JOEL 2:28-32
JOEL 2:28-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ. Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị. Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe, na nʼelu ụwa; a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ. Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị ONYENWE ANYị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu. Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha ONYENWE ANYị ka a ga-azọpụta. Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalem ka mgbapụta ga-adị, dịka ONYENWE ANYị kwuru ya. Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ, bụ ndị ahụ ONYENWE ANYị na-akpọ.
JOEL 2:28-32 Bible Nso (IGBOB)
O gēru kwa ma emesia, na M'gāwusa Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, ndi-okenye-unu gārọ nrọ, umu-okorọbia-unu gāhu ọhù: e, ọbuná n'aru ndi-orù ndikom na n'aru ndinyom nēje ozi ka M'gāwusa Mọm na mb͕e ahu. M'gēnye kwa ihe-ebube di iche iche n'elu-igwe na n'uwa: ọbara, na ọku, na ogidi nke anwuru-ọku. Anyanwu gāb͕anwe ghọ ọchichiri, ọnwa gāb͕anwe kwa ghọ ọbara, tutu ubọchi Jehova abia, bú ubọchi ahu di uku di kwa egwu. Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke gākpọku aha Jehova, agēme ka o wepuga onwe-ya: n'ihi na n'ugwu Zaion na nime Jerusalem ka ufọdu ndi b͕apuru ab͕apu gādi, dika Jehova siworo, na n'etiti ndi fọduru afọdu ka ndi Jehova nākpọ gādi.