ubọchi ifè-òfùfè-ya zuru, na ọ lara n'ulo-ya. Ma mb͕e ubọchi ndia gasiri Elizabet nwunye-ya turu ime; o we zobe onwe-ya ọnwa ise, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi meworo nyem n'ubochi O ji lem anya, iwepu ita-utam n'etiti madu. Ma n'ọnwa nke isi ezigara mọ-ozi ahu, bú Gebriel, site n'ebe Chineke nọ je obodo nke Galili, anākpọ aha-ya Nazaret, jekuru nwa-ab͕ọghọ nā-maghi nwoke, onye ekwere na otù nwoke si n'ulo Devid puta, onye aha-ya bu Josef, gālu ya; aha nwa-ab͕ọghọ ahu bu Meri. O we bata n'ebe ọ nọ, si, Ekele, gi onye Chineke meworo ka i nara amara, Onye-nwe-ayi nọyere gi. Ma obi lọrọ ya miri nke-uku n'okwu-ya, o we nātule n'uche-ya aha ekele okwu a gābu. Mọ-ozi ahu we si ya, Atula egwu, Meri: n'ihi na Chineke mere gi amara. Le kwa, i gāturu ime, muta Nwa-nwoke, kpọ aha-Ya Jisus. Nwa-nwoke ahu gābu onye uku, agākpọ kwa Ya Ọkpara nke Onye kachasi ihe nile elu: Onye-nwe-ayi Chineke gēnye kwa Ya oche-eze nna-Ya Devid: Ọ gābu kwa eze ulo Jekob rue mb͕e ebighi-ebi; ala-eze-Ya agaghi-agwu kwa agwu. Meri we si mọ-ozi ahu, Ìhe a gēsi aṅa me, ebe ọ dighi nwoke m'mara? Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke. Le kwa, Elizabet onye-ikwu-gi, ya onwe-ya aturuwo kwa ime nwa-nwoke n'agadi-ya: nke a bu kwa ọnwa nke-isi ya, bú onye anākpọ nwanyi-àgà. N'ihi na ọ dighi okwu ọ bula si Chineke n'ọnu puta nke nāgaghi-adi irè. Meri we si, Le, abum orù-nwanyi nke Onye-nwe-ayi; ya dirim ka okwu-gi si di. Mọ-ozi ahu we pua n'ebe ọ nọ. Ma Meri biliri na mb͕e ahu, ga elu-ala ọsọsọ, bà n'otù obodo nke Juda; we ba n'ulo Zakaraias, kele kwa Elizabet. O we rue, mb͕e Elizabet nuru ekele Meri, nwa-ya wuliri n'afọ-ya; Elizabet we juputa na Mọ Nsọ; o we welie olu-ya tisie nkpu ike, si, Gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi n'etiti ndinyom, ọ bu kwa onye agọziri agọzi ka nkpuru nke afọ-gi di. Òle ebe ka nka si kwa rum, na nne Onye-nwem gābiakutem? N'ihi na lee, mb͕e olu ekele-gi ruru na ntim, nwam wuliri n'afọm n'obi-utọ. Ngọzi nādi-kwa-ra nwanyi ahu nke kwere na ihe ndia gēmezu, bú nke agwaworo ya site n'ọnu Onye-nwe-ayi. Meri we si, Nkpuru-obim nēme ka Onye-nwe-ayi di uku, Ọ nātọ kwa mọm utò nke-uku na Chineke, bú Onye-nzọputam. N'ihi na O lere ọnọdu di ala nke orù-Ya nwanyi anya: N'ihi na le, site n'ub͕u a ọb͕ọ nile gākpọm onye ngọzi diri. N'ihi na Onye di ike emewom ihe uku di iche iche; Aha-Ya di kwa nsọ. Ebere-Ya di-kwa-ra ndi nātu egwu Ya Rue ọb͕ọ na ọb͕ọ. O werewo ogwe-aka-Ya gosi ike; Ọ chusawo ndi-npako n'èchìchè nke obi-ha. O wedawo ndi di ike pua n'oche-eze-ha, Weli kwa elu ndi ọnọdu-ha di ala. O werewo ezi ihe nile nyeju ndi agu nāgu afọ; Zipu kwa ndi-ọgaranya n'aka efu. O nyeworo Israel nwa-Ya aka, Ka O we cheta ebere (Dika Ọ gwara nna-ayi-hà) N'ebe Abraham na nkpuru-ya nọ rue mb͕e ebighi-ebi.