Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 40:3-24

JOB 40:3-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ahụ, Job zaghachiri ONYENWE ANYị sị: “Abụ m onye na-erughị eru. Oleekwanụ ka m ga-esi zaghachi gị? Eji m aka m kpuchie ọnụ m. Ekwuola m mbụ, ma enweghị m ọsịsa ọzọ kwuokwa ugboro abụọ, ma agaghị m ekwukwa ọzọ.” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị: “Kwadoo onwe gị dịka dimkpa; enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị, achọkwara m ka i nye m ọsịsa. “Ị ga-aga nʼihu ikwujọ ikpe ziri ezi m? Ị ga-aga nʼihu maa m ikpe ka ị si otu a bụrụ onye ikpe gaara? Ogwe aka gị ọ dị ike dịka nke Chineke? Olu gị ọ pụrụ ịda ụda dịka nke ya? Were ebube na ịdị ukwuu chọọ onwe gị mma, yikwasịkwa onwe gị nsọpụrụ na ugwu dịka uwe. Wụsa iwe gị dị ọkụ nʼebe ndị mpako niile nọ, weda ha nʼala, lekwasịkwa ndị mpako niile anya mee ha ihe ihere, ma tiriekwa ndị na-emebi iwu ebe ha guzo. Likọta ha niile nʼotu nʼaja, kpuchie ihu ha niile nʼala ili. Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị, na aka nri nwere ike ịzọpụta gị. “Lee enyi mmiri anya, bụ nke m kere dịka m si kee gị, ma ihe ọ na-eri bụ ahịhịa dịka ehi. Lee ike dị nʼukwu ya, leekwa ike dị nʼime afọ ya. Ọdụdụ ya ka ọ na-efegharị dịka osisi sida; akwara dị ya nʼahụ ka e jikọtara nke ọma. Ọkpụkpụ ya niile dịka ogidi bronz nwere ụmị, ọkpụkpụ ụkwụ na aka ya dịka okporo igwe. Ya onwe ya bụ otu nʼime ọrụ aka mbụ nke Chineke, ma naanị onye kere ya nwere ike iji mma agha bịa ya nso. Ugwu na-enye ya ihe ọ na-eri. Nʼebe ahụ kwa ka ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ na-anọ egwuri egwu. Ọ na-edina nʼokpuru ahịhịa na-eto nʼakụkụ mmiri, zookwa onwe ya nʼetiti ahịhịa riidi nʼapịtị. Ahịhịa lotus na-eji ndo ya kpuchie ya, osisi pọpla nke dị nʼakụkụ mmiri gbara ya gburugburu. Ọ bụladị mgbe ebili mmiri na-ama, ọ dịghị atụ egwu; ọ na-anọ nwayọọ, nʼagbanyeghị na mmiri Jọdan na-asọpụta na-asọju ya nʼọnụ. Onye pụrụ ijide ya mgbe ọ na-ele anya, maọbụ were ọnya jide ya mapuo ya imi?

JOB 40:3-24 Bible Nso (IGBOB)

Job we za Jehova, si, Le, abum onye elelìworo; gini ka m'gāzaghachi Gi? Atukwasiwom, akam, n'ọnum. Otù ub͕ò ka m'kwuworo okwu, m'gaghi-aza kwa; E, ub͕ò abua, ma m'gaghi-aza kwa ọzọ. Jehova we si n'oké ifufe za Job, si, Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike: M'gāju gi, gi me kwa ka M'mara. Ì nēmebi kwa ikpém? I nāmam ikpe, ka i we buru onye ezi omume? Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere? Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe? Biko, were nbili-elu na idi-elu chọ onwe-gi nma; Were kwa ebube na ima-nma yikwasi onwe-gi. Wusa nrubiga-ókè nke iwe-gi: Hu kwa onye-npako ọ bula, me ka ọ di ala. Hu onye-npako ọ bula, me ka o ruru ala; Zọpia kwa ndi nēmebi iwu n'ọnọdu-ha. Zobekọ ha n'ájá; Kechie iru-ha n'ebe zoro ezo. Emesia Mu onwem gēkele kwa gi, Si na aka-nri-gi nāzọputa gi. Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya; Ọ nāta ahihia dika ehi. Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya, Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya. Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar: Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya. Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi; Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè. Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke: Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso. N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya; Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú. N'okpuru osisi lotus ka ọ nēdina, N'ebe nzuzo nke amì, na apiti. Osisi lotus nēji ǹdò-ha b͕ochie ya; Osisi willow nke miri-iyi di ya buruburu. Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji: Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya. Ànējide ya mb͕e ọ nēle anya? Ma-ọbu ànēwere ọnyà mapue imi-ya?