LEVITIKỌS 8:1-13
LEVITIKỌS 8:1-13 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we gwa Moses okwu, si, Chiri Eron na umu-ya ndikom tiyere ya, na uwe-ha, na manu otite-manu ahu, na oke-ehi nke àjà-nmehie, na ebulu abua ahu, na nkata achicha ekoghi-eko; kpọkọta kwa nzukọ Israel nile n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute. Moses we me dika Jehova nyere ya iwu; ewe kpọkọta nzukọ ahu n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute. Moses we si nzukọ ahu, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu ka eme ya. Moses we me ka Eron na umu-ya ndikom biaru nso, o were kwa miri sa ha aru. O tiye n'aru ya uwe-ime ahu, were ihe ike n'úkwù ke ya, yikwasi ya uwe-nwuda, tiye ephod n'aru ya, ke ya n'ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara, were ya kegide ephod ahu n'aru ya. Ọ tukwasi n'aru ya ihe-ib͕ochi-obi; tiye kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi Ìhè ahu na Izu-okè ahu. Ọ tukwasi ákwà-nkukù-isi n'isi-ya; tukwasi kwa n'ákwà-nkukù-isi ahu, n'iru ya, ihe ahu di mbara nke ọla-edo, bú okpu nsọ nke onye-nchu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu. Moses we were manu otite-manu ahu, te ebe-obibi ahu na ihe nile nke di nime ya, do ha nsọ. Ọ we fesa ufọdu nime ya n'ebe-ichu-àjà ub͕ò asa, te kwa ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri na ukwu-ala-ya, manu, ido ya nsọ. Ọ wukwasi kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu n'isi Eron, te kwa ya manu, ido ya nsọ. Moses we me ka umu-ndikom Eron biaru nso, o yikwasi ha uwe-ime, were ihe ike n'úkwù ke ha, ke kwa ha ihe ike n'isi; dika Jehova nyere Moses iwu.
LEVITIKỌS 8:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị gwara Mosis sị, “Kpọta Erọn na ụmụ ya ndị ikom, chịtakwa uwe ha, weta mmanụ nsọ, oke ehi nke aja mmehie na ebule abụọ ahụ, na nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. Kpọkọtaa ọgbakọ ụmụ Izrel niile ka ha bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.” Mosis mere ihe ONYENWE ANYị gwara ya ka o mee. Ọgbakọ ụmụ Izrel zukọtara nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Mosis gwara ọgbakọ ahụ sị, “Nke a bụ ihe ONYENWE ANYị nyere nʼiwu ka e mee.” Mgbe ahụ, Mosis kpọpụtara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼihu, jiri mmiri saa ha ahụ. O yikwasịrị Erọn uwe ime ahụ, kee ya ihe okike a na-eke nʼukwu, yikwasịkwa ya uwe mwụda na efọọd ahụ, jiri ihe okike ahụ a chọrọ mma kegidesie efọọd ahụ ike nʼahụ ya. O tụkwasịrị ya ihe igbochi obi ahụ nʼahụ, tinye Urim na Tumim nʼime ihe igbochi obi ahụ. Ọ tụhịkwara akwa ike nʼisi ahụ nʼisi Erọn, tinye nʼihu akwa ike nʼisi ahụ, okpu nsọ e ji ọlaedo kpụọ, nke bụ akara ido nsọ, dịka ONYENWE ANYị si nye Mosis nʼiwu. Mgbe ahụ, Mosis weere mmanụ nsọ ahụ tee nʼụlọ nzute ahụ, na nʼihe niile dị nʼime ya, ido ha nsọ. Ọ fesakwara ụfọdụ nʼime mmanụ ahụ ugboro asaa nʼebe ịchụ aja, fesakwa ya ugboro asaa nʼelu ngwongwo niile dị nʼebe ịchụ aja, na nʼefere e ji asa ihe, na ụkwụ ya, ido ha nsọ. Ọ wụsara Erọn ụfọdụ mmanụ nsọ ahụ nʼisi, tee ya mmanụ, nʼihi ido ya nsọ. Ọ kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, o yikwasịrị ha uwe ime ahụ, kee ha ihe okike nke ukwu, kekwasị ha ihe okike nʼisi, dịka iwu ONYENWE ANYị nyere Mosis si dị.