Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOSHUA 23:1-16

JOSHUA 23:1-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ma mgbe ọtụtụ oge gasịrị, site nʼoge ONYENWE ANYị mere ka Izrel nwee ezumike nʼebe ndị iro gbara ha okirikiri nọ, Joshua aghọọla agadi, gbaa ọtụtụ afọ. Ya mere, Joshua kpọrọ ndị Izrel niile, ndị okenye ha, ndị ndu ha, ndị odozi okwu ha na ndịisi ha, sị ha, “Emeela m agadi gbaakwa ọtụtụ afọ. Unu onwe unu ejirila anya unu hụ ihe niile ONYENWE ANYị Chineke unu mere mba ndị a niile, nʼihi unu. Ọ lụụrụ unu ọgụ, nyere unu aka imeri ndị iro unu. Unu hụrụ na ekekwarala m unu ala mba ahụ niile nke fọdụrụnụ ka ha bụrụ ihe nketa ebo unu, site na Jọdan, tinyekwara mba niile ndị ahụ m kpochapụrụ nʼakụkụ osimiri Mediterenịa dị na mpaghara ọdịda anyanwụ. ONYENWE ANYị bụ Chineke unu ga-akwapụ ndị bi nʼime ha nʼihi unu. Ọ ga-achụpụ ha nʼihu unu, mee ka unu nweta ala ha, dịka ONYENWE ANYị Chineke unu kwere unu nkwa. “Ya mere, dịnụ ike, lezienụ anya idebezu na irube isi nʼihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu Mosis. Unu esila nʼime ya wezuga onwe unu nʼụzọ ọbụla. Lezienụ anya ka unu na mba ndị a fọdụrụ nʼala a ghara inwe mmekọ ọbụla. Unu akpọtụkwala chi ha niile aha. Unu aṅụkwala iyi nʼaha ha, maọbụ fee ha ofufe, maọbụ kpọọ isiala nye ha. Kama raparanụ nʼahụ ONYENWE ANYị Chineke unu dịka unu mere ruo taa. “ONYENWE ANYị achụpụla mba dị ukwuu na mba siri ike site nʼebe unu nọ. O nwekwaghị otu mba nʼime ha o kwere ka ha merie unu. Otu nwoke nʼime unu achụọla puku ndị ikom ndị iro unu ọsọ. Nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke unu alụọlara unu ọgụ, dịka ya onwe ya kwere nkwa. Nʼihi ya, lezienụ onwe unu anya nke ọma ka unu hụ ONYENWE ANYị Chineke unu nʼanya. “Ma ọ bụrụ na unu alaghachi azụ, ma kwere ka e jikọọ unu na mba ndị a fọdụrụ nʼetiti unu. Ọ bụrụ na unu na ha ebido ịlụrịta di na nwunye, na-emekọrịta ihe ọnụ, maranụ nke ọma, na ONYENWE ANYị Chineke unu agaghị achụpụrụ unu mba ndị a site nʼala unu. Kama ha ga-abụrụ unu igbudu na ọnya. Ha ga-abụkwara unu apịpịa nʼakụkụ unu, na ogwu nʼanya unu, ruo mgbe unu ga-ala nʼiyi nʼezi ala a, nke ONYENWE ANYị Chineke unu nyere unu. “Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m ga-agbaso ụzọ ahụ ndị niile bi nʼụwa na-aghaghị ịgbaso. Unu niile maara nʼime obi unu na nʼime mkpụrụobi unu na o nweghị otu nʼime nkwa ọma ONYENWE ANYị Chineke unu kwere nye unu nke na-emezughị. E mezuola nkwa ndị a niile; o nweghị nke ọbụla a na-emezughị. Ma dịka ezi nkwa niile ONYENWE ANYị Chineke unu kwere si bụrụ ihe e mezuru emezu, otu a kwa ka ONYENWE ANYị ga-esi mee ka ihe ọjọọ niile ọ bara mba ya mezuo nʼisi unu, tutu ruo mgbe o mere ka unu laa nʼiyi nʼezi ala ahụ ọ na-enye unu. Ọ bụrụ na unu emebie ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYị Chineke unu, nke o nyere unu iwu idebe, tụgharịa malite ịgbaso na ife chi ndị ọzọ na ịkpọ isiala nye ha, iwe ONYENWE ANYị ga-adị ọkụ megide unu, unu ga-alakwa nʼiyi ngwangwa nʼala ọma ahụ o nyere unu.”

JOSHUA 23:1-16 Bible Nso (IGBOB)

O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri site na mb͕e Jehova mere ka Israel zuru ike pua n'aka ndi-iro-ha nile buruburu, mb͕e Joshua ghọrọ agadi, mb͕e ubọchi ndu-ya nāgwu, na Joshua kpọrọ Israel nile, bú ndi-okenye-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha, si ha, Mu onwem aghọwo agadi, ubọchi ndum nāgwu: unu onwe-unu ahuwo kwa ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, meworo mba ndia nile n'ihi unu; n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ọ̀gù. Lenu, emewom ka mba ndia nke fọduru dayere unu n'ihe-nketa diri ebo nile unu, site na Jọdan, ha na mba ahu nile ndi m'bipuworo, we rue oké osimiri uku ahu n'ọdida anyanwu. Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya gākwapu kwa ha n'iru unu, napu kwa ha ala-ha n'iru unu; unu gēnweta kwa ala-ha, dika Jehova, bú Chineke-unu, gwara unu okwu. Di-kwa-nu ike nke-uku idebe na ime ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu Moses, ka unu ghara isi nime ya wezuga onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe; ka unu ghara ibà nime mba ndia, ndi fọduru n'etiti unu; unu ehota-kwa-la aha chi nile ha, unu eme-kwa-la ka ewere ha ṅua iyi, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha: kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gārapara n'aru, dika unu meworo rue ta. Jehova nānapu kwa mba uku nke nwere ume ala-ha n'iru unu: ma unu onwe-unu, ọ dighi nwoke ọ bula guzoworo n'iru unu rue ta. Otù nwoke nime unu nāchu nnù ndikom abua na ọgu iri: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ọ̀gù, dika Ọ gwara unu okwu. Lezi-kwa-nu onwe-unu anya nke-ọma, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya. Ma ọ buru na unu alaghachi ma-ọli, we rapara n'aru ndi fọduru nke mba ndia, bú ndia fọduru n'etiti unu, unu na ha ewe lurita nwunye, unu ewe bakuru ha, ha ewe bakuru kwa unu: maranu nke-ọma na Jehova, bú Chineke-unu, agaghi-anapu kwa mba ndia ala-ha ọzọ n'iru unu, kama ha gāburu unu ib͕udu na ọnyà, na utari n'akuku-aru-unu, na ogwu n'anya-unu, rue mb͕e unu gālapu n'iyì n'ezi ala nka, nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu. Ma, le, mu onwem nēje n'uzọ uwa nile ta: ma unu amawo n'obi-unu nile na nime nkpuru-obi-unu nile, na ọ dighi otù ihe dapuru n'ezi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, kwuru bayere unu; ha nile emeworo unu, ọ dighi otù ihe dapuru nime ya. Ọ gēru kwa, na dika ezi ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, gwara unu biakwasiworo unu, otú a ka Jehova gēme ka ihe ọjọ ahu nile biakwasi unu, rue mb͕e Ọ gēkpochapu unu n'ezi ala nka nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu. Mb͕e unu gāgabiga ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, nke O nyere unu n'iwu, mb͕e unu gēje kwa fè chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha; iwe Jehova gādi kwa ọku n'aru unu, unu gālapu kwa n'iyì ngwa ngwa n'ezi ala ahu nke O nyeworo unu.