LEVITIKỌS 7:11-38
LEVITIKỌS 7:11-38 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara aja udo nke mmadụ ọbụla nwere ike chụọrọ ONYENWE ANYị nʼaja: “ ‘Ọ bụrụ na ha enye ya dịka aja ekele, tinyere aja ekele a ha ga-eweta ogbe achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke a gwakọtara ya na mmanụ oliv, na mbadamba achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke e tere mmanụ nʼelu ya, nakwa achịcha e ji ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara ya na mmanụ nʼime ya. Ọ ga-ewetakwa onyinye achịcha ọzọ nke e ji ihe na-eko achịcha, ya bụ, yiist mee, tinyere aja udo nke ekele ha. Ha ga-esikwa na ya weta otu nʼime onyinye ọbụla, chee nʼihu ONYENWE ANYị, dịka onyinye. Ọ bụ nke ndị nchụaja ahụ na-efesa ọbara anụ e ji chụọ aja udo nʼelu ebe ịchụ aja. Ma anụ ahụ eji chụọ aja onyinye udo nke ekele, ka a ga-eri nʼotu ụbọchị ahụ e ji ha chụọ aja. O nweghị nke a ga-ahapụ ka ọ bọọ chi. “ ‘Ma ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ onyinye afọ ofufu, maọbụ onyinye o wetara nʼihi nkwa o kwere, a ga-eri anụ aja ahụ nʼụbọchị ahụ a chụrụ ya, nweekwa ike rie nke fọdụrụ ma chi bọọ. Ma anụ ọbụla fọdụrụ nʼime anụ aja ahụ, nke a na-erichapụghị nʼụbọchị nke abụọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ. Ọ bụrụ na e rie anụ aja udo ahụ nʼụbọchị nke atọ, a gaghị anabata ya. A gaghị agụnyere ya onye ahụ wetara ya nʼihi na ihe rụrụ arụ ka ọ bụ. Onye ọbụla riri ya ga-abụ onye ikpe mara. “ ‘Anụ ọbụla nke metụrụ ihe rụrụ arụ aghọọla ihe na-adịghị ọcha. A gaghị eri ya. A ga-akpọ ya ọkụ. Ma nʼebe anụ ndị ọzọ dị, onye ọbụla e mere ka ọ dị ọcha nwere ike iri ya. A ga-esite nʼetiti ndị m kewapụ onye ọbụla riri anụ e ji chụọ aja udo nye ONYENWE ANYị mgbe onye ahụ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha. Onye ọbụla metụrụ ihe ọbụla rụrụ arụ aka, ma ịrụ arụ ahụ o si na mmadụ, ma o si nʼanụ ọhịa, ma o si nʼihe ọbụla ọzọ, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya ma ọ bụrụ na onye ahụ anọrọ nʼọnọdụ ahụ rie anụ e ji chụọ aja udo nye ONYENWE ANYị.’ ” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis sị, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Unu erila abụba ehi, maọbụ nke ewu, maọbụ nke atụrụ. Abụba anụ ọbụla nwụrụ anwụ maọbụ nke anụ ọhịa gburu adịghị mma oriri. E nwere ike jiri ha mee ihe ọzọ. A ga-ekewapụ mmadụ ọbụla site nʼetiti ndị ya, bụ onye na-eri abụba anụmanụ nke a ga-esite na ya chee onyinye nsure ọkụ nye ONYENWE ANYị. Ọzọkwa, unu erila ọbara nnụnụ maọbụ nke anụmanụ nʼebe ọbụla unu bi. Onye ọbụla riri ọbara ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.’ ” ONYENWE ANYị gwakwara Mosis sị, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla wetaara ONYENWE ANYị onyinye aja udo aghaghị iweta ụfọdụ nʼime onyinye ahụ dịka onyinye pụrụ iche nye Onyenwe anyị. Ha ga-eji aka ha chee onyinye nsure ọkụ ahụ nʼihu ONYENWE ANYị. Ha ga-eweta abụba ahụ, ya na obi anụ, fufee obi anụ ahụ nʼihu ONYENWE ANYị dịka aja mfufe. Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja, ma obi anụ ahụ ga-abụ nke Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Unu ga-enye onye nchụaja apata aka nri nke anụ aja udo ahụ, dịka onyinye. Nwa Erọn, onye ji ọbara na abụba chụọ aja udo ahụ ga-ewere apata aka nri ya dịka oke ruuru ya. Site nʼonyinye ụmụ Izrel na-enye nʼoge aja udo, ewerela m obi anụ ahụ a na-efufe efufe, na apata anụ a na-eche nʼihu m nye Erọn, onye nchụaja na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ oke ruuru ha mgbe ọbụla ụmụ Izrel na-achụ aja udo.’ ” Nke a bụ akụkụ anụ ahụ e ji chụọ aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYị, nke e nyekwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼụbọchị ahụ e chere ha nʼihu ONYENWE ANYị ijere ya ozi dịka ndị nchụaja. Nʼihi na nʼụbọchị ahụ e tere ha mmanụ ka ONYENWE ANYị nyere ụmụ Izrel iwu sị ha nye Erọn na ụmụ ya ndị ikom oke ndị a oge niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Ndị a bụ usoro iwu metụtara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na aja mmehie, na aja ikpe ọmụma, na onyinye ido nsọ, na aja udo. ONYENWE ANYị nyere Mosis iwu ndị a nʼugwu Saịnaị nʼụbọchị ahụ o nyere ụmụ Izrel iwu sị ha, wetara ONYENWE ANYị onyinye nʼọzara Saịnaị.
LEVITIKỌS 7:11-38 Bible Nso (IGBOB)
Nka bu kwa iwu nke ihe àjà nke àjà-udo nke madu gēweta nso Jehova. Ọ buru na ọ weta ya nso ka ọ buru àjà-ekele, ọ gēweta kwa nso ob͕e achicha ekoghi-eko ufọdu nke agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na ob͕e achicha ufọdu agwara manu, nke utu ọka flour dere edè, tiyere àjà-ekele ahu. N'elu ob͕e achicha koro eko ufọdu ka ọ gēweta nso onyinye-ya iji biaru nso tiyere àjà-ekele nke àjà-udo-ya. O gēsi kwa na ya weta nso otù nime onyinye ọ bula iji biaru nso ka ọ buru àjà-nbuli ibuliri Jehova; onye-nchu-aja nke nāwusa ọbara àjà-udo, ya onwe-ya gēnwe ya. Agēri kwa anu nke àjà-ekele nke àjà-udo-ya n'ubọchi nke onyinye-ya iji biaru nso; ọ gaghi-adọba ufọdu nime ya rue ututu. Ma ọ buru na àjà nke onyinye-ya iji biaru nso bu nkwa ma-ọbu àjà-afọ-ofufo, n'ubọchi ọ nēweta nso àjà-ya-ka agēri ya: n'echi-ya ka agēri kwa nke fọduru nime ya: ma nke fọduru nime anu nke àjà ahu, agēji ọku sure ya n'ubọchi nke-atọ. Ma ọ buru na erie ufọdu nime anu nke ihe àjà nke àjà-udo-ya n'ubọchi nke-atọ n'uzọ ọ bula, ọ gaghi-atọ utọ: onye nēweta ya nso, agaghi-agu ya nye ya: ihe-árú ka ọ gābu, madu nke nēri ufọdu nime ya gēbu kwa ajọ omume-ya. Anu nke meturu ihe ọ bula ruru árú, agaghi-eri ya: agēji ọku sure ya. Ma anu àjà ahu, onye ọ bula nke di ọcha gēri anu-ya: ma madu nke nēri anu sitere n'ihe àjà nke-udo, nke Jehova nwere, ma ọrurú-ya di n'aru ya, agēbipu madu ahu n'etiti umu-nna-ya. Ma mb͕e madu gēmetu ihe ọ bula ruru árú aru, bú ọrurú madu, ma-ọbu anumanu ruru árú, maọbu ihe-árú ọ bula ruru árú, we rie ufọdu nime anu ihe àjà-udo, nke Jehova nwere, agēbipu madu ahu n'etiti umu-nna-ya. Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si, Unu erila abuba ọ bula, nke ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu ewu. Abuba nke anumanu nwuru onwe-ya, na abuba nke anumanu anu-ọhia dọb͕uru, agēdozi ya iji je ozi ọ bula: ma unu erila ya ma-ọli. N'ihi na onye ọ bula nke nēri abuba sitere n'anumanu nke madu si nime ya eweta nso àjà-ọku ichuru Jehova, agēbipu kwa madu nke nēri ya n'etiti umu-nna-ya. Ọ dighi kwa ọbara ọ bula unu gēri n'ebe-ọbibi-unu nile, nke anu-ufe, ma ọbu nke anumanu. Madu ọ bula nke gēri ọbara ọ bula, agēbipu kwa madu ahu n'etiti umu-nna-ya. Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si, Onye nēwetara Jehova nso ihe àjà nke àjà-udo-ya gēsi n'ihe àjà nke àjà-udo-ya wetara Jehova onyinye-ya iji biaru nso: aka ya gēweta àjà-ọku nke Jehova; abuba di n'akuku okpukpu-obi ka ọ gēweta, ya na okpukpu-obi, ifé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova. Onye-nchu-àjà gēsure kwa abuba ahu ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísi utọ n'ebe-ichu-àjà: ma okpukpu-obi ahu ka Eron na umu-ya ndikom gēnwe. Utaku-ukwu aka-nri ka unu gēnye kwa onye-nchu-àjà ibu àjà-nbuli sitere n'ihe àjà nile nke àjà-udo-unu. Onye ahu n'etiti umu-ndikom Eron nke nēweta nso ọbara nke àjà-udo nile, na abuba-ha, ya gēnwe utaku-ukwu aka-nri ahu ka ọ buru òkè-ya. N'ihi na okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka M'naraworo n'aka umu Israel site n'ihe àjà nile nke àjà-udo-ha nile, nye Eron, bú onye-nchu-àjà, nye kwa umu-ya ndikom, n'ukpuru ebighi-ebi, sitere n'aka umu Israel. Nka bu òkè otite-manu Eron, na òkè otite-manu umu-ya ndikom, sitere n'àjà-ọku nke Jehova, n'ubọchi O mere ka ha biarue nso iburu Jehova ndi-nchu-àjà; bú nke Jehova nyere iwu ka enye ha site n'aka umu Israel, n'ubọchi O tere ha manu. Ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile. Nka bu iwu diri àjà-nsure-ọku, di-kwa-ra onyinye-inata-iru-ọma, di-kwa-ra àjà-nmehie, di-kwa-ra àjà-ikpe-ọmuma, di-kwa-ra nmeju-aka, di-kwa-ra ihe àjà nke àjà-udo; nke Jehova nyere Moses n'iwu n'ugwu Sainai, n'ubọchi O nyere umu Israel iwu iwetara Jehova nso onyinye-ha iji biaru nso, n'ọzara Sainai.