Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 4:1-26

LEVITIKỌS 4:1-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

ONYENWE ANYị gwara Mosis sị, “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, megide ihe ọbụla ONYENWE ANYị nyere nʼiwu: “ ‘Ọ bụrụ na onye nchụaja e tere mmanụ emehie na-amaghị ama, si otu a weta ikpe ọmụma nʼisi ọha mmadụ. Ọ ga-ewetara ONYENWE ANYị otu oke ehi na-enweghị ntụpọ dịka aja mmehie, nʼihi mmehie ahụ o mere. Ọ ga-ewere oke ehi ahụ bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, nʼihu ONYENWE ANYị. Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi ya, gbuo ya nʼebe ahụ nʼihu ONYENWE ANYị. Mgbe ahụ, onye nchụaja e tere mmanụ ga-eburu ụfọdụ ọbara oke ehi ahụ baa nʼime ụlọ nzute. Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ, fesa ya ugboro asaa nʼihu ONYENWE ANYị, nʼihu akwa mgbochi nke ebe nsọ ahụ. Onye nchụaja ga-etekwasị ụfọdụ ọbara ahụ na mpi dị nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, nʼihu ONYENWE ANYị nʼime ụlọ nzute. Ọbara fọdụrụ nʼoke ehi ahụ ka ọ ga-awụsa nʼụkwụ ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ, nʼọnụ ụzọ ịba ụlọ nzute. Ọ ga-ewepụ abụba niile site nʼoke ehi aja mmehie, abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na nke jikọtara ha, na akụrụ ya abụọ na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na ihe kpuchiri umeju ya, nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya, dịka e si ewepụ abụba oke ehi e ji chụọ aja udo. Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Ma akpụkpọ anụ oke ehi ahụ na ahụ ya niile, ma isi ya, na ụkwụ ya, na ihe dị nʼime afọ ya, na mgbịrị afọ ya, ihe niile fọdụrụ nʼoke ehi ahụ, ka a ga-ebupu nʼazụ ebe obibi ụmụ Izrel, ebe dị ọcha, ebe a na-ekpofu ntụ. Ebe ahụ ka a ga-anọ kpọọ ya ọkụ, nʼọkụ a kwanyere nʼebe a na-ekpofu ntụ. “ ‘Ọ bụrụ na nzukọ Izrel niile emehie na-amaghị ama, mee ihe ọbụla megidere ihe ONYENWE ANYị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, ọ bụ ezie na ndị obodo amaghị okwu a, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha matakwa mmehie ha mehiere, nzukọ ahụ aghaghị iweta nwa oke ehi dịka aja mmehie, duru ya chee ya nʼihu ụlọ nzute. Ndị okenye nzukọ Izrel ga-ebikwasị aka ha nʼisi oke ehi ahụ nʼihu ONYENWE ANYị. A ga-egbu ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, onye nchụaja e tere mmanụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara ya baa nʼụlọ nzute. Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ fesa ya ugboro asaa nʼihu ONYENWE ANYị, nʼihu akwa mgbochi ahụ. Ọ ga-ete ọbara ụfọdụ nʼelu mpi nke dị nʼebe ịchụ aja nke dị nʼihu ONYENWE ANYị, nʼụlọ nzute. Ọ ga-awụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala, nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ọ ga-ewepụta abụba niile dị ya nʼahụ kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ ga-eme oke ehi ahụ ihe o mere oke ehi aja mmehie. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchi mmehie ndị Izrel. A ga-agbagharakwa ha. Emesịa, onye nchụaja ga-eburu ozu oke ehi ahụ gaa nʼazụ obodo kpọọ ya ọkụ nʼebe ahụ, dịka o mere oke ehi nke mbụ. Nke a bụ aja mmehie nʼihi nzukọ Izrel. “ ‘Mgbe otu nʼime ndịisi obodo mehiere na-amaghị ama, si otu a megide ihe ONYENWE ANYị Chineke nyere nʼiwu banyere ihe a na-agaghị eme, mgbe ọ ghọtara ikpe ọmụma ya. Ọ bụrụkwa na-eme ka ọ mata mmehie ya, ọ ghaghị iweta mkpi na-enweghị nkwarụ dịka onyinye nʼihi mmehie ya. Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi mkpi ahụ. Gbuo ya nʼebe a na-egbu anụ aja nsure ọkụ, nʼihu ONYENWE ANYị. Ọ bụ aja mmehie. Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara aja mmehie ahụ na mkpịsịaka ya tee ya nʼelu mpi ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ. Nke fọdụrụ ka ọ ga-awụpụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. Ọ ga-akpọ abụba ya niile ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka o si kpọọ abụba anụ e ji chụọ aja udo ọkụ. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri onyeisi ahụ mmehie ya. A ga-agbaghara ya.

LEVITIKỌS 4:1-26 Bible Nso (IGBOB)

Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si, Mb͕e madu gēmehie n'amaghi-ama megide ihe ọ bula nime ihe Jehova nyere n'iwu, si, Emela ha; ọ we me otù nime ha: ọ buru na onye-nchu-àjà etere manu emehie dika ikpe-ọmuma ndim si di; ọ gēweta kwa nso nwa-oke-ehi zuru okè bayere nmehie-ya, nke o mehieworo, ichuru Jehova, ka ọ buru àjà-nmehie. Ọ gēme ka oke-ehi ahu biarute ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute n'iru Jehova; ọ gēbikwasi aka-ya n'isi oke-ehi ahu, b͕u kwa oké-ehi ahu n'iru Jehova. Onye-nchu-àjà etere manu gēwere ufọdu nime ọbara oké-ehi, webata ya n'ulo-ikwū nzute: onye-nchu-àjà ahu gēdeye nkpisi-aka-ya n'ọbara ahu, fesa ufọdu nime ọbara ahu ub͕ò asa n'iru Jehova, n'iru ákwà-nb͕ochi nke ebe nsọ ahu. Onye-nchu-àjà gēwere kwa ufọdu nime ọbara ahu tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me n'iru Jehova, nke di nime ulo-ikwū nzute; ọ bu kwa ọbara nile nke oke-ehi ahu ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute. Ọ gēsi kwa nime ya welie abuba nile nke oke-ehi nke àjà-nmehie; bú abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime, na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, nke di n'akuku úkwù, na mba-imeju nke di n'imeju, (n'akuku akọrọ ka ọ gēwezuga ya), dika esi n'oké-ehi nke ihe àjà nke àjà-udo eweli ya: onye-nchu-àjà gēsure kwa ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku. Ma akpukpọ oke-ehi ahu, na anu-ya nile, tiyere isi-ya, tiye kwa ọlu-ukwu-ya na ọlu-aka-ya, na ihe-ime-ya, na nsi-ya, ọbuná oke-ehi ahu nile ka o gēbupu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū rue ebe di ọcha, rue ikpo-ntu, sure ya n'elu nkú n'ọku: n'elu ikpo-ntu ka agēsure ya ọku. Ma ọ buru na nzukọ nile nke Israel eme ihe n'amaghi-ama, ewe zopu ihe ahu n'anya nkpọkọta Israel, ọ buru kwa na ha emewo ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ha; mb͕e amara nmehie nke ha mehieworo nime ya, nkpọkọta Israel ahu gēweta kwa nso nwa-oke-ehi ibu àjà-nmehie, ha gēme kwa ka ọ bia n'iru ulo-ikwū nzute. Ndi-okenye nzukọ ahu gēbikwasi aka-ha n'isi oke-ehi ahu n'iru Jehova: agēb͕u kwa oke-ehi ahu n'iru Jehova. Onye-nchu-aja etere manu gēwebata ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu n'ulo-ikwū nzute: onye-nchu-aja gēdeye nkpisi-aka-ya nime ọbara ahu, fesa ya ub͕ò asa n'iru Jehova, n'iru akwa-nb͕ochi ahu. Ọ gēwere kwa ufọdu nime ọbara ahu tiye n'elu mpi nile nke ebe-ichu-aja nke di n'iru Jehova, nke di nime-ulo-ikwū nzute, ọ bu kwa ọbara nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute. O gēsi kwa nime ya welie abuba-ya nile, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-aja. Ọ gēme kwa oke-ehi ahu dika ọ mere oke-ehi nke àjà-nmehie, otú a ka ọ gēme ya: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ha nmehie-ha, agāb͕aghara kwa ha ya. O gēbupu kwa oke-ehi ahu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, sure ya ọku dika o surere oke-ehi mbu: àjà-nmehie nke nkpọkọta Israel ka ọ bu. Mb͕e onye-isi nēmehie, me kwa ihe n'amaghi-ama megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya; ọ buru kwa na eme ka ọ mara nmehie-ya nke ọ mehieworo nime ya, ọ gēweta nkpi, bú oké zuru okè, ka ọ buru onyinye-ya iji biaru nso; o gēbikwasi aka-ya n'isi nkpi ahu, b͕u kwa ya n'ebe anēb͕u anu àjà-nsure-ọku n'iru Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu. Onye-nchu-aja gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke àjà-nmehie na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, ọbara-ya ka ọ gāwusi kwa na ntọ-ala ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku. Abuba-ya nile ka o gēsure ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-aja, dika abuba ihe àjà nke àjà-udo: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.