LEVITIKỌS 26:1-13
LEVITIKỌS 26:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“ ‘Unu emerela onwe unu arụsị ọbụla, maọbụ guzobe oyiyi apịrị apị, maọbụ ogidi nkume ọbụla ọtọ, nye onwe unu. Unu edokwala nkume a pịrị apị ọbụla nʼala unu maka ịkpọ isiala nye ya. Abụ m ONYENWE ANYị Chineke unu. “ ‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị Izuike m, sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m ONYENWE ANYị. “ ‘Ọ bụrụ na unu ejegharịa nʼụkpụrụ m, lezie anya debe iwu m niile, aga m enye unu mmiri ozuzo nʼoge ya, nke ga-eme ka ala unu mịa ọtụtụ ihe ubi. Osisi unu niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ mgbe niile. Unu ga-anọgide na-azọcha ọka tutu ruo mgbe unu ga-aghọ mkpụrụ vaịnị unu, owuwe ihe ubi mkpụrụ vaịnị unu ga-adịgidekwa ruo oge ịkụ mkpụrụ nʼubi. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-enwe nri ga-ezuru unu, unu ga-ebikwa nʼudo nʼala unu. “ ‘Aga m eme ka udo dịrị nʼala ahụ, unu ga-edina ala, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka unu tụọ egwu ọbụla. Aga m ewezuga site nʼetiti unu ajọ anụ ọhịa, mma agha agaghị esitekwa nʼala unu bi nʼime ya gafee. Unu ga-achụ ndị iro unu ọsọ. Ha ga-ada nʼihu unu site na mma agha. Mmadụ ise nʼime unu ga-achụ narị mmadụ ọsọ. Narị mmadụ nʼetiti unu ga-achụkwa iri puku mmadụ ọsọ. Ndị iro unu ga-ada nʼihu unu site na mma agha. “ ‘Aga m eji ihuọma leta unu, mee ka unu mụbaa ma jupụta nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m nʼebe unu nọ dịgide. Unu ga-enwebiga mkpụrụ ubi oke ruo na mgbe unu ka nọ na-eri ndị ochie unu ga-ewezuga ha nʼakụkụ maka inye ohere iwebata ihe ubi ọhụrụ. Aga m eme ka ebe obibi m dịrị nʼetiti unu. Agaghị m asọ unu oyi. Aga m ejegharị nʼetiti unu, bụrụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị m. Nʼihi na abụ m ONYENWE ANYị Chineke unu onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, ka unu ghara ịbụ ndị ohu ọzọ. Etijiela m mkpọrọ igwe nke ịbụ ohu unu, mee ka unu bụrụ ndị ji nganga ejegharị.
LEVITIKỌS 26:1-13 Bible Nso (IGBOB)
Unu emerela onwe-unu ihe-efu ọ bula, unu eguzoro-kwa-la onwe-unu arusi apiri api, ma-ọbu ogidi, unu etiye-kwa-la nkume emere ka o yie ihe n'ala-unu, ikpọ isi ala nye ya: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. Unu gēdebe ubọchi-izu-ikem nile, tu kwa egwu ebe nsọm: Mu onwem bu Jehova. Ọ buru na unu ejeghari n'ukpurum nile, ọ buru kwa na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, we me ha: M'gēnye kwa miri-ozuzo-unu na mb͕e-ha, ala gāmi kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ọhia gāmi kwa nkpuru-ha. Nzọcha-ọka-unu gēru ọghughọ-nkpuru-vine, ọghughọ-nkpuru-vine gēru kwa ọghigha-nkpuru: unu gēriju nri-unu afọ, biri kwa n'ala-unu na ntukwasi-obi. M'gēnye udo n'ala, unu gēdina kwa ala, ọ dighi kwa onye ganēme ka unu ma jijiji: M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala, mma-agha agaghi-agabiga kwa n'ala-unu. Unu gāchu ndi-iro-unu, ha gāda kwa n'iru unu site na mma-agha. Madu ise n'etiti unu gāchu ọgu madu ise, ọgu madu ise n'etiti unu gāchu kwa orú nnù madu na nnù madu ise: ndi-iro-unu gāda kwa n'iru unu site na mma-agha. M'gēche unu iru, me kwa ka unu mua ọmùmù, me kwa ka unu ba uba: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe unu nọ. Unu gēri ihe ochie nke anēdebe site na mb͕e ochie, unu gēweputa kwa nke-ochie n'iru nke-ọhu. M'gētiye ebe-obibim n'etiti unu: nkpuru-obim agaghi-asọ kwa unu oyi. M'ganējeghari n'etiti unu, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi. Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt, si kwa n'iburu ha ndi-orù, puta; M'tijiwo kwa nkpọrọ nile nke yoke-unu, me kwa ka unu je ije iguzo-ọtọ.