JOB 42:2-5
JOB 42:2-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Amara m na ị pụrụ ime ihe niile; ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa. Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata. “Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu; m ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị ga-azakwa m.’ Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị.
JOB 42:2-5 Bible Nso (IGBOB)
Amawom na I puru ime ihe nile, Amawokwam na adighi-eb͕ochi nzube ọ bula nke sitere na Gi. Ònye bu onye a nke nēzobe ndum-ọdu n'enweghi ọmuma-ihe? N'ihi ya ka m'gosiworo ihe nke m'nādighi-aghọta, Ihe dikaririm ebube, nke m'nādighi-amata. Biko, nuru, mu onwem gēkwu kwa; M'gāju Gi, Gi me kwa ka m'mara. Site n'ọnunu nti ka m'nuru Gi; Ma ub͕u a anyam ahuwo Gi.