ABÙ-ÁKWÁ 3:20-25
ABÙ-ÁKWÁ 3:20-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m. Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya. Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke ONYENWE ANYị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ. Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike. Mkpụrụobi m na-ekwu, “ONYENWE ANYị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.” ONYENWE ANYị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
ABÙ-ÁKWÁ 3:20-25 Bible Nso (IGBOB)
Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem. Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere. O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi. Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu. Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya. Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ.