Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JOB 2:1-10

JOB 2:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ụbọchị ọzọkwa, ụmụ Chineke bịakwara igosi onwe ha nʼihu ONYENWE ANYị. Ekwensu sonyekwaara ha ọzọ bịakwa igosi onwe ya nʼihu ya. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị jụkwara ekwensu ajụjụ sị, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara ONYENWE ANYị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.” Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị sịrị ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ dị nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla. Ọ ka jidekwara izuoke ya, nʼagbanyeghị na ị kpaliri m imegide ya ka m laa ya nʼiyi mgbe ọ na-adịghị ihe o mere.” Ekwensu zaghachiri ONYENWE ANYị, “Akpụkpọ anụ ahụ lara akpụkpọ anụ ahụ; mmadụ ga-enye ihe niile o nwere nʼọnọdụ ndụ ya. Setịpụ aka gị metụ akpụkpọ anụ ahụ ya na ọkpụkpụ ya, ọ ghakwaghị ị bụ gị ọnụ nʼihu gị.” ONYENWE ANYị sịrị ekwensu, “Lee, ọ nọ nʼaka gị. Kama ị ghaghị idebe ndụ ya.” Mgbe ahụ, ekwensu sitere nʼihu ONYENWE ANYị pụọ. O were ọnya ọjọọ na-egbu mgbu tie Job, site nʼọbọ ụkwụ ya ruo nʼopi isi ya. Job tụtụụrụ mpekele ite wara awa, jiri ya na-akọ onwe ya ọkọ nʼahụ, ma dinara nʼebe e kpokọtara ntụ. Nwunye ya sịrị ya, “Ị ka na-eguzo nʼizuoke gị? Bụọ Chineke ọnụ, nwụọ.” Ma ọ zara, “Ị na-ekwu okwu dịka otu nʼime ndị inyom nzuzu. Anyị ga-anata ihe ọma site nʼaka Chineke, hapụ ịnata ihe ọjọọ?” Ma nʼime nsogbu a niile, Job emehieghị site nʼikwu okwu ọjọọ ọbụla.