JOB 12:7-10
JOB 12:7-10 Bible Nso (IGBOB)
Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe, Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi: Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe; Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi. Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile, Na aka Jehova emewo nka? Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya, Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.
JOB 12:7-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị, maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị. Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị, maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị. Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị na ọ bụ aka ONYENWE ANYị mere nke a? Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị, ya na ndụ ụmụ mmadụ