ABÙ-ÁKWÁ 3:13-27
ABÙ-ÁKWÁ 3:13-27 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi. Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile. O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ. O meela ka m jiri okwute tajisie eze m, o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m. Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ. Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka ONYENWE ANYị nweta.” Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu. Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m. Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya. Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke ONYENWE ANYị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ. Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike. Mkpụrụobi m na-ekwu, “ONYENWE ANYị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.” ONYENWE ANYị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike. Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke ONYENWE ANYị. Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya mgbe ọ bụ okorobịa.
ABÙ-ÁKWÁ 3:13-27 Bible Nso (IGBOB)
O mewo ka àkú nile nke àkpà-àkú-Ya ba n'akurum abua. Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile. O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ. O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu. I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma. M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova. Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí. Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem. Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere. O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi. Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu. Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya. Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ. Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya. Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata.