LEVITIKỌS 16:20-22
LEVITIKỌS 16:20-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Mgbe Erọn chụchara aja mkpuchi mmehie maka Ebe ahụ Kachasị Nsọ, ụlọ nzute, nakwa ebe ịchụ aja, ọ ga-akpụbata mkpi ahụ e debere ndụ. Ọ ga-ebikwasị aka ya abụọ nʼisi ya, kwupụta ajọ omume na nnupu isi ụmụ Izrel niile, mmehie ha niile, bokwasị ha mkpi ahụ nʼisi. Ọ ga-ezipụ mkpi ahụ pụọ nʼime ọzara site nʼaka onye ahụ a họpụtara ime nke a. Nʼụzọ dị otu a, mkpi ahụ ga-eburu mmehie ndị ahụ niile baa nʼebe mmadụ ọbụla na-ebighị. Nwoke ahụ ga-ahapụkwa ya nʼọzara.
LEVITIKỌS 16:20-22 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e o kpuchibiri nmehie ebe nsọ a, na nke ulo-ikwū nzute, na nke ebe-ichu-àjà, ọ gēweta nso nkpi ahu di ndu: Eron gēbikwasi kwa aka-ya abua n'isi nkpi ahu di ndu, kwuputa n'elu ya ajọ omume nile nke umu Israel, na njehie-ha nile, bú nmehie-ha nile; o gētiye kwa ha n'elu isi nkpi ahu, zilaga ya n'ọzara site n'aka nwoke jikere ejikere: nkpi ahu gēbu kwa n'aru ya ajọ omume-ha nile rue ala nkewapu: o gēzilaga kwa nkpi ahu n'ọzara.