JOSHUA 10:1-14
JOSHUA 10:1-14 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, nuru na Joshua ewerewo Ai, wezuga kwa ya ka ebibie ya; dika ọ mereri Jeriko na eze-ya, otú a ka o mere Ai na eze-ya; mb͕e ọ nu-kwa-ra na ndi bi na Gibeon emewo ka ha na Israel di n'udo, ha we nọ n'etiti ha; o rue, mb͕e ha nuru ya, na ha turu egwu nke-uku, n'ihi na Gibeon bu obodo uku, dika otù nime obodo ala-eze ahu, na n'ihi na ọ di uku kari Ai, ndikom-ya nile bu kwa ndi-dike. Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, we zigara Hoham, bú eze Hebron, ziga-kwa-ra Piram, bú eze Jamut, ziga-kwa-ra Jafia, bú eze Lekish, ziga-kwa-ra Debia, bú eze Eglon, ozi, si, Rigokutenum, yerem aka, ka ayi tib͕u kwa Gibeon: n'ihi na ọ mere ka ya onwe-ya na Joshua na umu Israel di n'udo. Eze ise ndi-Amorait, bú eze Jerusalem, na eze Hebron, na eze Jamut, na eze Lekish, na eze Eglon, we chikọta onwe-ha, rigo, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile, we ma ulo-ikwū-ha imegide Gibeon, we buso ya agha. Ndikom Gibeon we zigara Joshua ozi rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal, si, Arala ndi-orù-gi aka; rigokute ayi ngwa ngwa, zọputa ayi, ye-kwa-ra ayi aka: n'ihi na eze nile nke ndi-Amorait ndi bi n'ugwu achikọtawo onwe-ha imegide ayi. Joshua we si na Gilgal rigo, ya onwe-ya, na ndi-agha nile tiyere ya, na ndi-dike nile, bú ndi-dìnkpà. Jehova we si Joshua, Atula egwu ha: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ha; ọ dighi nwoke nime ha nke gēguzo n'iru gi. Joshua we biakwasi ha na mberede; n'ihi na ogologo abali nile ka o si na Gilagal rigo. Jehova we chusa ha n'iru Israel, o tib͕ue ha oké ntib͕u na Gibeon, we chusa ha n'uzọ nrigo Bet-horon, tib͕ue ha rue Azeka, ru kwa Makeda. O rue, mb͕e ha si n'iru Israel b͕alaga, mb͕e ha nọ na nrida Bet-horon, na Jehova si n'elu-igwe tudakwasi ha nkume uku rue Azeka, ha we nwua: ndi nwuru na nkume ákú-miri-ígwé ahu kariri ndi umu Israel were mma-agha b͕ue. Mb͕e ahu Joshua gwara Jehova okwu n'ubọchi Jehova rara ndi-Amorait nye n'iru umu Israel; o we si n'anya Israel, Anyanwu, guzo du n'elu Gibeon; Gi Ọnwa kwa, na ndagwurugwu Ajalon. Anyanwu we guzo du, ọnwa guzo-kwa-ra, Rue mb͕e mba ahu bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro-ha. Èdeghi nka n'akwukwọ Jasha? Anyanwu we guzo n'etiti elu-igwe, o meghi kwa ngwa ida ihe ra ka otù ubọchi zuru ezu. Ọ dighi kwa ubọchi di ka ubọchi ahu n'iru ya ma-ọbu n'azu ya, na Jehova gere nti olu madu: n'ihi na Jehova nēburu Israel agha.
JOSHUA 10:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Adoni-Zedek, eze Jerusalem nụrụ na Joshua emeriela Ai, laa ya nʼiyi, gbukwaa eze ya, dịka ọ lara Jeriko na eze ya nʼiyi, mgbe ọ hụkwara na ndị Gibiọn na ndị Izrel emeela udo, na ha bikwa nso ndị Izrel, ọ tụrụ egwu nke ukwuu, ya na ndị ya. Nʼihi na Gibiọn bụ obodo a ma ama, dịka otu nʼime obodo ndị eze, ndị ikom ya bụkwa ndị dị ike, nʼihi na ọ dịkwa ukwuu karịa Ai. Ndị ikom ya niile maara otu e si ebu agha. Ya mere, Adoni-Zedek, eze Jerusalem ziri ozi zigara eze ndị a: Homa, eze Hebrọn, Piram, eze Jamut, Jafia, eze Lakish, na Debịa, eze Eglọn, na-asị, “Bịanụ nyere m aka, ka anyị gaa tigbuo Gibiọn, nʼihi na ha na Joshua na ụmụ Izrel emeela udo.” Mgbe ahụ, eze ise ndị Amọrait ndị a, eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish na eze Eglọn chịkọtara ndị agha. Ha na ndị agha ha gara were ọnọdụ ha imegide Gibiọn, ha lụsokwara ha ọgụ. Ma ndị Gibiọn mere ngwangwa zigara Joshua ozi nʼụlọ ikwu dị na Gilgal sị ya, “Bịa nyere ndị ohu gị aka. Bịa ngwangwa zọpụta anyị, nʼihi na eze niile nke ndị Amọrait, ndị bi nʼugwu, abịala nʼebe a, ha na ndị agha ha ibuso anyị agha.” Joshua na ndị agha ya niile, tinyere ndị ahụ niile ibu agha were anya, hapụrụ Gilgal gawa ịzọpụta Gibiọn. Ma ONYENWE ANYị gwara Joshua okwu sị ya, “Atụla ha egwu! Nʼihi na ha bụ ndị e meriri emeri. Enyela m ha nʼaka unu ịla ha nʼiyi. Ọ dịkwaghị otu onye nʼetiti ha nwere ike iguzo nʼihu unu.” Joshua bịakwutere ha na mberede, nʼihi na ogologo abalị niile ka o si Gilgal gaa njem. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị tinyere ha nʼọnọdụ ọgbaaghara mgbe ha zutere ndị Izrel. Nke a mere ka ndị agha Izrel lụgbuo ha na Gibiọn. Nʼezie, ọnụọgụgụ ndị ha tigburu na Gibiọn dị nnọọ ukwuu. Ma ha chụkwara ndị fọdụrụ ọsọ chụruo ha Bet-Horon, na Azeka, na Makeda, na-egbu ha nʼụzọ. Mgbe ha si nʼihu Izrel gbapụ ọsọ nʼụzọ nrịda Bet-Horon na-aga Azeka, ONYENWE ANYị sitere nʼelu na-atụdakwasị ha ọtụtụ mkpụrụ mmiri. Ọnụọgụgụ ndị mkpụrụ mmiri ndị a dagburu dị ukwuu karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha ha gbuo. Nʼụbọchị ahụ, ONYENWE ANYị mere ka ndị Izrel lụgbuo ndị Amọrait. Joshua gwara ONYENWE ANYị okwu nʼihu ndị Izrel niile sị, “Gị, anyanwụ, guzo nʼotu ebe na mbara eluigwe Gibiọn. Gị, ọnwa, guzokwa nʼotu ebe na mbara eluigwe na Ndagwurugwu Aijalon” Anyanwụ guzoro, ọnwa guzokwa. Ha abụọ adaghị tutu ruo mgbe ndị agha mba ahụ gbuchasịrị ndị iro ha. Ihe banyere akụkọ agha a ka e dere nʼakwụkwọ Jasha. Ya mere, anyanwụ guzoro nʼotu ebe nʼetiti mbara eluigwe. Ọ nọkwa nʼotu ebe ihe dịka otu ụbọchị zuru ezu. O nweghị ụbọchị ọzọ dịka ụbọchị ahụ nʼoge niile gara aga. Ọ dịbekwaghị ụbọchị yiri ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ bụ ụbọchị ONYENWE ANYị mere ka anyanwụ na ọnwa kwụsị, nʼihi naanị ekpere otu nwoke. Nʼihi na ONYENWE ANYị na-eburu Izrel agha.