JỌN 8:1-59
JỌN 8:1-59 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma Jisọs rigooro nʼUgwu Oliv. Nʼisi ụtụtụ echi ya, ọ bịara ọzọ nʼụlọnsọ ukwuu ebe ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya. Ọ nọdụrụ ala malite ikuziri ha ihe. Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko. Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?” Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo. Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala. Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, “Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume.” Ọzọ, o hulatakwara ala malite ide ihe ọ na-ede nʼala. Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, ọ fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya. Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, “Nwanyị, oleekwanụ ha? Ọ dịghị onye mara gị ikpe?” Ọ sịrị, “O nweghị onye ọbụla Onyenwe anyị.” Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe: Gawa, kama emehiekwala ọzọ.” Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.” Ndị Farisii sịrị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị abụghị ezie.” Ma Jisọs zara sị, “A sịkwarị na mụ na-agbara onwe m ama, ama m na-agba bụ eziokwu. Nʼihi na-amara m ebe m si bịa, marakwa m ebe m na-aga. Ma unu aghọtaghị ebe m si bịa, maọbụ ebe m na-aga. Unu na-ekpe ikpe dị ka mmadụ; ma ekpeghị m onye ọbụla ikpe. Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m. E dere nʼiwu unu sị, ‘ama mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’ Ana m agba ama banyere onwe m. Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.” Mgbe ahụ ha jụrụ ya, “Olee ebe Nna gị nọ?” Jisọs zara, “Unu amaghị m, unu amakwaghị Nna m. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.” Okwu ndị a niile ka o kwuru nʼụlọnsọ ukwu ha, mgbe ọ na-akụzi ihe na mpaghara ụlọ ahụ ebe a na-adọba onyinye. Ma ọ dịghị onye ọbụla jidere ya nʼihi na oge ya erubeghị. Ọzọ ọ gwara ha, “Aga m ahapụ unu, unu ga-achọ m, ma unu ga-anwụ nʼime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nʼebe m na-aga.” Nke a mere ka ndị Juu na-asị, “Ọ ga-egbu onwe ya? Ọ bụ ya mere o ji sị, ‘Ebe m na-aga unu apụghị ị bịa’?” Ma ọ sịrị ha, “Unu si nʼala ma esi m nʼelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa a. A sịrị m unu na unu ga-anwụ nʼime mmehie unu, naanị na unu kwenyere na mụ onwe m, bụ onye ahụ.” Ha jụrụ ya, “Onye ka ị bụ?” Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ. E nwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu nʼikpe unu ikpe. Ma matanụ na onye ahụ zitere m bụ onye eziokwu. Nʼihi nke a, ihe niile m nụrụ site nʼọnụ ya ka m gwara ụwa.” Ọ bụ ihe banyere Nna ya ka ọ na-agwa ha, ma ha aghọtaghị ya. Ya mere Jisọs sịrị, “Mgbe unu weliri Nwa nke Mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-ama na mụ onwe m bụ ya. Unu ga-amatakwa na ọ dịghị ihe m na-eme nʼonwe m, kama, dị ka Nna m ziri m ka m na-ekwu ihe ndị a. Onye ahụ nke zitere m na-anọnyekwara m. Ọ hapụghịkwa m mgbe ọbụla, nʼihi na ọ bụ ihe na-amasị ya ka m na-eme mgbe niile.” Mgbe ọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na ya. Jisọs gwara ndị Juu ndị kwere na ya, “Ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwu m nʼezie unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m. Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” Ha zara ya, “Anyị bụ ụmụ Ebraham, o nwebeghị oge anyị ji bụrụ ohu onye ọbụla. Olee otu i si na-asị na a ga-eme ka anyị nwere onwe anyị?” Jisọs zara ha, “Nʼezie, nʼezie asị m unu, onye ọbụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie. Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi. Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu nʼezie, unu ga-abụ ndị nwere onwe unu. Ama m na unu bụ ụmụ ụmụ Ebraham, ma unu na-achọ igbu m nʼihi na okwu m enweghị ọnọdụ nʼime unu. Ana m ekwu ihe m hụrụ nʼebe Nna m nọ, ma unu na-eme ihe unu nụrụ site nʼaka nna unu.” Ha zara ya, “Ebraham bụ nna anyị.” Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebraham, unu gara na-arụ ọrụ Ebraham rụrụ. Ma unu na-achọ igbu m, bụ onye gwara unu eziokwu ahụ m nụrụ nʼebe Chineke nọ. Ebraham emeghị otu a. Unu na-arụ ọrụ nna unu rụrụ.” Ha sịrị ya, “Anyị abụghị ụmụ a mụrụ site nʼịkwa iko; naanị Chineke ya onwe ya bụ otu Nna anyị nwere.” Jisọs gwara ha, “Ọ bụrụ nʼezie na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m nʼanya, nʼihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nʼike aka m. Gịnị mere unu adịghị aghọta ihe m na-ekwu? Ọ bụ na unu enweghị ike ịnabata okwu m. Unu bụ ụmụ nke nna unu ekwensu. Uche unu bụ imezu ihe nke nna unu na-achọ. Ọ bụ ogbu ọchụ site na mbụ. Ọ dịghị ejigide eziokwu nʼihi na eziokwu adịghị nʼime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọdịdị ya sịrị dị, nʼihi na ọ bụ onye ụgha bụrụkwa nna nke ụgha. Ma nʼihi na m na-ekwu eziokwu, ọ bụ ya mere unu ekwenyeghị na m. O nwere onye nʼime unu pụrụ ịtụ m mmehie m nʼihu? Ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, gịnị mere unu ekwenyeghị na m? Onye ọbụla sitere na Chineke na-anụ ihe Chineke na-ekwu. Ihe kpatara unu adịghị anụ bụ maka unu abụghị ndị nke Chineke.” Ndị Juu zara sị, “Anyị e kwughị eziokwu mgbe anyị sịrị na ị bụ onye Sameria, na mmụọ ọjọọ bikwa nʼime gị?” Jisọs zaghachiri, “Mmụọ ọjọọ ọbụla adịghị nʼime m, kama ana m asọpụrụ Nna m, ma unu adịghị asọpụrụ m. Anaghị m achọ otuto nke onwe m, kama ọ dị onye nke na-achọ ya. Ọ bụkwa ya bụ onye ikpe. Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.” Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi. Ị dị ukwuu karịa nna anyị Ebraham? Ọ nwụrụ, ma ndị amụma nwụkwara. Onye ka ị na-eche na ị bụ?” Jisọs zara, “Ọ bụrụ na m etoo onwe m, otuto m bụ ihe efu, Nna m, onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu, bụ onye na-eto m. Amaara m onye ọ bụ nʼagbanyeghị na unu amaghị ya. Aga m abụ onye ụgha ma ọ bụrụ na m ga-asị na-amaghị m onye ọ bụ. Amaara m ya na-edebekwa okwu ya. Nna unu Ebraham ṅụrịrị ọṅụ mgbe o chetara na ọ ga-ahụ ụbọchị m; ọ hụrụ ya ma ṅụrịakwa ọnụ.” Ndị Juu sịrị ya, “Ị gbabeghị iri afọ ise ma ị hụla Ebraham?” Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, tupu amụọ Ebraham, mụ onwe m nọ ya.” Ya mere, ha tụtụlitere nkume ịtụ ya, ma Jisọs zoro onwe ya, sitekwa nʼụlọnsọ ukwuu ahụ pụọ.
JỌN 8:1-59 Bible Nso (IGBOB)
ma Jisus gara ugwu Olive. O we bia kwa ọzọ n'isi-ututu n'ulo uku Chineke, ndi-Ju nile we biakute Ya; O we nọdu ala, we nēzí ha ihe. Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we kuta otù nwanyi nke ejidereri n'ikwa-iko; mb͕e ha guzosiri ya n'etiti, ha we si Ya, Onye-ozizí, ejidewo nwanyi a n'ikwa-iko, mb͕e ọ nēme ihe ahu. Ma n'iwu-ayi Moses nyere ayi iwu itu ndinyom di otú a nkume: gini kwa ka Gi onwe-gi nēkwu bayere ya? Ma nka ka ha nēkwu inwa Ya, ka ha we nwe ihe ha gēji bo Ya ebubo. Ma Jisus ruru ala, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n'ala. Ma mb͕e ha nọgidere nāju Ya, O welie Onwe-ya elu, si ha, Onye akēmehieghi n'etiti unu, ya buru uzọ tu ya nkume. O we ruru kwa ala ọzọ, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n'ala. Ma mb͕e ha nuru ya ha pua n'otù n'otù, malite na ndi bu okenye, rue ndi-ikpe-azu: ewe rapu nání Jisus, Ya na nwanyi ahu, ebe o guzoro, n'etiti. Jisus we welie Onwe-ya elu, si ya, Nwanyi, òle ebe ha nọ? ọ̀ dighi onye ọ bula mara gi ikpé? O we si, Ọ dighi onye ọ bula, Onye-nwe-ayi. Jisus we si, Mu onwem amaghi kwa gi ikpé: ga nke gi. site n'ub͕u a adila nēmehie ọzọ. Ya mere Jisus gwara ha okwu ọzọ, si, Mu onwem bu Ìhè nke uwa: onye nēsom agaghi-ejeghari n'ọchichiri, kama ọ gēnwe Ìhè nke ndu. Ya mere ndi-Farisi siri Ya, Gi onwe-gi nāb͕ara Onwe-gi àmà; àmà nke Gi abughi ezie. Jisus zara, si ha, Asi kwa na Mu onwem b͕ara Onwem àmà, àmà nkem bu ezie; n'ihi na amataram ebe M'siri bia, na ebe M'nāla; ma unu onwe-unu amataghi ebe M'si bia, ma-ọbu ebe M'nāla. Unu onwe-unu nēkpe dika anu-aru si di; Mu onwem ekpeghi onye ọ bula. Ma ọ buru na mu onwem ekpe kwa ikpé, ikpém bu ezie; n'ihi na ọ bughi nání Mu nọ, kama ọ bu Mu onwem na Nna Nke ziterem. Ma edewo kwa n'akwukwọ iwu-unu, na àmà nke madu abua bu ezie. Mu onwem bu onye nāb͕ara Onwem àmà, Nna Nke ziterem nāb͕a-kwa-ram àmà. Ya mere ha si Ya, Òle ebe Nna-Gi di? Jisus zara, si, Unu amataghi m, unu amataghi kwa Nnam: ọ buru na unu mataram, unu gāmata-kwa-ri Nnam. Okwu ndia ka O kwuru n'ebe anēdebe ùtú anātu, mb͕e Ọ nēzí ihe n'ulo uku Chineke: ọ dighi kwa onye ọ bula jidere Ya; n'ihi na oge hour Ya akābiarughi. Ya mere Ọ siri ha ọzọ, Mu onwem nāla, unu gāchọkwam, unu gānwu kwa na nmehie-unu: ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia. Ya mere ndi-Ju nāsi, Ò gēb͕u Onwe-ya, na Ọ nāsi, Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apughi ibia? O we si ha, Unu onwe-unu si n'ebe di ala puta; Mu onwem si n'ebe di elu puta: unu onwe-unu si n'uwa nka puta; Mu onwem esighi n'uwa nka puta. Ya mere M'siri unu, na unu gānwu na nmehie nile unu: n'ihi na ọ buru na unu ekweghi na Mu onwem bu Ya, unu gānwu na nmehie nile unu. Ya mere ha nāsi Ya, Gì onwe-gi bu onye? Jisus siri ha, Ọbuná ihe M'nāgwa kwa unu site na mbu. Enwerem ọtutu ihe M'gēkwu nke M'gēkpe kwa bayere unu: ma Onye ziterem bu ezie; ihe Mu onwem nu-kwa-ra n'ọnu Ya, ihe ndia ka M'nāgwa uwa. Ha amaghi na Ọ nāgwa ha okwu bayere Nna-Ya. Ya mere Jisus siri, Mb͕e ọ bula unu gēweliwori Nwa nke madu elu, mb͕e ahu ka unu gāmara na Mu onwem bu Ya, na ọ dighi kwa ihe M'nēme n'Onwem, kama dika Nnam zírim, otú a ka m'nēkwu ihe ndia. Mu na Onye ziterem nọ kwa; Ọ rapughi nání Mu; n'ihi na Mu onwem nēme ihe nātọ Ya utọ mb͕e nile. Mb͕e Ọ nēkwu okwu ndia, ọtutu madu kwere na Ya. Ya mere Jisus nāsi ndi-Ju ndi kwere-Ya-ri, Ọ buru na unu onwe-unu anọgide n'okwum, unu bu ndi nēso uzọm n'ezie; unu gāmara kwa ezi-okwu, ezi-okwu ahu gēme kwa ka unu pua n'orù. Ha zara Ya, si, Ayi bu nkpuru Abraham, ọ kādighi kwa mb͕e ọ bula ayi bu orù onye ọ bula: Gì onwe-gi si aṅa kwu, Agēme ka unu pua n'orù? Jisus zara ha, si, N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye ọ bula nke nēmehie bu orù nmehie. Ma orù adighi-anọgide n'ulo rue mb͕e ebighi-ebi: nwa nānọgide ebighi-ebi. Ya mere ọ buru na Ọkpara gēme ka unu pua n'orù, unu gābu ndi puworo n'orù n'ezie. Amataram na unu bu nkpuru Abraham; ma unu nāchọ uzọ ib͕um, n'ihi na okwum enweghi ọnọdu nime unu. Anamekwu ihe Mu onwem huworo n'ebe Nnam nọ: ya mere unu onwe-unu nēme kwa ihe unu nuru n'ọnu nna-unu. Ha zara, si Ya, Nna-ayi bu Abraham. Jisus si ha, Ọ buru na unu bu umu Abraham, unu gālu ọlu Abraham. Ma ub͕u a unu nāchọ uzọ ib͕um, bú Madu Nke gwaworo unu ezi-okwu, nke M'nuru n'ọnu Chineke: nka ka Abraham nēmeghi. Unu onwe-unu nālu ọlu nna-unu. Ha siri Ya, Amughi ayi onwe-ayi site n'ikwa-iko otù Nna ka ayi nwere, bú Chineke. Jisus siri ha, Ọ buru na Chineke bu Nna-unu, unu gāhum n'anya: n'ihi na Mu onwem siri n'ebe Chineke nọ puta we bia; n'ihi na abiaghm n'Onwem, kama Ya onwe-ya ziterem. N'ìhi gini ka unu nāmaghi ihe M'nēkwu? Ọ bu n'ihi na unu apughi inu okwum. Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya. Ma n'ihi na Mu onwem nēkwu ezi-okwu, unu ekweghm. Ònye nime unu turum nmehie n'anya? Ọ buru na M'nēkwu ezi-okwu, n'ìhi gini ka unu onwe-unu nēkweghm? Onye sitere na Chineke nānu okwu Chineke: n'ihi nka ka unu onwe-unu nānughi ha, n'ihi na unu esiteghi na Chineke. Ndi-Ju zara, si Ya, Àyi onwe-ayi ekwughi nke-ọma, si na Gi onwe-Gi bu Onye Sameria, I nwe-kwa-ra mọ ọjọ? Jisus zara, si, Mu onwem enweghi mọ ọjọ; kama anamasọpuru Nnam, unu onwe-unu nēmekwam ihe-ihere. Ma Mu onwem achọghi otuto nkem: otù Onye di Nke nāchọ nēkpe kwa ikpé. N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-ahu ọnwu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. Ndi-Ju siri Ya, Ub͕u a ka ayi mara na I nwere mọ ọjọ. Abraham nwuru, na ndi-amuma; ma Gi onwe-gi nāsi, Ọ buru na onye ọ bula edebe okwum, ọ gaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. Ọ̀ gābu na Gi onwe-gi ka nna-ayi Abraham uku, onye nwuru anwu? ndi-amuma nwu-kwa-ra: ònye ka I nēme Onwe-gi? Jisus zara, si, Ọ buru na Mu onwem enye Onwem otuto, otuto nkem bu ihe-efu: Nnam bu Onye nēnyem otuto; Onye unu onwe-unu nāsi, na Ọ bu Chineke-unu; unu amaghi kwa Ya; ma Mu onwem matara Ya; ọ buru kwa na agamasi, Amataghm Ya, M'gēyi unu, buru onye-ugha: ma amataram Ya, nēdebe kwa okwu-Ya. Obi tọrọ nna-unu Abraham utọ nke-uku ihu ub͕ọchim; o we hu ya, ṅuri kwa ọṅu. Ya mere ndi-Ju siri Ya, I kāb͕aghi ọgu arọ abua na iri, Ì huwo kwa Abraham? Jisus siri ha, N'ezie, n'ezie, asim unu, Mb͕e akāmughi Abraham Mu onwem di. Ya mere ha tuturu nkume itu Ya: ma Jisus zobere Onwe-ya, we si n'ulo uku Chineke pua.