JONA 2:1-10
JONA 2:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere ONYENWE ANYị Chineke ekpere. Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo ONYENWE ANYị, ọ zakwara m. Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị, ị nụkwara olu akwa m. Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi, nʼetiti oke osimiri. Osimiri dịkwa m gburugburu, ebili mmiri gị na mmali mmiri gị gabigakwara m nʼisi. Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị chụpụ m; ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’ Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m, ogbu mmiri na-erikpu m. Achara mmiri kekụkwara m nʼisi. Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri, ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi. Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ, ONYENWE ANYị, bụ Chineke m. “Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike, e chetara m gị ONYENWE ANYị, ma ekpere m bịakwutere gị, nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ. “Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara, na-agbakụta ebere Chineke azụ. Ma ọ bụ olu abụ ekele ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja. Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere. Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke ONYENWE ANYị.’ ” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.
JONA 2:1-10 Bible Nso (IGBOB)
Jona we si n'afọ azù ahu kpere Jehova, bú Chineke-ya, ekpere. O we si, Esirim n'ahuhum kpọkue Jehova, O we zam; N'afọ ala-mọ ka m'siri tikue Ya, I nuru olum. N'ihi na I tubàram nime miri di omimi, n'etiti oké osimiri nile, Osimiri dikwam buruburu; Ebili-miri-Gi nile na nmali-miri-Gi nile gabigara n'isim. Mu onwem we si, Achupuwom n'iru anya-Gi abua; Otú ọ di, m'gēlegide kwa anya ọzọ n'ebe ulo uku Gi di nsọ di. Miri b͕aram buruburu, rue nkpuru-obi; Ob͕u-miri dim buruburu; Achara-miri kukurum n'isi. Rue ala ugwu nile ka m'ridara; Ala, ihe-ntuchi-ya nile kpachitaram rue mb͕e ebighi-ebi: Ma I mewo ka ndum si n'olùlù rigoputa, Jehova, bú Chinekem. Mb͕e nkpuru-obim nēnweghi ike nimem, Jehova ka m'chetara: Ekperem we bakute Gi, ba n'ulo uku Gi di nsọ. Ndi nāriba ihe-efu di iche iche nke nābughi ihe ama, Ebere-ha ka ha nārapu. Ma mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà; Ihe nke m'kweworo na nkwa ka m'gākwughachi. Nzọputa diri Jehova. Jehova we gwa azù ahu okwu, o we b͕ọputa Jona n'ala-akọrọ.