Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LEVITIKỌS 14:33-57

LEVITIKỌS 14:33-57 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

ONYENWE ANYị gwara Mosis na Erọn okwu sị, “Mgbe unu banyere ala Kenan, bụ ala ahụ m na-enye unu, ọ bụrụ na o nwee ụlọ ọbụla m webatara ọrịa na-efe efe, onyenwe ụlọ ahụ ga-ejekwuru onye nchụaja sị ya, ‘Ahụla m ihe yiri ọrịa na-efe efe nʼụlọ m.’ Onye nchụaja ahụ ga-enye iwu ka a kwapụsịa ihe niile dị nʼụlọ ahụ tupu ọ gaa lezie ụlọ ahụ anya, ka ihe niile dị nʼụlọ ahụ ghara ịbụ ihe rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na achọpụta ọrịa na-efe efe nʼụlọ ahụ. Mgbe a kwapụtasịrị ihe dị nʼụlọ ahụ, onye nchụaja ga-aga lee ụlọ ahụ. Ọ ga-ele ntụpọ dị nʼahụ ụlọ ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ, maọbụ ọbara ọbara, ọ bụrụkwa na ha miri emi karịa aja ụlọ ahụ nʼile anya, onye nchụaja ga-esi nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ pụọ, kpọchie ụlọ ahụ ụbọchị asaa. Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-alọghachi bịa lee ụlọ ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaala nʼaja ụlọ ahụ, onye nchụaja ga-enye iwu ka e tida akụkụ aja ụlọ ahụ bufuo ya nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo. Ọ ga-enyekwa iwu ka a kpụchaa aja ụlọ niile dị nʼime ụlọ ahụ, bufukwaa aja niile a kpụchapụtara nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo. A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ. “Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ apụta ọzọ, mgbe e bupụsịrị nkume ndị ahụ, ma mgbe a kpuchasịrị aja ụlọ ma techikwaa ya, onye nchụaja ga-abịa lee ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na ntụpọ ahụ agbasaala ọzọ, ọ ga-agụ ụlọ ahụ dịka ihe rụrụ arụ, nʼihi na ntụpọ ahụ bụ ọrịa na-efe efe. Ọ ga-enye iwu ka a kwatuo ụlọ ahụ bufukwaa ihe niile e jiri rụọ ya, nkume niile, osisi niile na ụrọ niile, nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo. “Onye ọbụla banyere nʼụlọ ahụ nʼoge e mechiri ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo nʼoge uhuruchi. Onye ọbụla dinara ala maọbụ rie nri nʼime ya, ga-asacha uwe ya. “Ma ọ bụrụ na onye nchụaja abịa hụ na ntụpọ ahụ apụtaghị ọzọ, mgbe e techara ụlọ ahụ ụrọ nke ugboro abụọ, ọ ga-agụ ya nʼụlọ dị ọcha, nʼihi na ọrịa ahụ na-efe efe alaala. Ọ ga-ejikwa nnụnụ abụọ, na osisi sida, na ogho uhie, na osisi hisọp mee mmemme ido ihe ọcha. Ọ ga-egbu otu nʼime nnụnụ ndị ahụ nʼelu mmiri e si nʼiyi na-asọ asọ kute, nke dị nʼime ite aja. Ọ ga-edenye osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na osisi hisọp ahụ, nʼime ọbara nnụnụ ahụ na mmiri ahụ. Ọ ga-efesa ọbara ahụ nʼụlọ ahụ ugboro asaa. Ọ bụ ọbara nnụnụ ahụ, na mmiri ahụ, na nnụnụ nke ọzọ ahụ dị ndụ, na osisi sida ahụ na hisọp ahụ, na ogho uhie ahụ ka ọ ga-eji mee ka ụlọ ahụ dị ọcha. Ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ dị ndụ ka o fepụ felaa nʼọhịa dị nʼazụ obodo. Nke a ga-abụ otu e si kpuchiere ụlọ ahụ mmehie ya. Ọ ga-adịkwa ọcha.” Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta, na ọkọ, na ọrịa na-efe efe dị nʼuwe maọbụ nʼụlọ, maọbụ etuto, maọbụ ntụpọ, maọbụ ọnya. Iwu ndị a ga-enye aka ịmata ihe rụrụ arụ maọbụ ihe na-adịghị ọcha. Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta na ọrịa na-efe efe.

LEVITIKỌS 14:33-57 Bible Nso (IGBOB)

Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, Mb͕e unu gābata n'ala Kenean, nke Mu onwem nēnye unu ka ọ buru ihe-onwunwe, M'we tiye ihe-otiti ekpenta n'ulo ọ bula nke ala ahu, bú ihe-onwunwe-unu; onye nwe ulo ahu gābia kwa, gosi onye-nchu-àjà, si, Emewom ka m'hu ihe dika ihe-otiti n'ulo: onye-nchu-aja gēnye kwa iwu ka akwapu ihe di n'ulo ahu, tutu onye-nchu-àjà abà nime ihu ihe-otiti ahu, ka aghara ime ka ihe nile nke di n'ulo ru árú: emesia onye-nchu-àjà gābà kwa ihu ulo ahu: ọ gāhu kwa ihe-otiti ahu anya, ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu di na mb͕idi ulo, nēnwe okokoro nke nācha akwukwọ ndu akwukwọ ndu ma-ọbu ọbara-ọbara, ọ buru kwa na ha di ala kari mb͕idi ahu, n'ile anya; onye-nchu-àjà gēsi kwa n'ulo ahu pua rue ọnu-uzọ ulo ahu, mechi kwa ulo ahu ubọchi asa: onye-nchu-àjà gābiaghachi n'ubọchi nke-asa, le kwa anya: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu aba aba na mb͕idi ulo; onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha dọpu nkume nile nke ihe-otiti ahu di nime ha, tubà ha n'azu obodo, n'ebe ruru árú: ọ gēme kwa ka akpucha ulo ahu nime buruburu, ha gāwusi kwa ájá nke ha kpuchapuru n'azu obodo, n'ebe ruru árú: ha gēweta kwa nkume ọzọ, me ka ha ba n'ọnọdu nkume ahu: ájá ọzọ ka ọ gēwere kwa, te ulo ahu. Ma ọ buru na ihe-otiti ahu alaghachi, b͕awaputa n'ulo ahu, mb͕e ọ dọpusiri nkume ahu, mb͕e ọ kpuchasi-kwa-ra ulo ahu, mb͕e etesi-kwa-ra ya; onye-nchu-àjà gābata kwa, le anya, ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu abawo aba n'ulo, ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu nke di n'ulo: ihe ruru árú ka ọ bu Ọ gākwatu kwa ulo ahu, bú nkume-ya nile, na osisi-ya nile, na ájá nile nke ulo ahu: o gēbupu kwa ha je n'azu obodo, n'ebe ruru árú. Ọzọ, onye nābà n'ulo ahu ubọchi nile o mechiri ya gāru árú rue anyasi. Onye nēdina kwa n'ulo ahu gāsu uwe-ya nile; ọzọ, onye nēri ihe n'ulo ahu gāsu uwe-ya nile. Ma ọ buru na onye-nchu-àjà abata nime, le anya, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n'ulo ahu, mb͕e etesiri ulo ahu; onye-nchu-àjà gāsi kwa na ulo ahu di ọcha, n'ihi na emewo ka ihe-otiti ahu la. Ọ gēwere kwa nnunu abua, na osisi cedar, na ogho uhie, na hyssop, iwepu nmehie n'ulo ahu: ọ gēb͕u kwa otù nime nnunu ahu n'ihe ájá n'elu miri nērù erù: ọ gēwere kwa osisi cedar ahu, na hyssop ahu, na ogho uhie ahu, na nnunu ahu di ndu, sue ha nime ọbara nnunu ahu eb͕uru eb͕u na nime miri ahu nērù erù, fesa kwa ulo ahu ub͕ò asa: Ọ gēwepu kwa nmehie n'ulo ahu site n'ọbara nnunu ahu, site kwa na miri ahu nērù erù, site kwa na nnunu ahu di ndu, site kwa n'osisi cedar ahu, site kwa na hyssop ahu, site kwa n'ogho uhie ahu: ma ọ gēzilaga nnunu ahu di ndu n'azu obodo n'ọhia sara iru: ọ gēkpuchi-kwa-ra ulo ahu nmehie-ya: ọ gādi kwa ọcha. Nka bu iwu diri ihe-otiti ekpenta ọ bula, di-kwa-ra ọria-isi; di-kwa-ra ekpenta uwe, di-kwa-ra ulo; di-kwa-ra ihe-otutó, di-kwa-ra ọnyá, di-kwa-ra ntupọ nēke uke: izi ihe n'ubochi nke iru-árú-ya na n'ubọchi nke idi-ọcha-ya: nka bu iwu ekpenta.