Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOSHUA 21:1-19

JOSHUA 21:1-19 Bible Nso (IGBOB)

Ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai we biarue nso Eleeza, bú onye-nchu-àjà, biaru kwa nso Joshua nwa Nun, biaru kwa nso ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel; ha we gwa ha okwu nime Shailo n'ala Kenean, si, Jehova nyere iwu n'aka Moses inye ayi obodo ufọdu ayi gēbi, ha na ebe-ita-nri-ha nke gādiri anu-ulo-ayi. Umu Israel we si n'ihe-nketa-ha nye ndi Livai, dika okwu-ọnu Jehova si di, obodo ndia na ebe-ita-nri-ha. Ife-nzà we putara ab͕uru nile nke ndi Kohat: umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ndi sitere na ndi Livai, we nwe obodo iri na atọ sitere n'ebo Juda, site kwa n'ebo ndi Simeon, site kwa n'ebo Benjamin, n'ife-nzà. Umu Kohat fọduru we nwe obodo iri sitere n'ab͕uru nile nke ebo Efraim, site kwa n'ebo Dan, site kwa na nkera ebo Manase, n'ife-nzà. Umu Giashon we nwe obodo iri na atọ sitere n'ab͕uru nile nke ebo Isaka, site kwa n'ebo Asha, site kwa n'ebo Naftali, site kwa na nkera ebo Manase nime Beshan, n'ife-nzà. Umu Merari dika ab͕uru nile ha si di we nwe obodo iri na abua sitere n'ebo Reuben, site kwa n'ebo Gad, site kwa n'ebo Zebulun. Umu Israel we nye ndi Livai obodo ndia na ebe-ita-nri-ha n'ife-nzà, dika Jehova nyere iwu n'aka Moses. Ha we si n'ebo umu Juda, si kwa n'ebo umu Simeon, nye obodo ndia nke akpọrọ ha n'aha n'ebe a: ha we diri umu Eron, ndi sitere n'ab͕uru ndi Kohat, ndi sitere n'umu Livai: n'ihi na ha ka ife-nzà mbu diri. Ha we nye ha Kiriat-aba, nna Anak ka Aba ahu bu, (nke ahu bu Hebron,) n'ugwu Juda, ya na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya. Ma ọhia nke obodo ahu, na obodo ntà ya nile, ka ha nyere Keleb nwa Jefune n'ihe-onwunwe-ya. Umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha nyere Hebron na ebe-ita-nri-ya, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Libna na ebe-ita-nri-ya nile; na Jatia na ebe-ita-nri-ya nile, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile, na Holon na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile; na Ain na ebe-ita-nri-ya nile, na Juta na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile; obodo iteghete site n'ebo abua ahu. Site kwa n'ebo Benjamin, Gibeon na ebe-ita-nri-ya nile, na Geba na ebe-ita-nri-ya nile; na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile, na Almon na ebe-ita-nri-ya nile: obodo anọ. Obodo nile nke umu Eron, bú ndi-nchu-àjà, di obodo iri na atọ na ebe-ita-nri-ha.

JOSHUA 21:1-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Emesịa, ndị ndu ezinaụlọ Livayị bịakwutere Elieza, onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndịisi ebo Izrel, na Shaịlo, nʼime ala Kenan, sị ha, “ONYENWE ANYị nyere iwu site nʼaka Mosis ka enye anyị obodo ụfọdụ ebe anyị ga-ebi, na ala ebe anụ ụlọ anyị ga na-ata ahịhịa.” Nʼihi nke a, dịka iwu ONYENWE ANYị si dị, ụmụ Izrel sitere nʼihe nketa ha nye ndị Livayị obodo ụfọdụ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Ndị buru ụzọ nweta oke site nʼife nza bụ ikwu Kohat dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼala ndị Juda, na Simiọn, na Benjamin nye ha obodo iri na atọ, ka ọ bụrụ ihe nketa ụmụ Kohat ndị si nʼebo Livayị, ndị bụkwa ụmụ ụmụ Erọn onye nchụaja. Ma ndị fọdụrụ nʼụmụ Kohat ka e nyere obodo iri site nʼobodo nke ikwu ndị ebo Ifrem, na Dan, na ọkara ebo Manase. Ụmụ Geshọn nwetara obodo iri na atọ site nʼife nza. Obodo ha nwetara dị na Bashan. Ha sikwa nʼala ndị ikwu ebo Isaka na Asha, na Naftalị, na ọkara ebo Manase nweta oke ahụ. Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị ketara obodo iri na abụọ site nʼala ndị ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn. Ya mere, ụmụ Izrel mezuru iwu niile ONYENWE ANYị nyere Mosis site nʼikenye ndị Livayị obodo ha ga-ebi, nakwa ebe anụ ụlọ ha ga-ata nri. Ha sitere nʼebo Juda na Simiọn, kepụta obodo ndị a akpọrọ aha kenye ndị ikwu Kohat, ndị bụ ụmụ ụmụ Erọn, bụrụkwa ụmụ ụmụ Livayị. Ọ bụ ha ka e bụ ụzọ kenye ihe nketa site nʼife nza. E kenyere ha obodo Kiriat Aaba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Obodo a dị nʼala ugwu ugwu Juda, ya na ala gbara ya gburugburu ka ọ bụrụ ebe ịta nri anụ ụlọ. (Aaba bụ nna nna ndị Anak.) Ma eburularị ụzọ nye Kaleb nwa Jefune obodo ukwu na obodo nta niile, na ala ubi niile dị nʼakụkụ ya ka ọ bụrụ ihe nketa ya. Ya mere, ụmụ ụmụ Erọn, onye nchụaja, ka e kenyere obodo Hebrọn, nke bụkwa obodo mgbaba, kenyekwa ha obodo ndị a: Libna, Jatịa, Eshtemoa, Họlọn, Debịa, Ain, Juta na Bet-Shemesh. E nyekwara ha ala niile gbara obodo ndị a gburugburu ka ọ bụrụ ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Ya mere, ọ bụ obodo itoolu ka e si nʼala ebo Juda na Simiọn kenye ha. Ebo Benjamin nyere ha obodo anọ ndị a, Gibiọn, Geba, Anatot, Almon na ala dị ya gburugburu ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri, bụ obodo anọ. Ya mere, obodo niile e nyere ndị nchụaja, ụmụ ụmụ Erọn dị iri na atọ, tinyere ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.