JOSHUA 10:12-15
JOSHUA 10:12-15 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ahu Joshua gwara Jehova okwu n'ubọchi Jehova rara ndi-Amorait nye n'iru umu Israel; o we si n'anya Israel, Anyanwu, guzo du n'elu Gibeon; Gi Ọnwa kwa, na ndagwurugwu Ajalon. Anyanwu we guzo du, ọnwa guzo-kwa-ra, Rue mb͕e mba ahu bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-ha. Èdeghi nka n'akwukwọ Jasha? Anyanwu we guzo n'etiti elu-igwe, o meghi kwa ngwa ida ihe ra ka otù ubọchi zuru ezu. Ọ dighi kwa ubọchi di ka ubọchi ahu n'iru ya ma-ọbu n'azu ya, na Jehova gere nti olu madu: n'ihi na Jehova nēburu Israel agha. Joshua we lata, ya na Israel nile, rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal.
JOSHUA 10:12-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼụbọchị ahụ, ONYENWE ANYị mere ka ndị Izrel lụgbuo ndị Amọrait. Joshua gwara ONYENWE ANYị okwu nʼihu ndị Izrel niile sị, “Gị, anyanwụ, guzo nʼotu ebe na mbara eluigwe Gibiọn. Gị, ọnwa, guzokwa nʼotu ebe na mbara eluigwe na Ndagwurugwu Aijalon” Anyanwụ guzoro, ọnwa guzokwa. Ha abụọ adaghị tutu ruo mgbe ndị agha mba ahụ gbuchasịrị ndị iro ha. Ihe banyere akụkọ agha a ka e dere nʼakwụkwọ Jasha. Ya mere, anyanwụ guzoro nʼotu ebe nʼetiti mbara eluigwe. Ọ nọkwa nʼotu ebe ihe dịka otu ụbọchị zuru ezu. O nweghị ụbọchị ọzọ dịka ụbọchị ahụ nʼoge niile gara aga. Ọ dịbekwaghị ụbọchị yiri ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ bụ ụbọchị ONYENWE ANYị mere ka anyanwụ na ọnwa kwụsị, nʼihi naanị ekpere otu nwoke. Nʼihi na ONYENWE ANYị na-eburu Izrel agha. Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu dị na Gilgal.