JOEL 2:27-29
JOEL 2:27-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ unu ga-amata na m nọ nʼebe a nʼetiti ndị m Izrel. Unu ga-amatakwa na naanị m bụ ONYENWE ANYị bụ Chineke unu, na ọ dịkwaghị onye ọzọ. Ihere agaghị emekwa ndị m ọzọ. ONYENWE ANYị “Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ. Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị.
JOEL 2:27-29 Bible Nso (IGBOB)
Unu gāma kwa na n'etiti Israel ka M'nọ, na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, na ọ dighi onye ọzọ: ihere agaghi-eme kwa ndim rue mb͕e abighi-ebi. O gēru kwa ma emesia, na M'gāwusa Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, ndi-okenye-unu gārọ nrọ, umu-okorọbia-unu gāhu ọhù: e, ọbuná n'aru ndi-orù ndikom na n'aru ndinyom nēje ozi ka M'gāwusa Mọm na mb͕e ahu.