Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ-ÁKWÁ 2:1-22

ABÙ-ÁKWÁ 2:1-22 Bible Nso (IGBOB)

Le, ka Onye-nwe-ayi si were igwe-oji kpuchie ada Zaion n'iwe-Ya! O siwo n'elu-igwe tuda ima-nma nke Israel n'ala, Ọ chetaghi kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya n'ubọchi iwe-Ya. Onye-nwe-ayi elowo ebe-obibi nile nke Jekob, ghara inwe ọmiko n'aru ha; Ọ kwadawo ebe nile ewusiri ike nke ada Juda nime nrubiga-ókè nke iwe-Ya: O tidaruwo ha ala: O mewo ala-eze na ndi-isi-ya ka ha ghara idi nsọ. O bipuwo mpi nile ọ bula nke Israel n'iwe di ọku; O seghachiwo aka-nri-Ya azu site n'iru onye-iro: O rechapuwo kwa Jekob dika ọku nēnwu enwu, nke nēripia buruburu. Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya dika onye-iro, O werewo aka-iri-Ya guzo Onwe-ya dika onye-nkpab͕u, We b͕ue ndi nile anya nāchosi ike: N'ulo-ikwū nke ada Zaion ka Ọ wusiworo ọnuma-Ya dika ọku. Onye-nwe-ayi adiwo ka onye-iro, Ọ lodawo Israel; O lodawo ulo-elu-ya nile, O bibiwo ebe-Ya nile ewusiri ike: O me ka ize-ume na isu-ude ba uba n'ada Juda. Ọ napuwo kwa ulo-ntu-Ya n'ike, dika agāsi na ọ bu nke ubi ab͕ara ogige; O bibiwo mb͕e-Ya akara àkà: Jehova emewo ka echezọ mb͕e akara àkà na ubọchi-izu-ike nime Zaion, O we ju eze na onye-nchu-àjà n'ọmuma nke iwe-Ya. Onye-nwe-ayi ajusiwo ebe-ichu-àjà-Ya, Ọ sọwo ebe nsọ Ya oyi, O mechibidowo mb͕idi nile nke ulo-elu-ya nile nye n'aka onye-iro: Ha emewo ka olu-ha da udà n'ulo Jehova, dika n'ubọchi nke mb͕e akara àkà. Jehova echèwo ibibi mb͕idi ada Zaion; O setiwo eriri, O sepughi aka-Ya n'olulo: O we me ka ékpè na mb͕idi rue újú; n'otù ka ha talatakọworo. Ọnu-uzọ-ama-ya nile emikpuwo n'ala; O mewo ka ihe-ntuchi-ya nile la n'iyì, Ọ b͕ajiwo kwa ha: Eze-ya na ndi-isi-ya nọ n'etiti mba nile ebe iwu nādighi; Ọzọ, ndi-amuma-ya achọtaghi ọhù nke sitere na Jehova. Ndi-okenye nke ada Zaion nānọdu ala, dere du; Ha ekpokwasiwo ájá n'isi-ha; ha ekewo ákwà-nkpe n'úkwù-ha: Umu-ab͕oghọ Jerusalem ndi nāmaghi nwoke erulatawo isi-ha n'ala. Anyam abua adalawo n'isi site n'anya-miri, ngiri-afọm anuwom ọku, Awusiwo umejum n'ala dika miri, n'ihi ntipia nke ada ndim; N'ihi na umu-ntakiri na umu nke nāṅu ara nāda #mbà n'amá nile nke obodo. Ha nāsi nne-ha, Òle ebe ọka na manya-vine di? Mb͕e ha nāda #mbà dika onye emeruru aru n'amá nile nke obodo, Mb͕e nkpuru-obi-ha nāwusi onwe-ya dika miri n'obi ndi bu nne-ha. Gini, bu àmà M'gāb͕ara gi? gini ka M'gēji tuyere gi, gi ada Jerusalem? Gini ka M'gēme ka gi na ya rata, ka M'we kasie gi obi, gi ada Zaion nāmaghi nwoke? N'ihi na ihe di uku dika oké osimiri ka nb͕awa-gi bu: ònye gāgwọta gi? Ndi-amuma-gi ahutaworo gi ọhù ihe-efu na ihe-nzuzu; Ma ha ekpugheghi ajọ omume-gi, ime ka ndi-gi adọtara n'agha lata: Kama ha ahutaworo gi ibu di iche iche nke ihe-efu na ihe-nchupu di iche iche. Ndi nile ndi nāgabiga n'uzọ akuwo aka megide gi; Ha amawo ọsọ̀ fufere ada Jerusalem isi, si: Ọ̀ bu nka bu obodo ahu nke anākpọ Ebe mazuru nma, Ihe-obi-utọ nke uwa nile? Ndi-iro-gi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide gi; Ha amawo ọsọ̀, ta ikekere-ezé; ha asiwo, Ayi elodawo ya; N'ezie nka bu ubọchi ahu nke ayi lere anya ya; ayi achọtawo, ayi ahuwo. Jehova emewo ihe nke O zubere; O mezuwo okwu-ọnu-Ya nke O nyere n'iwu site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie; Ọ kwadawo, ghara inwe ọmiko: O we me ka onye-iro ṅuria ọṅu n'aru gi, O mewo ka mpi nke ndi nākpab͕u gi di elu. Obi-ha tikuru Onye-nwe-ayi nkpu: Gi mb͕idi ada Zaion, me ka anya-miri rùda dika osimiri ehihie na abali; Enyela onwe-gi izu-ike; ka nwa-anya-gi ghara ikwusi akwusi. Bilie, tie nkpu n'abali, na nmalite nche di iche iche; Wusi obi-gi dika miri na ncherita-iru Onye-nwe-ayi: Chilie aka-gi n'ebe Ọ nọ n'ihi ndu umu-ntakiri-gi, Ndi nāda #mbà n'agu n'isi èsí nile. Le, Jehova, legide onye I meworo otú a anya! Ndinyom, hà gēri nkpuru-ha, bú umu-ntakiri anātughari n'aka? Àgēb͕u onye-nchu-àjà na onye-amuma n'ebe nsọ nke Onye-nwe-ayi? Nwa-okoro na agadi-nwoke edinawo ala n'èzí nile; Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam adawo site na mma-agha: I b͕uwo ha n'ubọchi iwe-Gi; I b͕usiwo, I nweghi ọmiko. I nākpọ, dika n'ubọchi nke mb͕e akara àkà, ujọm nile di buruburu, Ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu n'ubọchi nke iwe Jehova: Umum ndi m'tughariworo n'aka zulite, onye-irom emewo ka ha gwusia.

ABÙ-ÁKWÁ 2:1-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Lee ka Onyenwe anyị si jiri igwe ojii nke iwe ya kpuchie ada Zayọn! O sitela nʼeluigwe tụda ịma mma Izrel nʼala, o chetakwaghị ebe mgbakwasị ụkwụ ya, nʼụbọchị iwe ya. Onyenwe anyị elodala ebe obibi niile nke Jekọb; na-enweghịkwa ọmịiko nʼebe ọ nọ. O sitela nʼoke iwe ya dọdasịa ebe niile e wusiri ike nke ada Juda. Ọ wedala alaeze ya na ndị ụmụ eze ya nʼala, mee ka ha gharakwa ị nwee nsọpụrụ. O sitela nʼoke iwe ya bipụ ike niile Izrel nwere. O seghachiri aka nri ya, mgbe ndị iro ha na-abịa nso. O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb; si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya. O kweela ụta ya, jide ya nʼaka nri ya, dịka onye iro. Dịka onye iro kwa o gbuola ndị ahụ niile mara mma ile anya; ọ wụpụla iwe ya, dịka ọ bụ ọkụ, nʼelu ụlọ ada Zayọn. Onyenwe anyị dị ka onye iro, o lomichaala Izrel. O lomichaala ụlọeze ya niile, bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike. O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa mụbaara ada Juda. O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige; o bibiela ebe nzukọ ya niile. ONYENWE ANYị emeela ka Zayọn chezọọ ime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ. Site nʼoke iwe ya, ọ jụla eze na onye nchụaja. Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya gbakụta ebe nsọ ya azụ. O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya nyefee nʼaka onye iro; ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ ONYENWE ANYị dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka. ONYENWE ANYị ekpebiela ibibi mgbidi gbara ada Zayọn gburugburu. O setịpụrụ ihe ọtụtụ; o sepụkwaghị aka ya na ibibi ya. O mere ka mkputamkpu aja na mgbidi ruo ụjụ, meekwa ka ha richapụsịa. Ọnụ ụzọ ama ya niile emikpuola nʼala; ọ gbajiela mkpọrọ niile e ji akpọchi ha, laakwa ha nʼiyi. A dọtala eze ya na ụmụ eze ya nʼagha, buru ha jee mba ọzọ. Iwu adịghịkwa, otu a, ndị amụma ya enwekwaghị ike ịhụ ọhụ site nʼebe ONYENWE ANYị nọ. Ndị okenye ada Zayọn nọ ọdụ nʼala, dere duu. Ha ekpokwasịla aja nʼisi ha; ha eyikwasịkwala onwe ha uwe mkpe. Ụmụ agbọghọ Jerusalem na-amaghị nwoke ehulatala isi ha nʼala. Ike agwụla anya m nʼihi ịkwa akwa, ime ime ahụ m na-anụ ọkụ. Obi m dị ka ihe a wụpụrụ nʼala, nʼihi na e bibiela ndị m, nʼihi na ụmụntakịrị na ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-ada mba nʼokporoụzọ nke obodo. Ha na-ebere nne ha akwa na-asị, “Olee ebe ọka na mmanya dị?” Mgbe ha na-ada mba dịka ndị e merụrụ ahụ nʼokporoụzọ obodo, mgbe ọnwụ ji nwayọọ na-eripịasị ndụ ha nʼaka nne ha ku ha. Gịnị ka m nwere ike ikwu banyere gị? Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị, gị ada Jerusalem? Gịnị ka m ga-asị na i yiri, nke ga-enyere m aka ịmata otu m ga-esi kasịe gị obi, gị ada Zayọn na-amaghị nwoke? Ọnya dị gị nʼahụ miri emi, dịka ịdị omimi nke osimiri. Onye pụrụ ịgwọ gị? Ọhụ niile ndị amụma gị hụrụ bụ ọhụ ụgha na ọhụ na-enweghị isi. Ha ekpugheghị mmehie gị, igbochi ndọta nʼagha nke a dọtara gị. Kama ihe ha hụtaara gị bụ ihe ụgha na nduhie. Ndị niile si nʼebe ị nọ na-agafe na-akụrụ gị aka ha; ha na-efufe isi ha, jirikwa ada Jerusalem na-eme ihe ọchị. Ha na-ajụ ajụjụ na-asị, “Nke a ọ bụ obodo ahụ a na-akpọ ebe mabigara mma oke, ọṅụ nke ụwa niile?” Ndị iro gị niile na-emeghepụ ọnụ ha megide gị; ha na-achị gị ọchị, na-atara gị ikekere eze. Ha na-ekwu na-asị, “Anyị eloola ya. Nke a bụ ụbọchị ahụ anyị na-ele anya ya. Anyị adịrịla ndụ hụ ya.” ONYENWE ANYị emeela ihe o zubere ime. O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime site nʼoge gara aga. Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla. O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị; o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị. Obi ndị mmadụ na-etiku Onyenwe anyị. Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn, ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri ehihie na abalị niile, enyekwala onwe gị izuike, enyekwala anya gị izuike. Bilie, kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị. Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị dịka ọ bụ mmiri. Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị nʼihi ụmụntakịrị ndị a, ndị na-ada nʼihi agụụ nʼisi okporoụzọ niile. “Lee anya, ONYENWE ANYị, ma tụgharịa uche gị. Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso? O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha, bụ ụmụ nke ha mụrụ? O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị? “Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe, nʼuzuzu nke okporoụzọ. E jirila mma agha gbuo ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m. I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị; i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha. “Dịka i si akpọ oku ka a bịa nʼụbọchị oriri, otu a ka i si kpọkọta ihe egwu niile ka ha bịakwasị m nʼakụkụ niile. Nʼụbọchị nke iwe ONYENWE ANYị ọ dịghị onye gbapụrụ ọsọ, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ndụ; ndị m lekọtara, zụlitekwa ka ndị iro m lara nʼiyi.”