JOSHUA 21:43-45
JOSHUA 21:43-45 Bible Nso (IGBOB)
Jehova we nye Israel ala ahu nile nke Ọ ṅuru iyi inye ndi bu nna-ha; ha we nweta ya, we biri nime ya. Jehova we me ka ha zuru ike buruburu, dika ihe nile si di nke Ọ ṅuru ndi bu nna-ha iyi: ọ dighi kwa nwoke ọ bula n'etiti ndi-iro-ha nile guzoro n'iru ha; ndi-iro-ha nile ka Jehova nyere n'aka-ha. Ọ dighi ihe ọ bula dapuru n'ezi ihe nile nke Jehova gwara ulo Israel; ha nile mere.
JOSHUA 21:43-45 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, ONYENWE ANYị nyere ụmụ Izrel ala ahụ ọ ṅụrụ iyi inye ndị nna nna ha. Ha nwetara ya, biri nʼime ya. ONYENWE ANYị nyere ha izuike nʼakụkụ niile, dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye ndị nna nna ha. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị iro ha ọbụla guzogidere ha, nʼihi na ONYENWE ANYị nyefere ndị iro ha niile nʼaka ha. O nweghị otu nʼime nkwa ọma niile ONYENWE ANYị kwere Izrel nke na-emezughị. O mezuru nkwa niile o kwere ha.