JOSHUA 19:1-48
JOSHUA 19:1-48 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị nke abụọ sitere nʼife nza nweta oke ha bụ ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha ketara dị nʼime ala e kenyere ndị Juda. Ihe nketa ụmụ Simiọn bụ ndị a: Bịasheba (maọbụ Sheba), Molada, Haza Shual, Bala, Ezem, Eltolad, Betul, Homa, Ziklag, Bet-Makabot, Haza Susa, Bet-Lebaot na Sharuhen, obodo iri na atọ na obodo nta ndị ọzọ gbara ha gburugburu. Na Ain, Rimọn, Eta na Ashan, obodo anọ na obodo nta ha, tinyekwara obodo nta ndị ọzọ niile gbara obodo ukwu ndị a gburugburu, ruo obodo Baalat-Bịa, ya bụ (obodo Rema dị na Negev). Nke a bụ ihe nketa ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼoke ụmụ Juda wepụta oke ụmụ Simiọn, nʼihi na ihe ụmụ Juda ketara dị ukwuu karịa ihe ha kwesiri iketa. Ọ bụ nke a mere ụmụ Simiọn ji nweta ihe nketa site nʼetiti ala ndị Juda. Ebo nke atọ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza bụ ebo Zebụlọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha nwetara gbatịrị ruo Sarid. Site nʼebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị gaa nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ruo Marala na Dabeshet, rukwaa iyi dị nʼihu Jokneam. O si na Sarid chigharịa ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ahụ ruru nʼoke ala Kislọt Teboa, gbagorokwa ruo Daberat, ruokwa Jafia. Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Gat Hefa, Et Kazin na Rimọn, tụgharịa nʼụzọ e si aga Nea. Nʼebe ahụ, ọ gara gburugburu nʼakụkụ ugwu ruo Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ifta El ebe ọ sọtụrụ. Obodo ndị a niile dịkwa nʼime ihe nketa ụmụ Zebụlọn: Katat, Nahalal, Shịmrọn, Idala na Betlehem. Obodo niile ndị a dị iri na abụọ, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu. Obodo ndị a niile na obodo nta ha, so nʼala ụmụ Zebụlọn nwetara dịka ihe nketa ha, dịka ikwu ha si dị. Ebo nke anọ sitere nʼife nza nweta ihe nketa ha bụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị. Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Jezril, Kesulọt, Shunem, Hafaraim, na Shịọn, Anaharat, Rabit, Kishiọn, Ebez na Remet, En-Ganim, En-Hada na Bet-Pazez. Oke ala ha ruru na Taboa, Shahazuma na Bet-Shemesh, ma kwụsị nʼosimiri Jọdan. Obodo ndị a niile dị iri na isii, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu. Ya mere, obodo ukwu ndị a na obodo nta ha dị nʼala ahụ ebo Isaka nwetara dịka ihe nketa ha, dị ka ikwu ha si dị. Ebo nke ise e kenyere ala site nʼife nza bụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị. Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Helkat, Hali, Beten, Akshaf, Alamelek, Amad na Mishal. Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ gbatịrị ruo Kamel na Shihoa-Libnat. O sitere nʼebe ahụ tụgharịa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ gawa Bet-Dagọn, ma ruokwa Zebụlọn na Ndagwurugwu Ifta El, ma gbagoro ruokwa Bet-Emek na Neiel. O sikwa nʼebe ahụ gafee, ruo Kabul, nʼakụkụ aka ekpe. Ọ gara ruo Ebrọn, Rehob, Hamọn na Kana, ruokwa ebe obodo Saịdọn gbasapụrụ. Oke ala ahụ mere dịka ọ na-alaghachi azụ bịaruo Rema, ruokwa obodo e wusiri ike bụ Taịa, tụgharịakwa gawa Hosa pụta nʼọnụ mmiri osimiri Mediterenịa nke dị nʼakụkụ Akzib na Umma, Afek na Rehob. Ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri abụọ na abụọ tinyere obodo nta ha niile. Obodo ndị a na obodo nta ha niile dị nʼala ahụ ebo Asha nwetara dịka ihe nketa, dịka ikwu ha si dị. Ebo nke isii e nyere ihe nketa site nʼife nza bụ ebo Naftalị, dịka ikwu ha si dị. Oke ala ha malitere na Helef ruo nʼosisi ukwu dị na Zaananim, Adami Nekeb na Jabneel, gafee ruo Lakum, kwụsị nʼosimiri Jọdan. Site nʼebe ahụ oke ala ha gara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo Aznot Tabo, site nʼebe ahụ ruo Hukọk, rute Zebụlọn na ndịda, na Asha nʼọdịda anyanwụ, ruokwa Juda nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan. Obodo niile e wusiri ike e kenyere ha bụ ndị a: Zidim, Zea, Hamat, Rakat, Kineret, Adama, Rema, Hazọ, Kedesh, Edrei, En-Hazoa, Iron, Migdal El, Horem, Bet-Anat na Bet-Shemesh. Ya mere, ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri na itoolu, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu. Obodo ndị a na obodo nta ha niile ka ebo Naftalị dịka ikwu ha si dị, nwetara dịka ihe nketa ha. Site nʼife nza ebo Dan, bụ ebo nke asaa nwetara ihe nketa dịka ikwu ha si dị. Oke ala ihe nketa ha bụ ndị a: Zora, Eshtaol, Ia-Shemesh, Shaalabin, Aijalon, Itla, Elọn, Timna, Ekrọn, Elteke, Gibeton, Baalat, Jehud, Bene-Berak, Gat Rimọn, Me-Jakọn na Rakọn, obodo dị nʼoke ala, na ncherita ihu Jopa. Mgbe oke ala ụmụ Dan ketara sitere nʼaka ha pụọ. Ha gara buso obodo Leshem agha merie ha, were mma agha tigbuo ndị niile bi nʼime ya, bichie ya. Ha kpọrọ obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna nna ha ochie. Obodo ndị a na obodo nta ha bụ ihe nketa ebo Dan nwetara dịka ikwu ha si dị.
JOSHUA 19:1-48 Bible Nso (IGBOB)
Ife-nzà nke-abua we putara Simeon, bú ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di: ihe-nketa-ha di n'etiti ihe-nketa umu Juda. Ha we nwe n'ihe-nketa-ha Bia-sheba, ma-ọbu Sheba, na Molada; na Haza-shual, na Bala, na Ezem; na Eltolad, na Betul, na Họma; na Ziklag, na Bet-makabot, na Haza-susa; na Bet-lebaot, na Sharuhen; obodo iri na atọ na obodo ntà ha: na Ain, na Rimon, na Eta, na Ashan; obodo anọ na obodo ntà ha: na obodo ntà nile nke di obodo ndia buruburu rue Bealat-bia, bú Rema nke Negeb. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di. Site n'òkè umu Juda ka ihe-nketa umu Simeon di: n'ihi na òkè umu Juda riri nne kari ha: umu Simeon we keta ihe n'etiti ihe-nketa-ha. Ife-nzà nke-atọ we putara umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di: ókè-ala ihe-nketa-ha we di rue Sarid: ókè-ala-ha we rigo n'akuku Ọdida-anyanwu, ru kwa Marala, we metu Dabeshet, metu kwa miri-iyi nke di n'iru Jọkneam; o si na Sarid chigharia n'akuku Iru-anyanwu n'ọwuwa-anyanwu rue ókè-ala Kislot-teboa; ọ pua rue Daberat, we rigo rue Jafia; o si n'ebe ahu gabiga n'akuku Iru-anyanwu n'akuku ọwuwa-anyanwu rue Gat-hefa, rue Et-kazin; ọ pua na Rimon, nke akpara rue Nea; ókè-ala ahu we b͕a ya buruburu n'Ugwu rue Hanaton: ọpupu-ya di kwa na ndagwurugwu Ifta-el; na Katat, na Nahalal, na Shimron, na Idala, na Bet-lehem: obodo iri na abua na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha. Ife-nzà nke-anọ we putara Isaka, bú umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di. Ókè-ala-ha we rue Jezreel, na Kesulot, na Shunem; na Hafaraim, na Shion, na Anaharat; na Rabit, na Kishion, na Ebez; na Remet, na En-ganim, na En-hada, na Bet-pazez: ókè-ala ahu we metu Teboa, na Shahazuma, na Bet-shemesh; ọpupu ókè-ala-ha di kwa na Jọdan: obodo iri na isi na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa ebo umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di, obodo ahu na obodo ntà ha. Ife-nzà nke-ise we putara ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di. Ókè-ala-ha we buru Helkat, na Hali, na Beten, na Akshaf; na Alamelek, na Amad, na Mishal; ọ metu Kamel n'akuku Ọdida-anyanwu, metu kwa Shaihoa-libnat; ọ we chigharia n'ọwuwa-anyanwu rue Bet-degon, we metu Zebulun, metu kwa ndagwurugwu Ifta-el n'akuku Ugwu rue Bet-emek na Neiel; ọ pua rue Kabul n'aka-ekpe, na Ebron, na Rehob, na Hamon, na Kena, we rue Zaidon bara uba; ókè-ala ahu we chigharia rue Rema, ru kwa obodo ahu ewusiri ike, bú Taia; ókè-ala ahu we chigharia rue Hosa; ọpupu-ya di kwa n'oké osimiri site na Hebel rue Akzib: na Uma, na Efek, na Rehob: orú obodo na abua na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha. Ọ bu umu Naftali ka ife-nzà nke-isi putara, bú umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di. Ókè-ala-ha we site na Helef, site n'osisi terebinth nime Zaananim, na Adami-nekeb, na Jabneel, rue Lakum; ọpupu-ya we di na Jọdan: ókè-ala ahu we chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu rue Aznot-teboa, si n'ebe ahu pua rue Hukok; ọ metu Zebulun na Ndida, metu kwa Asha n'Ọdida-anyanwu, metu kwa Juda n'akuku Jọdan n'ọwuwa-anyanwu. Obodo ewusiri ike bu Zidim, na Zea, na Hamat, na Rakat, na Kineret; na Adama, na Rema, na Hezoa; na Kedesh, na Edrei, na En-hezoa; na Iron, na Migdal-el, na Horem, na Bet-anat, na Bet-shemesh; obodo iri na iteghete na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà ha. Ọ bu ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di ka ife-nzà nke-asa putara. Ókè-ala ihe-nketa-ha we buru Zọra, na Eshtaol, na Ia-shemesh; na Shaalabin na Ajalon, na Itla; na Ilon, na Timna, na Ekron; na Elteke, na Gibeton, na Bealat; na Jihud, na Bene-berak, na Gat-rimon; na Me-jakon, na Rakon, tiyere ókè-ala di na ncherita-iru Jafo. Ókè-ala umu Dan we si n'ebe ha nọ pua: umu Dan we rigo, buso Leshem agha, were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, ha we nweta ya, biri nime ya, we kpọ Leshem, Dan, dika aha Dan, bú nna-ha, si di. Nka bu ihe-nketa ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.