Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOSHUA 6:6-15

JOSHUA 6:6-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ya mere, Joshua nwa Nun kpọrọ ndị nchụaja sị ha, “Burunu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị ahụ, ka ndị nchụaja asaa nʼime unu werekwa opi mpi ebule buru ụzọ na-aga nʼihu ya.” Mgbe ahụ Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Zọlịenụ ije! Gbaanụ obodo a gburugburu, ka ndị agha na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị.” Mgbe Joshua gwachara ndị Izrel okwu, ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike nʼaka ha, nʼihu ONYENWE ANYị, gafere nʼihu na-afụ opi ike ha. Ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị sochiri ha azụ. Ndị agha na-aga nʼihu ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi ike, ebe ndị agha ndị ọzọ na-esote igbe ọgbụgba ndụ nʼazụ. Nʼoge a niile ha na-azọ ije, ndị na-afụ opi ike gara nʼihu na-eme nke a. Ma Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Unu emela mkpọtụ agha ọbụla, maọbụ kwee ka anụ olu unu, maọbụ kwuo okwu ọbụla, tutu ruo ụbọchị m ga-asị unu tie mkpu. Mgbe m nyere unu iwu a, tienụ ezi mkpu.” Ya mere, e buuru igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị ahụ jegharịa obodo ahụ gburugburu otu ugboro nʼụbọchị ahụ. Mgbe ha mesịrị nke a, onye ọbụla laghachiri nʼebe ụlọ ikwu ya dị rahụ ụra abalị. Joshua biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị nchụaja bulikwara igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị. Ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike asaa ndị ahụ, na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị, na-afụ opi ike ha na-esepụghị aka. Ndị agha nọ nʼihu ha, ebe ndị nche na-eso ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị nʼazụ, nʼoge niile a a na-afụ opi ike ndị a na-esepụghị aka. Nʼụbọchị nke abụọ, ha gbara obodo ahụ gburugburu otu ugboro, laghachikwa nʼụlọ ikwu ha. Otu a ka ha mere ruo nʼụbọchị nke isii. Ma nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke asaa, ha bilitere mgbe chi na-abọbeghị, gbaa obodo ahụ gburugburu ugboro asaa dịka ha na-eme. Ma ọ dị iche nʼụbọchị ahụ, bụ naanị na ha gbara obodo ahụ gburugburu ugboro asaa.

JOSHUA 6:6-15 Bible Nso (IGBOB)

Joshua nwa Nun we kpọ ndi-nchu-àjà, si ha, Būrunu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu, ndi-nchu-àjà asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n'iru ib͕e Jehova. Ha we si ndi Israel, Gabiganu, b͕a obodo ahu buruburu, ndi ejikere gāgabiga kwa n'iru ib͕e Jehova. O rue, mb͕e Joshua gwara ndi Israel okwu, ndi-nchu-àjà asa ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n'iru Jehova we gabiga, we nāfù opì-ike asa ahu: ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we nējeso ha n'azu. Ndi ejikere we nēje n'iru ndi-nchu-àjà ndi nāfù opì-ike asa ahu, ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e ahu n'azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje. Joshua we nye ndi Israel iwu, si, Unu etila nkpu, unu ekwe-kwa-la ka anu olu-unu, okwu ọ bula agaghi-esi kwa n'ọnu-unu puta, rue ubọchi m'gāsi unu, Tienu nkpu; unu ewe tie nkpu. Ọ we me ka ib͕e Jehova b͕a obodo ahu buruburu, nēje ya buruburu otù ub͕ò: ha we bata n'ọmuma-ulo-ikwū, nọ ọnọdu-abali n'ọmuma-ulo-ikwū. Joshua we bilie n'isi-ututu, ndi-nchu-àjà we būru ib͕e Jehova. Ndi-nchu-àjà asa ahu ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n'iru ib͕e Jehova nējegide, nāfù kwa opì-ike asa ahu: ndi ejikere nēje kwa n'iru ha; ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e Jehova n'azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje. N'ubọchi nke-abua ha we b͕a obodo ahu buruburu otù ub͕ò, we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū: otú a ka ha mere ubọchi isi. O rue n'ubọchi nke-asa, na ha biliri n'isi-ututu mb͕e chi nābọ, we b͕a obodo ahu buruburu n'otù uzọ ahu ub͕ò asa: nání, n'ubọchi ahu ha b͕ara obodo ahu buruburu ub͕ò asa.