Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 4:27-35

LEVITIKỌS 4:27-35 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼetiti ndị obodo ahụ emehie na-amaghị ama, mee ihe megidere ihe ọbụla ONYENWE ANYị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha, ọ bụrụkwa na-amata mmehie ha mere, ha ga-eweta nne ewu na-enweghị ntụpọ dịka onyinye nʼihi mmehie ya. Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼelu isi aja mmehie ahụ, e gbuo ya nʼebe a na-achụ aja nsure ọkụ. Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara ahụ na mkpịsịaka ya tee ya na mpi nke ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. Ọ ga-ewepụ abụba ya niile dịka a na-eme nʼaja udo. Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja, dịka ihe na-esi isi ụtọ nye ONYENWE ANYị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja a ga-ekpuchikwara ha mmehie. A ga-agbagharakwa ha. “ ‘Ma ọ bụrụ na mmadụ eweta otu atụrụ dịka onyinye nʼihi aja mmehie ya, ọ ghaghị ịbụ nne atụrụ na-enweghị ntụpọ. Ọ ga-eweta ya nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ebikwasị ya aka nʼisi, gbuo ya nʼebe ahụ, ka ọ bụrụ aja mmehie ya. Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara anụ aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya, tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Ọ ga-awụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja. Ha ga-ewepụ abụba ya niile, dịka a na-eme nʼatụrụ aja udo. Onye nchụaja ga-akpọ abụba ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka onyinye nsure ọkụ a chụrụ nye ONYENWE ANYị. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie nʼihi iwu ha dara. A ga-agbaghara ha mmehie ha.

LEVITIKỌS 4:27-35 Bible Nso (IGBOB)

Ma ọ buru na otù madu n'etiti ndi ala emehie n'amaghi-ama, n'ime ihe megide otù nime ihe Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya; ọ buru kwa na eme ka ọ mara nmehie-ya nke ọ mehieworo, ọ gēweta kwa ewu, bú nne zuru okè, bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, ka ọ buru onyinye-ya iji biaru nso. Ọ gēbi-kwasi aka-ya n'isi ihe àjà-nmehie ahu, b͕u kwa ihe àjà-nmehie ahu n'ebe àjà-nsure-ọku. Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà. Abuba-ya nile ka ọ gēwezuga, dika ewezugara abuba n'elu ihe àjà nke àjà-udo; onye-nchu-àjà gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ka ọ buru ihe ísì utọ anēsurere Jehova; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya. Ma ọ buru na ọ weta nwa-aturu dika onyinye-ya iji biaru nso ka ọ buru àjà-nmchie, nne zuru okè ka ọ gēweta ya. O gēbikwasi aka-ya n'isi ihe àjà-nmehie ahu, b͕u kwa ya ibu àjà-nmehie n'ebe ha nēb͕u ihe àjà-nsure-ọku. Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara àjà-nmehie ahu na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà: abuba-ya nile ka ọ gēwezuga, dika anēwezuga abuba nwa-aturu n'ihe àjà nke àjà-udo: onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, n'elu àjà-ọku nke Jehova: onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya nke ọ mehieworo, agāb͕aghara kwa ya ya.