JOSHUA 14:1-5
JOSHUA 14:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Ma ndi bu ihe nke umu Israel ketara n'ala Kenean, ndi Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel, mere ka ha keta; n'ifè-nzà ka ihe-nketa-ha di, dika Jehova nyere iwu n'aka Moses, bayere ebo iteghete ahu, baye-kwa-ra nkera ebo ahu. N'ihi na Moses nyere ihe-nketa nke ebo abua na nkera ebo ahu n'ofè Jọdan: ma o nyeghi ndi Livai ihe-nketa n'etiti ha. N'ihi na umu Josef bu ebo abua, bú Manase na Efraim: ha enyeghi kwa ndi Livai òkè n'ala ahu, ma-ọbughi obodo ufọdu ibi obi, ha na ebe-ita-nri-ha nke diri anu-ulo-ha na àkù ha kpatara. Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu Israel mere, ha we kè ala ahu.
JOSHUA 14:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu a ka esi kenye ndị Izrel ala Kenan, bụ nke Elieza onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndị ndu ikwu niile dị nʼebo Izrel kere. Ebo ọbụla nʼime ebo itoolu na ọkara ahụ fọdụrụ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza, dịka ONYENWE ANYị nyere ya Mosis nʼiwu. Ma Mosis enyelarị ebo abụọ na ọkara ala nke ha nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. Ma o kenyeghị ndị Livayị ihe nketa ọbụla nʼetiti ha. Nʼihi na ụmụ Josef dị ebo abụọ, ya bụ Manase na Ifrem. Enyeghị ndị Livayị oke nʼala ahụ, karịa obodo ụfọdụ ebe ha ga-ebi na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. Ndị Izrel keere ala ahụ nʼusoro dịka iwu ONYENWE ANYị nyere Mosis si dị.