JOB 32:6-9
JOB 32:6-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị: “Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara, ma unu bụ ndị okenye; ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ, hapụ ịgwa unu ihe m maara. Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu; ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’ Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta. Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe, ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi.
JOB 32:6-9 Bible Nso (IGBOB)
Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, we za, si, Nwata ka m'bu n'ubọchi ndum, ma unu onwe-unu bu ndi kara nká; N'ihi ya ka m'rapuru, we tua egwu ikwuputara unu ihe m'mara. Asirim, Ubọchi bara uba gēkwu okwu, Ọtutu arọ gēme kwa ka amara amam-ihe. N'ezie mọ di nime madu, Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe. Ọ bughi ndi uku mara ihe, Ọ bughi kwa ndi-okenye nāghota ikpé.