JONA 3:1-10
JONA 3:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYị ruru Jona ntị nke ugboro abụọ na-asị, “Bilie, jee nʼobodo ukwu ahụ bụ Ninive, kwusaara ya ozi ahụ m ziri gị.” Jona biliri gaa Ninive dịka okwu nke Onyenwe anyị si dị. Ninive bụ nnọọ obodo dị ukwuu, nke ga-ewe ụbọchị atọ ịga ya gburugburu. Jona malitere ịba nʼobodo ahụ, ma mgbe ọ gara ije otu ụbọchị, o kwusara sị, “Iri ụbọchị anọ ka ọ fọdụrụ tupu alaa Ninive nʼiyi.” Ndị Ninive kwenyeere na Chineke, kpọsaa obubu ọnụ, ha niile site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta, onye ọbụla yikwasịrị uwe mkpe. Mgbe akụkọ a rutere eze Ninive ntị, o sitere nʼocheeze ya rituo, wezuga uwe eze ya, yikwasị uwe mkpe, nọkwasịkwa na ntụ. Nke a bụ nkwusa ya nʼime Ninive: Nke a bụ iwu sitere nʼaka eze na ndị a maara aha ha: “Ka mmadụ ọbụla, maọbụ anụmanụ, igwe ehi maọbụ anụ ụlọ ọbụla, ghara idetu ihe ọbụla nʼọnụ, ka ha ghara iri ihe maọbụ ṅụọ mmiri. Kama ka onye ọbụla yiri akwa mkpe, ma mmadụ ma anụmanụ, ka ha kpọkusikwaa Chineke ike, ka ha sikwa nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa, sikwa nʼọrụ ọjọọ ha na ime ihe ike ha niile chegharịa. Onye maara? Ma eleghị anya, Chineke ga-ejide oke iwe ya, ma site nʼọmịiko ya wezuga iwe ọkụ ya si otu a mee ka anyị ghara ịla nʼiyi.” Mgbe Chineke hụrụ ihe niile ha mere, na otu ha siri site nʼụzọ ọjọọ ha niile chegharịa, Chineke chegharịrị uche banyere ịla ha nʼiyi. O mekwaghị ka nzube ya ibibi obodo ahụ mezuo.
JONA 3:1-10 Bible Nso (IGBOB)
Okwu Jehova we rue Jona nti nke ub͕ò abua, si, Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku ahu, kpọsara ya nkpọsa ahu nke Mu onwem nāgwa gi. Jona we bilie, jerue Nineve, dika okwu Jehova si di. Ma Nineve bu obodo di uku ri nne, ije nke ubọchi atọ. Jona we malite ibà n'obodo ije nke otù ubọchi, o we kpọsa, si, Ọ fọduru ọgu ubọchi abua, ewe kwatue Nineve. Ndi Nineve we kwere na Chineke; ha we kpọsa obubu-ọnu, yiri ákwà-nkpe, site n'onye uku ha we rue onye ntà ha. Okwu ahu we rute eze Nineve aru, ọ we si n'oche-eze-ya bilie, yipu uwe-nwuda-ya n'aru ya, kpuchie onwe-ya n'ákwà-nkpe, nọkwasi na ntu. O we tie nkpu, kwusa nime Nineve site n'iwu eze na ndi uku ya, si, Ka madu na anumanu, ma ìgwè ehi ma ìgwè ewu na aturu, ghara idetu ihe ọ bula n'ọnu: ka ha ghara izù onwe-ha, ghara kwa iṅu miri: ma ka ha kpuchie onwe-ha n'ákwà-nkpe, ma madu ma anumanu, ka ha kpọkusi kwa Chineke ike: ka ha chighari kwa, onye ọ bula ya pua n'uzọ ọjọ ya, na n'ihe-ike nke di n'ọbu-aka-ha. Ònye mara? eleghi anya Chineke gēchighari, chègharia uche, si n'iwe-Ya di ọku chigharia, ka ayi we ghara ila n'iyì. Chineke we hu ọlu nile ha, na ha siri n'uzọ ọjọ ha chigharia; Chineke we chègharia uche bayere ihe ọjọ ahu, nke O kwuru, si na Ọ gēme ha; O meghi kwa ya.