ABÙ-ÁKWÁ 3:55-60
ABÙ-ÁKWÁ 3:55-60 Bible Nso (IGBOB)
Esirim n'olùlù dichasi ala kpọkue aha-Gi, Jehova. Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n'iku-umem, na ntikum. I biaruru nso n'ubọchi m'kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu. Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum. Jehova, I huwo nb͕agọm; Gi kpe ikpem. I huwo ibọ̀-ọ́bọ̀ nile ha na èchìchè nile ha n'arum.
Kesaa
Gụọ ABÙ-ÁKWÁ 3ABÙ-ÁKWÁ 3:55-60 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị, gị ONYENWE ANYị. Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị. Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.” Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị. Ị sịrị, “Atụla egwu.” Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m, gị gbapụtara ndụ m. ONYENWE ANYị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m. Kpechitere m ọnụ m. Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile na nzube niile ha na-ezube megide m.
Kesaa
Gụọ ABÙ-ÁKWÁ 3