JOSHUA 1:3-5
JOSHUA 1:3-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ana m agwa gị ihe m gwara Mosis mgbe ọ dị ndụ sị, Ebe ọbụla unu ga-azọkwasị ụkwụ unu nʼala, ala ahụ ga-abụ nke unu. Oke ala unu ga-abụ site nʼọzara dị na ndịda ruo Lebanọn, ma site nʼiyi ukwu Yufretis, tinyere ala niile nke ndị Het, ruo nʼosimiri ukwu ahụ dị nʼọdịda anyanwụ. Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ iguzo imegide gị ụbọchị niile nke ndụ gị. Aga m anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis. Agaghị m ahapụ gị aka. Agaghị m agbakụtakwa gị azụ.
JOSHUA 1:3-5 Bible Nso (IGBOB)
Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi, unu ka M'nyeworo ya, dika M'gwara Moses okwu. Site n'ọzara, na Lebanon nka, we rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis, ala nile nke ndi Het, we rue oké osimiri chere iru n'ọdida-anyanwu, ka ókè-ala unu gādi. Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru gi ubọchi nile nke ndu-gi: dika M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi: M'gaghi-ara gi aka, M'gaghi-arapu kwa gi.