Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ-ÁKWÁ 3:1-66

ABÙ-ÁKWÁ 3:1-66 Bible Nso (IGBOB)

Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n'ala site na nkpa-n'aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya. Mu ka O duworo me ka m'jegharia n'ọchichiri ghara inwe ìhè. N'ezie, mu ka Ọ nātughari aka-Ya megide ọtutu mb͕e ogologo ubọchi nile. O mewo ka anu-arum na akpukpọ-arum ka nká; Ọ b͕ajiwo ọkpukpum nile. O wuwo ńsí na ike-ọgwugwu dika ulo imegidem, were ya b͕am buruburu. N'ebe nile b͕ara ọchichiri ka O meworo ka m'biri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi. Ọ b͕achiwom ogige, m'we ghara ipu apu; O mewo ka ọla eji kem ab͕u di arọ́. Ọzọ, mb͕e m tikuru Chineke nkpu, O mechibido ekperem uzọ. O werewo nkume awara awa b͕achie uzọm nile, okporo-uzọm nile ka O meworo ka ha b͕agọ ab͕agọ. Bear nke nēche anwu ka Ọ burum, ma-ọbu ọdum nke nọ n'ebe-nzuzo di iche iche. Uzọm nile ka O wezugaworo, O we dọbisiem; O mewom ka m'tọb͕ọrọ n'efu. Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, O guzom dika ihe edotara ib͕a àkú. O mewo ka àkú nile nke àkpà-àkú-Ya ba n'akurum abua. Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile. O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ. O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu. I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma. M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova. Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí. Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem. Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere. O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi. Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu. Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya. Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ. Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya. Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata. Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n'ihi na Ọ tukwasiwo ya n'olu-ya. Ya tiye ọnu-ya n'ájá; ma eleghi anya ọ di olile-anya gādi. Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ. N'ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi. N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di. N'ihi na Ọ dighi-esite n'obi-Ya weda umu madu n'ala, mekpa ha aru. Izọpia ndi-nkpọrọ nile nke uwa n'okpuru ukwu, Iwezuga ikpé ọ bula n'iru Onye kachasi ihe nile elu, Ime ka madu b͕agọ ab͕agọ n'okwu-ikpé-ya: Onye-nwe-ayi eleghi ihe ndia anya ọma. Ònye bu onye ahu nke kwuworo okwu, o we rè, mgbe onyenwe-ayi enyeghi iwu? Ọ̀ bughi n'ọnu Onye kachasi ihe nile ka ihe ọjọ na ezi ihe si aputa? Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile? Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova. Ka ayi weliere Chineke Nke bi n'elu-igwe obi-ayi n'ọbu-aka-ayi abua. Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi. I werewo iwe kpuchie Onwe-gi, we chua ayi; I b͕uwo, I nweghi ọmiko. I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga. Ihe azachapuru azachapu na ihe ajuru aju ka I nēme ayi n'etiti ndi nile di iche iche. Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi. Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n'efu na ntipia. Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim. Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi, Rue mb͕e Jehova gēsi n'elu-igwe lepu anya, hu. Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n'ihi umu-ndinyom nile nke obodom. Ndi bu ndi-irom n'efu achusiwo ntám ike dika nnunu. Ha ekpochapuwo ndum n'olùlù, we tuam nkume. Miri rubigaram n'isi; asirim, Ebipuwom. Esirim n'olùlù dichasi ala kpọkue aha-Gi, Jehova. Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n'iku-umem, na ntikum. I biaruru nso n'ubọchi m'kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu. Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum. Jehova, I huwo nb͕agọm; Gi kpe ikpem. I huwo ibọ̀-ọ́bọ̀ nile ha na èchìchè nile ha n'arum. I nuwo ita-uta-ha, Jehova, na èchìchè nile ha megidem; Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi nēbili imegidem, na ntughari-obi-ha megidem ogologo ubọchi nile. Legide inọdu-ala-ha, na nbili-ọtọ-ha; mu onwem bu abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara. I gēnyeghachi ha nmeso-ha, Jehova, dika ọlu aka-ha si di. I gēnye ha ihe-nkpudo obi, bú ọb͕ub͕a-iyi I b͕ara ha. I gāchu ha n'iwe, kpochapu ha n'okpuru elu-igwe nke Jehova.

ABÙ-ÁKWÁ 3:1-66 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Abụ m onye hụrụla ahụhụ site na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe ONYENWE ANYị. O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa nʼọchịchịrị kama nʼìhè. Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m, mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile. O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ, ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ. O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu. O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga. Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị. Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka. O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile, o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ. Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche, na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya, o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ, hapụ m na-enweghị onye inyeaka. Ọ dọọla ụta ya mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata. O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi. Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile. O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ. O meela ka m jiri okwute tajisie eze m, o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m. Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ. Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka ONYENWE ANYị nweta.” Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu. Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m. Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya. Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke ONYENWE ANYị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ. Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike. Mkpụrụobi m na-ekwu, “ONYENWE ANYị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.” ONYENWE ANYị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike. Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke ONYENWE ANYị. Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya mgbe ọ bụ okorobịa. Ya nọrọkwa duu naanị ya, nʼihi na ọ bụ ONYENWE ANYị bokwasịrị ya ibu ahụ. Ya tinye ihu ya nʼaja, nʼihi na olileanya nwere ike dịrị. Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya, ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ. Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya, nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu. Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ, maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ. Iji ụkwụ zọgbuo ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ. Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a? Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ? Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu ka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa? Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu mgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya? Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya. Ka anyị lọghachikwutenụ ONYENWE ANYị. Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye Chineke nọ nʼeluigwe, sị: “Anyị emehiela, nupu isi, ma ị gbagharabeghị. “I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ. I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere. I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị ka ekpere anyị ghara irute gị. I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ nʼetiti mba niile. “Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ ha megide anyị. Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche, na mbibi na ịla nʼiyi.” Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta nʼihi ndị m a lara nʼiyi. Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta na-akwụsịghị akwụsị, tutu ruo mgbe ONYENWE ANYị ga-esite nʼeluigwe ledata anya ma hụ. Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu, nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m. Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla, na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ. Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu site nʼịtụ m nkume. Mmiri kpuchiri m isi, echere m na-efuola m. Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị, gị ONYENWE ANYị. Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị. Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.” Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị. Ị sịrị, “Atụla egwu.” Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m, gị gbapụtara ndụ m. ONYENWE ANYị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m. Kpechitere m ọnụ m. Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile na nzube niile ha na-ezube megide m. ONYENWE ANYị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m na nzube niile ha na-ezube megide m. Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m megide m ogologo ụbọchị niile. Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala. Ha ji abụ na-akọcha m. ONYENWE ANYị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha, nʼihi ihe niile aka ha rụpụtara. Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha. Meekwa ka ịbụ ọnụ gị dịkwasị ha. Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị, ka ha ghara ịdịkwa nʼokpuru eluigwe nke ONYENWE ANYị ọzọ.