Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 25:8-17

LEVITIKỌS 25:8-17 Bible Nso (IGBOB)

I gāgu-kwa-ra onwe-gi ubọchi-izu-ike asa, bú arọ, arọ asa ub͕ò asa; ubọchi nke ubọchi-izu-ike asa, bú arọ arọ, gābu-kwa-ra gi ọgu arọ abua na iteghete. I gēme kwa ka opì-ike nke nādasi uda ike gābiga rue ebe nile n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu; n'ubọchi nkpuchi-nmehie ka unu gēme ka opì-ike gabiga n'ala-unu nile. Unu gēdo kwa arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu nsọ, kpọsa kwa n'ala ahu nile si na ndi nile bi nime ya nwere onwe-ha: jubile ka arọ ahu gāburu unu; unu gālaghachi kwa, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, laghachi kwa, onye ọ bula n'ab͕uru-ya. Jubile ka arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu gāburu unu: unu aghala nkpuru, unu ewe-kwa-la ihe-ubi nēpu n'onwe-ya nime ya, unu aghọrọ-kwa-la nkpuru nke osisi vine nile anākwachaghi akwacha. N'ihi na jubile ka ọ bu; nsọ ka ọ gādiri unu: unu gēsite n'ubi rie ihe-ọmume-ya. N'arọ jubile a ka unu gālaghachi, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya. Mb͕e i gērenye madu-ibe-gi ihe-orire, ma-ọbu zuru ihe n'aka madu-ibe-gi, unu emeritala onwe-unu ihe-ike: dika ọnu-ọgugu arọ si di site n'arọ jubile, otú a ka i gāzuru ihe n'aka madu-ibe-gi, dika ọnu-ọgugu arọ ihe-ọmume si di, otú a ka ọ gērenye gi. Dika iba-uba nke arọ si di ka i gēme ka ọnu-ahia-ya ba uba, ọ bu kwa dika nbilata arọ si di ka i gēbilata ọnu-ahia-ya; n'ihi na ọnu-ọgugu ihe-ọmume ka ya onwe-ya nērenye gi. Unu emerita-kwa-la onwe-unu ihe-ike; ma i gātu egwu Chineke-gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi.

LEVITIKỌS 25:8-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“ ‘Gụpụta afọ izuike asaa, afọ asaa, ụzọ asaa. Ngụkọ afọ izuike ndị a niile ga-enye iri afọ anọ na itoolu. Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa, zipụ onye ga-egbu opi ike, ya bụ, nʼụbọchị mkpuchi mmehie, a ga-egbu opi ike nʼala Izrel niile. Doonụ afọ nke iri ise ahụ nsọ, kwusaakwa inwere onwe nye mmadụ niile nʼala ahụ niile. Afọ ahụ ga-abụ afọ inwere onwe nye unu. Onye ọbụla nʼime unu ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ezinaụlọ ya, onye ọbụla kwa ga-alaghachi nʼagbụrụ ya. Afọ nke iri ise bụ afọ inwere onwe nye unu. A gaghị akụ ihe ọbụla nʼubi, a gakwaghị ewe ihe ubi ọbụla puputara nʼonwe ya, maọbụ mkpụrụ osisi vaịnị mịrị nʼonwe ya. Ọ bụ afọ inwere onwe, bụrụkwa afọ dị nsọ nye unu, nke onye ọbụla ga-eri naanị ihe e wetara nʼubi. “ ‘Onye ọbụla ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ya, nʼafọ inwere onwe a. “ ‘Ọ bụrụ na i resiri onye agbataobi gị ala, maọbụ na o nwere nke ọ zụrụ site nʼaka gị, unu aghọgbula ibe unu. Ị ga-azụrụ ala site nʼaka onye agbataobi dịka ọnụọgụgụ afọ si dị site nʼafọ inwere onwe. Ha ga-eresi gị ya dịka ọnụọgụgụ afọ ole fọdụrụ maka ịkọ ihe nʼala ahụ. Ọ bụrụ na a zụrụ ala ahụ nso nso mmemme iri afọ ise a, ọnụahịa ala ahụ ga-adị ala, ọ bụrụkwanụ na ọ dị anya site na mmemme ahụ, ọnụahịa ya ga-adị elu, nʼihi na ụgwọ onye ahụ na-akwụ bụ ụgwọ ugboro ole ọ ga-akụ ihe nʼala ahụ. Unu emegbula ibe unu kama tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m ONYENWE ANYị Chineke unu.