JOSHUA 2:14-24
JOSHUA 2:14-24 Bible Nso (IGBOB)
Ndikom ahu we si ya, Ndu-ayi lara ndu-unu ka ayi we nwua, ma ọ buru na unu egosighi okwu-ayi nka; ọ gēru kwa, mb͕e Jehova gēnye ayi ala nka, na ayi gēmere gi ebere na ezi-okwu. Ọ we were udọ̀ weda ha site na window: n'ihi na ulo-ya di na nb͕idi obodo, ọ bu kwa n'elu mb͕idi ka o biri. O we si ha, Jenu n'ugwu, ka ndi nāchu unu we ghara izute unu; zo-kwa-nu onwe-unu n'ebe ahu ubọchi atọ, rue mb͕e ndi nāchu unu gālaghachi: emesi kwa unu gēje ije-unu. Ndikom ahu we si ya, Ayi onwe-ayi gābu ndi ikpe nāmaghi n'iyi-gi a nke i meworo ka ayi ṅua. Le, mb͕e ayi onwe-ayi gaje ibata n'ala nka, i gēkegide eriri ogho uhie a nime window nke i ji weda ayi: nna-gi, na nne-gi, na umu-nne-gi, na ulo nna-gi nile, ka i gāchikọta-kwa-ra onwe-gi n'ulo a. Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke gēsi n'ọnu-uzọ ulo-gi pua n'èzi, ọbara-ya gādikwasi n'isi-ya, ayi onwe-ayi gābu kwa ndi ikpe nāmagh: ma onye ọ bula gi na ya gānọ n'ulo, ọbara-ya gādikwasi n'isi-ayi, ma ọ buru na aka ọ bula adikwasi ya. Ma ọ buru na i gosi okwu-ayi nka, ayi gābu kwa ndi ikpe nāmaghi n'iyi-gi nke i meworo ka ayi ṅua. O we si, Dika okwu nile unu si di, otú a ka ọ gādi. O we zilaga ha, ha we je: o we kegide eriri uhie ahu nime window. Ha we je, biarue ugwu ahu, nọdu n'ebe ahu ubọchi atọ, rue mb͕e ndi nāchu ha laghachiri: ndi nāchu ha we chọ ha n'uzọ ahu nile, ma ha achọtaghi ha. Ndikom abua ahu we laghachi, si n'ugwu ahu rida, we gabiga, biakute Joshua nwa Nun; ha we kọrọ ya ihe nile nke dakwasiri ha. Ha we si Joshua, N'ezie Jehova enyewo ala ahu nile n'aka-ayi; ọzọ kwa, ndi nile ndi bi n'ala ahu nāb͕azepu n'iru ayi.
JOSHUA 2:14-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị ikom ahụ kwere ya nkwa sị, “Ndụ anyị lara ndụ unu. Ọ bụrụ na ị gbaghị anyị ama, anyị ga-egosi gị obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi mgbe ONYENWE ANYị ga-enye anyị ala a.” Ụlọ Rehab dị nʼakụkụ mgbidi obodo ahụ. O ji ụdọ site na oghereikuku wedata ndị ikom abụọ ahụ. Ọ gwakwara ha sị, “Gbalaganụ nʼugwu, zoonụ onwe unu nʼebe ahụ ụbọchị atọ, tutu ndị ahụ na-achọ unu alaghachi azụ. Mgbe ahụ, unu nwere ike ịpụta laghachi ebe unu si bịa.” Ndị ahụ gwara ya sị, “Iyi a i mere ka anyị ṅụọ agaghị adị ire megide anyị, ma ọ bụrụ na nʼụbọchị ahụ anyị ga-abata ala a, i wereghị ụdọ ahụ na-acha uhie uhie kenye ya na oghereikuku i si wedata anyị, ma ọ bụrụkwa na ịkpọbataghị nʼụlọ gị nna gị, na nne gị, na ụmụnne gị ndị ikom, na ndị ezinaụlọ gị niile. Ọ bụrụ na onye ọbụla esite nʼụlọ gị pụọ nʼezi, ọbara ya agaghị adị anyị nʼisi, anyị agaghị abụkwa ndị ikpe mara. Ma ikpe ọmụma dịrị anyị ma ọ bụrụ nʼihe ọbụla emee onye ọbụla gị na ya so nọdụ nʼime ụlọ. Ma ọ bụrụ na ị gbaa anyị ama, ọ dịkwaghị iwu ji anyị imezu iyi a i mere ka anyị ṅụọrọ gị.” Rehab zara sị ha, “Dịka okwu niile unu kwuru si dị, otu a ka ọ ga-adị.” O zilagara ha. Ha pụkwara gaara onwe ha. Ma Rehab kekwasịrị ụdọ uhie uhie ahụ nʼọnụ oghereikuku ụlọ ya. Ndị ikom abụọ ahụ gara zoo onwe ha nʼugwu ahụ. Ha nọrọ ụbọchị atọ nʼebe ahụ dịka Rehab gwara ha, tutu ndị ahụ na-achụ ha laghachiri nʼobodo Jeriko. Ndị a chọọrọ ha gaa ebe niile, nʼokporoụzọ niile, ma ha ahụghị ha. Emesịa, mmadụ abụọ ahụ e zipụrụ iledo ala ahụ anya sitere nʼebe ha zoro onwe ha rịpụta, gafee osimiri Jọdan, laghachi nʼebe ụmụ Izrel nọ. Ha bịara kọọrọ Joshua nwa Nun otu ha si gaa ije ha. Ha gwara Joshua sị, “Nʼezie, ONYENWE ANYị enyela anyị ala ahụ niile, nʼihi na ndị niile bi nʼala ahụ na-atụ anyị ụjọ.”