JOSHUA 1:9-11
JOSHUA 1:9-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ ONYENWE ANYị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.” Mgbe ahụ, Joshua nyere ndịisi Izrel niile iwu sị ha, “Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ ONYENWE ANYị bụ Chineke na-enye unu.’ ”
JOSHUA 1:9-11 Bible Nso (IGBOB)
Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje. Joshua we nye ndi-ọchi-agha ndi Israel iwu, si, Gabiganu n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, nye ndi Israel iwu, si, Doziere onwe-unu ihe unu gēri n'uzọ; n'ihi na ọ fọduru ubọchi atọ unu ewe gabiga Jọdan nka, ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu inweta ya.