JOSHUA 24:16-33
JOSHUA 24:16-33 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ ONYENWE ANYị fee chi ndị ọzọ! Ọ bụ ONYENWE ANYị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee. Ọ bụ ONYENWE ANYị chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe ONYENWE ANYị, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.” Joshua zaghachiri ndị Izrel sị, “Unu apụghị ife ONYENWE ANYị ofufe; nʼihi na ọ bụ Chineke dị nsọ, bụrụkwa Chineke ekworo. Ọ gaghị agbaghara unu nnupu isi unu na mmehie unu niile. Ọ bụrụ na unu agbakụta ONYENWE ANYị azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.” Ma ndị Izrel sịrị Joshua, “Mba, kama ONYENWE ANYị ka anyị ga-efe ofufe.” Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife ONYENWE ANYị ofufe.” Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.” Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere ONYENWE ANYị Chineke Izrel isi.” Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe ONYENWE ANYị Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.” Ya mere, Joshua na ndị Izrel gbara ndụ nʼụbọchị ahụ na Shekem. O nyere ha iwu na ụkpụrụ ha ga-edebe. Joshua dere iwu ndị a ụmụ Izrel kwere na ha ga-eme nʼAkwụkwọ Iwu Chineke. Emesịa, o bupụtara otu nkume buru ibu guzo ya nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼakụkụ ebe nsọ ONYENWE ANYị. Joshua sịrị ndị ahụ niile, “Lee, nkume a ga-abụ ihe ama megide anyị. Nʼihi na ọ nụla okwu niile nke ONYENWE ANYị gwara anyị. Ọ ga-abụkwa ihe ama megide unu, ma ọ bụrụ na unu mee ihe mmekpu megide Chineke unu.” Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha. Ọ dịghị anya, mgbe ihe ndị a gasịrị, Joshua nwa Nun, odibo ONYENWE ANYị nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ na iri. E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, na Timnat Sera, nʼime ala ugwu ugwu Ifrem, nʼakụkụ ugwu dị nʼala Gaash. Ndị Izrel fere ONYENWE ANYị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, ndị maakwara ihe niile nke ONYENWE ANYị rụụrụ ndị Izrel. Ọkpụkpụ Josef ndị Izrel chịtara mgbe ha si nʼala Ijipt pụta, ka ha liri na Shekem, nʼime ala ahụ Jekọb zụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha nʼaka ụmụ Hamọ nna Shekem. Ala a ghọrọ nʼihe nketa ụmụ Josef. Elieza nwa Erọn, nwụkwara. E liri ya nʼala ugwu ugwu ndị Ifrem, na Gibea, obodo e nyere nwa ya bụ Finehaz.
JOSHUA 24:16-33 Bible Nso (IGBOB)
Ndi Israel we za, si, Ya buru ayi ihe-árú irapu Jehova, ifè chi ọzọ òfùfè; n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, Ya onwe-ya bu onye mere ka ayi na nna-ayi-hà si n'ala Ijipt, si n'ulo ndi-orù, rigota, Onye me-kwa-ra ihe-iriba-ama uku ahu nile n'anya-ayi, debe ayi n'uzọ ahu nile nke ayi jere ije nime ya, na n'etiti ndi nile nke ayi gabigara n'etiti ha: Jehova we chupu ndi ahu nile n'iru ayi, bú ndi-Amorait ndi bi n'ala nka: ayi onwe-ayi gēfè kwa Jehova òfùfè; n'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi. Joshua we si ndi Israel, Unu apughi ifè Jehova òfùfè; n'ihi na Chineke di nsọ ka Ọ bu; Chineke ekworo ka Ọ bu; Ọ gaghi-ab͕aghara njehie-unu na nmehie nile unu. Mb͕e unu gārapu Jehova, fè chi ala ọzọ òfùfè, Ọ gēchighari kwa mejọ unu, me ka unu gwusia, mb͕e O mesiri unu nma. Ndi Israel we si Joshua, É-è; kama Jehova ka ayi gēfè òfùfè. Joshua we si ndi Israel, Ndi-àmà megide onwe-unu ka unu bu, na unu onwe-unu arọputaworo onwe-unu Jehova, ifè Ya òfùfè. Ha we si, Ndi-àmà ka ayi bu. Ọ si, Ma ub͕u a, wezuganu chi ala ọzọ nile nke di n'etiti unu, do-kwa-ra Jehova, bú Chineke Israel, obi-unu. Ndi Israel we si Joshua, Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēfè òfùfè, olu-Ya ka ayi gēge kwa nti. Joshua na ndi Israel we b͕a ndu ubọchi ahu, o we doro ha ukpuru na ikpé nime Shekem. Joshua we de okwu ndia n'akwukwọ iwu Chineke; o we were nkume uku, me ka o guzo ọtọ n'ebe ahu n'okpuru osisi oak ahu nke di n'ebe nsọ Jehova. Joshua we si ndi Israel nile, Le, nkume a gābu àmà megide ayi; n'ihi na ọ nuwo okwu-ọnu nile nke Jehova nke Ọ gwara ayi: ọ gābu kwa àmà megide unu, ka unu we ghara igọnari Chineke-unu. Joshua we zilaga ndi Israel, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya. O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Joshua nwa Nun, bú orù Jehova, nwuru, mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri. Ha we lìe ya n'ókè-ala nke ihe-nketa-ya nime Timnat-sera, nke di n'ugwu Efraim, n'akuku Ugwu nke ugwu Gaash. Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi ma-kwa-ra omume nile nke Jehova, nke O mere Israel. Ha we lìe ọkpukpu Josef, nke umu Israel si n'Ijipt bugota, nime Shekem, n'òkè ọhia ahu nke Jekob zutara n'aka umu Hemoa nna Shekem n'ọgu nkpuru-ego ise: ha we ghọrọ umu Josef ihe-nketa. Eleeza nwa Eron we nwua; ha we lìe ya n'ugwu Finehas nwa-ya, nke enyere ya n'ugwu Efraim.