JOSHUA 6:8-25
JOSHUA 6:8-25 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e Joshua gwara ndi Israel okwu, ndi-nchu-àjà asa ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n'iru Jehova we gabiga, we nāfù opì-ike asa ahu: ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we nējeso ha n'azu. Ndi ejikere we nēje n'iru ndi-nchu-àjà ndi nāfù opì-ike asa ahu, ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e ahu n'azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje. Joshua we nye ndi Israel iwu, si, Unu etila nkpu, unu ekwe-kwa-la ka anu olu-unu, okwu ọ bula agaghi-esi kwa n'ọnu-unu puta, rue ubọchi m'gāsi unu, Tienu nkpu; unu ewe tie nkpu. Ọ we me ka ib͕e Jehova b͕a obodo ahu buruburu, nēje ya buruburu otù ub͕ò: ha we bata n'ọmuma-ulo-ikwū, nọ ọnọdu-abali n'ọmuma-ulo-ikwū. Joshua we bilie n'isi-ututu, ndi-nchu-àjà we būru ib͕e Jehova. Ndi-nchu-àjà asa ahu ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n'iru ib͕e Jehova nējegide, nāfù kwa opì-ike asa ahu: ndi ejikere nēje kwa n'iru ha; ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e Jehova n'azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje. N'ubọchi nke-abua ha we b͕a obodo ahu buruburu otù ub͕ò, we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū: otú a ka ha mere ubọchi isi. O rue n'ubọchi nke-asa, na ha biliri n'isi-ututu mb͕e chi nābọ, we b͕a obodo ahu buruburu n'otù uzọ ahu ub͕ò asa: nání, n'ubọchi ahu ha b͕ara obodo ahu buruburu ub͕ò asa. O rue, n'ub͕ò nke-asa, mb͕e ndi-nchu-àjà fùru opì-ike asa ahu, na Joshua siri ndi Israel, Tienu nkpu; n'ihi na Jehova enyewo unu obodo ahu. Obodo ahu gābu ihe ewezugara nye Jehova, ya onwe-ya, na ihe nile di nime ya: nání Rehab, bú nwayi nākwa iko, gādi ndu, ya onwe-ya na ndi nile ya na ha nọ n'ulo, n'ihi na o zobere ndi-ozi ndi ayi zigara. Ma otú ọ di, unu onwe-unu debenu onwe-unu ka unu ghara imetu ihe ewezugara nye Jehova aka, ka unu we ghara iwere ihe ahu ewezugara, mb͕e unu wezugasiri ya; unu ewe me ka ọmuma-ulo-ikwū Israel buru ihe ewezugara ka ebibie ya, unu ewe mekpa ya aru. Ma ọla-ọcha nile, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, nsọ ka ha diri Jehova: ha gābà n'ulo-àkù Jehova. Ndi Israel we tie nkpu, ndi-nchu-àjà we fùa opì-ike asa ahu: o rue, mb͕e ndi Israel nuru olu opì-ike, na ndi Israel tiri oké nkpu, mb͕idi ahu we da n'okpuru ya, ndi Israel we rigo n'obodo ahu, nwoke ọ bula na ncherita-iru ya, ha we were obodo ahu. Ha we were ọnu mma-agha wezuga ihe nile di n'obodo ahu ka ebibie ya, ma nwoke ma nwayi, ma nwata ma okenye, na ehi, na aturu, na inyinya-ibu. Joshua we si ndikom abua ahu ndi nēledori ala ahu, Banu n'ulo nwayi ahu nākwa iko, menu ka nwanyi ahu na ihe nile o nwere puta, dika unu ṅuru ya iyi. Umu-okorọbia ahu, bú ndi-nledo, we ba nime, me ka Rehab, na nna-ya, na nne-ya, na umu-nne-ya, na ihe nile ọ nwere, puta, ab͕uru-ya nile ka ha me-kwa-ra ka ha puta; ha we me ka ha nọdu n'azu ọmuma-ulo-ikwū Israel. Ha we sure obodo ahu n'ọku, na ihe nile nke di nime ya: nání ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, ka ha tiyere n'ulo-àkù Jehova. Ma Joshua mere ka Rehab, bú nwayi nākwa iko, na ulo nna-ya, na ihe nile ọ nwere, di ndu; ọ we biri n'etiti Israel, rue ta; n'ihi na o zobere ndi-ozi ahu, ndi Joshua zigara iledo Jeriko.
JOSHUA 6:8-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Joshua gwachara ndị Izrel okwu, ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike nʼaka ha, nʼihu ONYENWE ANYị, gafere nʼihu na-afụ opi ike ha. Ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị sochiri ha azụ. Ndị agha na-aga nʼihu ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi ike, ebe ndị agha ndị ọzọ na-esote igbe ọgbụgba ndụ nʼazụ. Nʼoge a niile ha na-azọ ije, ndị na-afụ opi ike gara nʼihu na-eme nke a. Ma Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Unu emela mkpọtụ agha ọbụla, maọbụ kwee ka anụ olu unu, maọbụ kwuo okwu ọbụla, tutu ruo ụbọchị m ga-asị unu tie mkpu. Mgbe m nyere unu iwu a, tienụ ezi mkpu.” Ya mere, e buuru igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị ahụ jegharịa obodo ahụ gburugburu otu ugboro nʼụbọchị ahụ. Mgbe ha mesịrị nke a, onye ọbụla laghachiri nʼebe ụlọ ikwu ya dị rahụ ụra abalị. Joshua biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị nchụaja bulikwara igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị. Ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike asaa ndị ahụ, na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị, na-afụ opi ike ha na-esepụghị aka. Ndị agha nọ nʼihu ha, ebe ndị nche na-eso ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị nʼazụ, nʼoge niile a a na-afụ opi ike ndị a na-esepụghị aka. Nʼụbọchị nke abụọ, ha gbara obodo ahụ gburugburu otu ugboro, laghachikwa nʼụlọ ikwu ha. Otu a ka ha mere ruo nʼụbọchị nke isii. Ma nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke asaa, ha bilitere mgbe chi na-abọbeghị, gbaa obodo ahụ gburugburu ugboro asaa dịka ha na-eme. Ma ọ dị iche nʼụbọchị ahụ, bụ naanị na ha gbara obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. O ruo, nʼoge njegharị nke ugboro asaa ahụ, mgbe ndị nchụaja asaa ndị a fụsiri opi ike asaa ndị ahụ ike karịa, ka Joshua gwara ndị Izrel sị ha, “Tienụ mkpu! Nʼihi na ONYENWE ANYị enyela unu obodo a! Gbuonụ ihe niile na-eku ume ndụ, nʼihi na obodo a na ihe niile dị nʼime ha bụ ihe e doro nsọ nye ONYENWE ANYị. Ma ọ bụ naanị Rehab, nwanyị akwụna ahụ ka unu ga-ahapụ ndụ, ya na ndị ọbụla nọ nʼụlọ ya. Nʼihi na o zoro ndị anyị zigara inyochapụta obodo ahụ. Ma unu onwe unu, wezuganụ onwe unu pụọ nʼebe ihe ndị a kwadoro mbibi dị, ka unu gharakwa iweta ịla nʼiyi nye onwe unu site na iwere ihe ọbụla nʼime ha. Ma ọ bụghị otu a, unu ga-eme ka mbibi dakwasị ụlọ ikwu ụmụ Izrel niile. Ma ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, ka a ga-edo iche nye ONYENWE ANYị. A ga-ewebata ha nʼụlọakụ ONYENWE ANYị.” Mgbe ụda opi ike ahụ dasiri ike, ndị agha tiri mkpu, na ụda opi ike ahụ. Mgbe ndị ikom tiri oke mkpu, mgbidi ahụ dara dapịasịa, nke mere na onye ọbụla chere ihu banye nʼime obodo ahụ, lụgbuo obodo ahụ. Ha debere obodo a iche nye ONYENWE ANYị site nʼiji mma agha ha gbuchapụ ihe niile dị ndụ nʼobodo ahụ, ma nwoke, ma nwanyị, ma nwantakịrị, ma okenye, ma ehi, ma atụrụ, ma ịnyịnya ibu, ihe niile dị nʼime ya. Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị ikom abụọ ahụ buru ụzọ gaa nnyochapụta obodo ahụ anya sị ha, “Mezuonụ nkwa unu kwere. Gaanụ nʼụlọ nwanyị akwụna, kpọpụta ya na ndị niile dị nʼụlọ ya.” Ya mere, ụmụ okorobịa abụọ ahụ bụ ndị mere nledo ala ahụ, bara nʼụlọ ahụ, kpọpụta Rehab na nna ya na nne ya na ụmụnne ya na ndị ikwu ya niile. Ha kpọpụtara ndị ezinaụlọ ya niile debe ha nʼotu ebe nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel. Ha kpọrọ obodo ahụ ọkụ, ya na ihe niile dị nʼime ya. Ma ha wepụtara naanị ọlaọcha na ọlaedo, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, tinye nʼụlọakụ ONYENWE ANYị. Joshua mere ka Rehab, nwanyị akwụna ahụ, na ndị ezinaụlọ ya niile dịrị ndụ. Nʼihi na Rehab zoro ndị ikom abụọ Joshua zigara, mee ka ha dị ndụ, bụ ndị gara inyochapụta obodo Jeriko. Ya mere, o binyere ndị Izrel ruo taa.