JOSHUA 8:1-2
JOSHUA 8:1-2 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we si Joshua, Atula egwu, atu-kwa-la ujọ: chiri ndi-agha nile tiyere onwe-gi, bilie, rigorue Ai: le, enyewom eze Ai, na ndi-ya, na obodo-ya, na ala-ya, n'aka-gi: i gēme kwa Ai, me kwa eze-ya, dika i mere Jeriko, me kwa eze-ya: nání, na unu gālutara onwe-unu n'agha ihe-nkwata-ya, na anu-ulo-ya: doro onwe-gi ndi nēru nbì megide obodo ahu n'azu ya.
JOSHUA 8:1-2 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị sịrị Joshua, “Atụla egwu, adakwala mba. Chịrị ndị agha gị niile gaa Ai, nʼihi na ugbu a, unu onwe unu ga-emeri ha. Aga m eme ka i merie eze ndị Ai, na ndị ya na obodo ya, na ala ya. Ị ga-emekwa obodo Ai na eze ya ihe i mere Jeriko na eze ya. Ma ihe dị iche na nke a bụ na unu ga-edebere onwe unu ihe niile unu kwatara nʼagha, ya bụ anụ ụlọ niile na ngwongwo obodo ahụ niile. Jikerenụ ibuso ha agha. Ọ bụkwa nʼazụ obodo ha ka unu ga-esi lụso ha agha.”