JỌN 7:32-53
JỌN 7:32-53 Bible Nso (IGBOB)
Ndi-Farisi nuru ìgwè madu ahu ka ha nātamu ntamu ndia bayere Ya; ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi we ziga ndi nējere ha ozi ka ha jide Ya. Ya mere Jisus siri, Ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ, M'we lakuru Onye ziterem. Unu gāchọm, ma unu agaghi-achọtam: ebe Mu onwem nọ kwa, unu onwe-unu apughi ibia. Ya mere ndi-Ju siritara onwe-ha, Òle ebe Onye a gaje iga na ayi onwe-ayi agaghi-achọta Ya? Ọ̀ gaje igakuru ndi b͕asara n'etiti ndi-Grik na izí ndi-Grik ihe? Gini bu okwu a nke O kwuru, si, Unu gāchọm, ma unu agaghi-achọtam: ebe Mu onwem nọ kwa, unu onwe-unu apughi ibia? Ma n'ubọchi ikpe-azu, bú oké ubọchi nke ememe ahu, Jisus guzoro, we tie nkpu, si, Ọ buru na akpiri kpọrọ madu ọ bula nku, ya biakutem, ṅua miri. Onye nēkwere na Mu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ kwuru, n'afọ-ya ka osimiri nke miri di ndu gēsi nērùputa. Ma nka ka O kwuru bayere Mọ Nsọ, Nke ndi kwere na Ya gaje inara: n'ihi na akēnyeghi Mọ Nsọ; n'ihi na akēnyeghi Jisus otuto. Ya mere ufọdu nime ìgwè madu ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia, ha si, N'ezie Onye a bu onye-amuma ahu. Ndi ọzọ nāsi, Onye a bu Kraist-ayi. Ma ufọdu nāsi, Gini, ọ̀ gābu na Galili ka Kraist-ayi si bia? Àkwukwọ nsọ ekwughi na Kraist-ayi nēsi na nkpuru Devid bia, site kwa na Betlehem, bú obodo ntá ebe Devid nọri? Ya mere nkewa putara n'etiti ìgwè madu ahu n'ihi Ya. Ma ufọdu nime ha chọrọ ijide Ya; ma ọ dighi onye ọ bula tukwasiri Ya aka. Ya mere ndi ahu ndi nēje ozi biakutere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi; ndi ahu we si ha, N'ìhi gini ka unu nēkutaghi Ya? Ndi ahu ndi nēje ozi zara, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula madu kwuru okwu di otú a. Ya mere ndi-Farisi zara ha, si, Èduhiewo kwa unu onwe-unu? Ọ̀ di onye ọ bula n'etiti ndi-isi, ma-ọbu n'etiti ndi-Farisi, kwere na Ya? Ma ìgwè madu a nke nāmaghi iwu-ayi bu ndi anābu ọnu. Nikọdimọs si ha (onye biakutere Ya na mbu, ebe ọ bu otù onye nime ha), Ìwu-ayi nēkpe madu ikpé, ọ buru na o bughi uzọ nu n'ọnu-ya, we mara ihe ọ nēme? Ha zara, si ya, Gì onwe-gi si kwa na Galili puta? Nyocha n'akwukwọ nsọ, le kwa na ọ dighi onye-amuma si na Galili bilie. Ha nile we la, onye ọ bula n'ulo nke aka ya
JỌN 7:32-53 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị Farisii nụrụ ka igwe mmadụ ahụ na-atamu ntamu nʼolu nta banyere ya. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja na ndị Farisii zigara ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwuu ahụ ka ha gaa jide ya. Jisọs sịrị, “Naanị nwa oge ka mụ na unu ga-anọ, aga m alakwurukwa onye zitere m. Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.” Ndị Juu sịrịtara onwe ha, “Olee ebe nwoke a chọrọ ịga anyị na-agaghị achọta ya? Ọ ga-eje ebe ndị nke anyị a chụsasịrị achụsasị bi nʼetiti ndị Griik, ka ọ ga kuziere ndị Griik ihe? Kedụ ụdị okwu bụ nke a ọ na-ekwu sị, ‘Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m,’ na ‘Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru’?” Nʼụbọchị ikpeazụ bụkwa ụbọchị kacha ibe ya nke mmemme ahụ, Jisọs guzooro ọtọ jiri oke olu tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọbụla nkụ, ya bịakwute m bịa ṅụrụ mmiri. Onye ọbụla kweere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwururị, isi iyi mmiri nke ndụ ga na-asọpụta site nʼime afọ ya.” O kwuru nke a banyere Mmụọ ahụ ndị kwere na ya ga-anata. Tutu ruo oge ahụ, e nyebeghị Mmụọ ahụ, nʼihi na e nyebeghị Jisọs otuto. Mgbe ha nụrụ nke a, ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị, “Nʼeziokwu onye a bụ onye amụma ahụ.” Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ Kraịst ahụ.” Ma ndị nke ọzọ sịkwara, “Nʼezie Kraịst ahụ, ọ ga-esi na Galili pụta? Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?” Ya mere nkewa dapụtara nʼetiti igwe mmadụ ahụ nʼihi ya. Ụfọdụ chọrọ ijide ya ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka. Mgbe ahụ, ndị nche ụlọnsọ ukwu lọghachiri nʼebe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nọ, ndị sịrị ha, “Gịnị mere unu akpụtaghị ya?” Ha zara, “Anyị ahụbeghị onye kwuru okwu dị ka nwoke a.” Ndị Farisii zara ha, “Unu esorola bụrụ ndị a ghọgburu? Ọ dị onye ọbụla nʼime ndịisi maọbụ nʼime ndị Farisii tụkwasịrị ya obi? E e! Kama igwe mmadụ ndị a na-amaghị iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ.” Nikọdimọs, otu nʼime ha bụ onye bịakwutere ya na mbụ sịrị ha, “Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ nụta okwu nʼọnụ ya, ịchọpụta ihe onye ahụ na-eme?” Ha zaghachiri ya sị, “Gị onwe gị, i sokwa na ndị si Galili pụta? Nyochaa nke ọma, ị ga-achọpụta na onye amụma ọbụla agaghị esi na Galili pụta.” [Akwụkwọ ndị mbụ na ọtụtụ ndị ochie gbara akaebe enweghị amaokwu nke iri ise na atọ nʼakwụkwọ Jọn isi nke asaa ruo Jọn isi asatọ amaokwu nke iri na otu Jọn 7:53–8:11. Ụfọdụ akwụkwọ na-edebanye amaokwu ndị a, nʼebe o zuruoke maọbụ ụfọdụ nʼime ya, ma o bụrụ na ha edechaa Jọn isi asaa amaokwu nke iri atọ na isii, Jọn 7:36, Jọn 21:25, Luk 21:38 maọbụ Luk 24:53.] Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime ha lara nʼụlọ ya.