JOB 7:11-16
JOB 7:11-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ya mere agaghị m emechi ọnụ; aga m ekwupụta nʼihi ihe mgbu dị m nʼime mmụọ. Aga m eme mkpesa nʼihi ihe ilu dị m nʼobi. A bụ m oke osimiri, maọbụ anụ ukwu dị nʼogbu osimiri, nke mere i ji eche m nche? Mgbe m chere na ihe ndina m ga-akasị m obi, maọbụ na oche izuike m ga-ewepụ ntamu m, nʼagbanyeghị na ị na-eji nrọ menye m egwu werekwa ịhụ ọhụ mee ka m maa jijiji, ya mere, ahọrọ m ị bụ onye a tọgburu atọgbu na ọnwụ, karịa inwe ụdị ahụ m nke a. Ana m asọ ndụ m oyi; agaghị m adị ndụ ruo ebighị ebi. Nʼihi ya, hapụ m ka m nọọrọ onwe m, nʼihi na ụbọchị ndụ m enweghị isi.
JOB 7:11-16 Bible Nso (IGBOB)
Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum; Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm; Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim. Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri, Na I nēdo ndi-nche ichem? Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi, Ihe-ndinam gēbupu ntamum; I we were nrọ me ka m'tua ujọ, I site-kwa-ra n'ọhù me ka m'tua egwu nke-uku: Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u, Na ọnwu kari ọkpukpum ndia. Ajuwom ndu; m'gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: Rapum; n'ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu.