JOB 11:13-18
JOB 11:13-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya, setịpụ aka gị abụọ nye ya, ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka, ghara ikwe ka ihe ọjọọ dịrị nʼụlọ ikwu gị mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị, ị ga-eguzokwa chịm na-atụghị egwu. Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị, na-echeta ya dịka mmiri gabigara agabiga. Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie, ọchịchịrị ya ga-adịkwa ka ụtụtụ. Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị; ị ga-elegharịkwa anya gburugburu gị zuo ike na-atụghị ụjọ.
JOB 11:13-18 Bible Nso (IGBOB)
Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi, We b͕asa ọbu-aka-gi abua n'ebe Ọ nọ; Ọ buru na ajọ ihe adi n'aka-gi, me ka ọ di n'ebe di anya, Ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri nulo-ikwū-gi nile; N'ihi na mb͕e ahu i gēweli iru-gi nēnweghi ọlu n'aru-gi; I gābu kwa ihe siri ike dika ọla awuru awu, i gaghi-atu kwa egwu: N'ihi na gi onwe-gi gēchezọ ọnọdu ọjọ gi, Dika miri nke gabigara agabiga ka i gēcheta ya: Kari etiti-ehihie ka ubọchi ndu-gi gēbili kwa; Ọ buru na oké ọchichiri adi, ọ gādi ka ututu. I gātukwasi kwa obi, n'ihi na olile-anya di; I gēnyocha kwa, were ntukwasi-obi dina.