LEVITIKỌS 19:33-34
LEVITIKỌS 19:33-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“ ‘Mgbe onye ọbịa soro unu biri nʼala unu, unu emejọla ya. Mesonụ onye ọbịa bi nʼetiti unu mmeso dịka ọ bụ otu nʼime ndị amụrụ nʼala. Hụnụ ha nʼanya dịka unu si hụ onwe unu, nʼihi na o nwere oge unu bụ ọbịa nʼala Ijipt. Abụ m ONYENWE ANYị Chineke unu.
Kesaa
Gụọ LEVITIKỌS 19LEVITIKỌS 19:33-34 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ọbìa gānoyere gi dika ọbìa n'ala-unu, unu emela ya ihe-ike. Dika onye amuru n'ala site n'aru unu ka ọbìa gādiri unu, bú onye nọ dika ọbìa n'etiti unu, i gāhu kwa ya n'anya dika onwe-gi; n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
Kesaa
Gụọ LEVITIKỌS 19