JOB 30:20-31
JOB 30:20-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Chineke m, anam etiku gị ma ị dịghị aza m; anam eguzo ọtọ, ma naanị anya ka i lere m. Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere; i ji aka gị dị ike megide m. Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe, ị na-eme ka m bụrụ onye na-akwụfegharị nʼoke ifufe nke mmiri. Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ; ruo nʼebe e debeere mmadụ niile dị ndụ. “Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala; mgbe ọ na-eti mkpu nʼọnọdụ nhụju anya ya na-achọ enyemaka. Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu; ọ bụ na mmụọ m erughị ụjụ nʼihi ndị ogbenye? Ma mgbe m lere anya ihe ọma, ihe ọjọọ bịara; mgbe m lere anya ìhè, mgbe ahụ ka ọchịchịrị bịara. Obi m anaghị ezu ike nʼime m; ụbọchị ahụhụ na-ezute m. Ana m agagharị na-eji nji ma ọ bụghị nʼihi oke anwụ. Eguzola m ọtọ nʼọgbakọ ndị mmadụ tikuo ha ka ha nyere m aka. Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa; onye ya na ikwighịkwighị na-esogharị. Akpụkpọ ahụ m na-eji nji na-ekpe iwere; anụ ahụ m na-anụ ọkụ dịka ihe a kwanyere ọkụ. Ụda ụbọ akwara m bụ ụda iru ụjụ; ụda ọja m bụkwa ụda iti mkpu akwa.
JOB 30:20-31 Bible Nso (IGBOB)
Anametiku Gi, ma I dighi-azam: Eguzorom ọtọ, I we lekwasim anya. I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere: I nēji ume aka-Gi kpab͕uem. I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya, I ne-atugharim n'elu ebili nmirì. N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru, Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu. N'ezie ọ bughi ihe etikpọrọ etikpọ ka Ọ gēseti aka Ya imegide; Ọ buru na ọ di n'ọdida-ya, madu gētiku Chineke n'ihi ihe ndia. Àkwaghm ákwá n'ihi onye ubọchi-ya siri ike? Ò wuteghi nkpuru-obim bayere ob͕eye? Mb͕e m'lere anya ezi ihe, ihe ọjọ bia-kwa-ra; M'we chere ìhè, ma ọchichiri biara. Ngiri-afọm nile nāb͕o ab͕ọ, ha anọghi jū; Ubọchi nweda-n'ala nile abiawo n'irum. Ejeghariwom nēji nji, ọ bughi anyanwu mere ya: Ebiliwom ọtọ nime nkpọkọta madu, tikue Chineke. M'ghọworo nkita-ọhia nwa-nne, Ghọ-kwa-ra enyi-nnunu eyì. Akpukpọ-arum di oji, nādapu n'arum, Ọkpukpum erewo kwa ọku site n'ikpọ-nku. Ubọ-akwaram we ghọ iru-újú, Ọ̀jàm ghọ-kwa-ra olu ndi nākwa ákwá.