JOEL 2:25-26
JOEL 2:25-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri, ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta, na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri, bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu. Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ, unu ga-etokwa ONYENWE ANYị bụ Chineke unu, onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m.
Kesaa
Gụọ JOEL 2JOEL 2:25-26 Bible Nso (IGBOB)
M'gākwughachi kwa unu arọ nile nke igurube na ukpala na ọbubu na palmer-worm riworo, bú oké usu-ndi-agham nke M'zitere n'etiti unu. Unu gēriju afọ, afọ ewe ju unu, unu ewe to aha Jehova, bú Chineke-unu, Onye mesoworo unu n'ilu oké ọlu: ihere agaghi-eme kwa ndim rue mb͕e ebighi-ebi.
Kesaa
Gụọ JOEL 2