JOB 8:3-6
JOB 8:3-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Chineke ọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Onye pụrụ ime ihe niile ọ na-eme ka ihe ziri ezi gbagọọ agbagọ? Mgbe ụmụ gị mehiere megide ya, o weere ha nyefee nʼikpe ọmụma kwesiri mmehie ha. Ma ọ bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike, rịọ Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụrụ na ị bụ onye dị ọcha nʼobi na onye ụzọ ya ziri ezi, ọ bụladị ugbu a, ọ ga-agbachitere gị weghachi gị nʼọnọdụ ịbụ ọgaranya gị.
JOB 8:3-6 Bible Nso (IGBOB)
Chineke, Ọ̀ neme ka ikpé b͕agọ ab͕agọ? Ma-ọbu Onye Nke puru ime ihe nile, Ọ̀ nēme ka ezi omume b͕agọ ab͕agọ? Ọ buru na umu-gi emehiewo megide Ya, Ọ we zilaga ha n'aka nmehie-ha: Ọ buru na gi onwe-gi achọsie Chineke ike, We riọ Onye Nke puru ime ihe nile aririọ-amara; Ọ buru na onye di ọcha n'obi na onye ziri ezi ka i bu; N'ezie ub͕u a Ọ gētetara gi, Me ka ebe-obibi nke ezi omume-gi di n'udo.