JỌN 9:1-12
JỌN 9:1-12 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e Ọ nāgabiga, Ọ hu otù nwoke nke kpuru ìsì site n'ọmumu-ya. Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya, si, Rabai, ònye mehiere, onye a, ma-ọbu ndi muru ya, nke mere ka amua ya n'ìsì? Jisus zara, si, Onye a emehieghi, ndi muru ya emehieghi kwa: kama ka ọlu Chineke we puta ìhè n'aru ya. Ayi aghaghi ilu ọlu Onye ziterem, mb͕e ubọchi fọduru: abali nābia, mb͕e ọ dighi onye ọ bula puru ilu ọlu. Mb͕e ọ bula M'nọ n'uwa, abum Ìhè nke uwa. Mb͕e O kwusiri ihe ndia, Ọ bua ọnu-miri n'ala, were ọnu-miri ahu gwọ ájá, were ájá ahu te n'anya-ya abua, si ya, Je sa miri n'ọdọ-miri ntà nke Sailoam (nke bu, ma asugharia ya, Onye eziteworo). Ya mere O jere, sa miri, bia kwa nāhu uzọ. Ya mere ndi-ab͕ata-obi-ya, na ndi nāhu ya-ri n'oge gara aga, na ọ bu onye-aririọ, ha nāsi, Onye a, ọ̀ bughi onye nānọ ala nāriọ kwa aririọ? Ndi ọzọ nāsi, Ọ bu ya; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama o yiri ya. Ya onwe-ya siri, Mu onwem bu ya. Ya mere ha nāsi ya, Èsi kwa aṅa meghe anya-gi? Onye ahu zara, si, Nwoke ahu anākpọ Jisus gwọrọ ájá, te kwa ya n'anyam abua, sim, Je Sailoam, sa miri: ya mere ejerem, sa miri, ewe me ka M'hu uzọ. Ha si ya, Òle ebe Onye ahu nọ? Ọ si, Amataghm.
JỌN 9:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ọ na-agafe, ọ hụrụ otu nwoke kpuru ìsì site nʼafọ nne ya. Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Onye ozizi, onye mehiere? Nwoke a ka ọ bụ ndị mụrụ ya, nke mere e ji mụọ ya nʼìsí?” Jisọs sịrị, “Nwoke a emehieghị, ndị mụrụ ya emehiekwaghị, kama o kpuru ìsì ka ọrụ Chineke pụta ìhè na ndụ ya. Anyị aghaghị ịrụ ọrụ onye ahụ zitere m, mgbe chi ka dị, anyasị na-abịa mgbe o nweghị onye pụrụ ịrụ ọrụ. Dị ka m nọ nʼụwa, Abụ m ìhè nke ụwa.” Mgbe o kwusiri nke a, ọ bụsara ọnụ mmiri asụ nʼala gwakọta ya na aja, werekwa aja ahụ tee nwoke ahụ nʼanya. Ọ gwara ya, “Gaa nʼọdọ mmiri Sailọm saa ihu gị” (nke a pụtara “Zitere”). Ọ gara saa ihu ya, lọghachita na-ahụ ụzọ. Ndị agbataobi ya na ndị nʼahụ ya nʼoge gara aga ka ọ na-arịọ arịrịọ sịrị, “Nke a, ọ bụghị nwoke ahụ na-anọdụ ala na-arịọ arịrịọ?” Ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ya.” Ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụghị ya. Ọ bụ onye yiri ya.” Ma ọ na-asị, “Abụ m nwoke ahụ.” Ha na-asị ya, “Olee otu anya gị sịrị meghee?” Ọ zara, “Nwoke a na-akpọ Jisọs gwakọtara ụrọ tee m nʼanya. Ọ gwara m sị, ‘Gaa saa ihu gị nʼọdọ mmiri Sailọm.’ A gara m saa onwe m, malitekwa ịhụ ụzọ.” Ha sịrị ya, “Olee ebe nwoke ahụ nọ?” Ọ sịrị, “Amaghị m.”