Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 7:1-24

JỌN 7:1-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gagharịrị na Galili, ma ọ kpachapụrụ anya hapụ ịga Judịa nʼihi na ndị Juu na-achọ ụzọ igbu ya. Mmemme Ụlọ ikwu ndị Juu dị nso, ya mere, ụmụnne ya ndị nwoke sịrị ya, “Si nʼebe a pụọ, gaa Judịa, ka ndị na-eso ụzọ gị nwe ike ịhụ ọrụ ị na-arụ. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla chọrọ ịbụ onye ọha mmadụ ma, nke na-eme ihe na nzuzo. Ebe ọ bụkwanụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.” Nʼihi na ọ bụladị ụmụnne ya ekwenyeghị na ya. Jisọs sịrị ha, “Oge nke m erubeghị, ma oge nke unu nọ nʼebe a mgbe niile. Ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị nʼihi na ana m agba ama megide ya nʼọrụ ya jọrọ njọ. Unu onwe unu gaanụ na mmemme ahụ, agaghị m aga mmemme a nʼihi na oge m erubeghị.” Mgbe o kwusiri nke a, ọ nọgidere na Galili. Ma otu ọ dị, mgbe ụmụnne ya gawara mmemme ahụ ya onwe ya gakwara. Ọ gaghị ebe mmadụ niile ga-ahụ ya kama ọ gara na nzuzo. Na mmemme ahụ ndị Juu nọ na-ele anya ma na-ajụgharị sị, “Olee ebe ọ nọ?” E nwere oke ntamu nʼetiti igwe mmadụ ahụ banyere ya. Ndị ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.” Ndị ọzọ na-asị, “Mba, ọ na-eduhie igwe mmadụ.” Ma o nweghị onye ọbụla kwulitere okwu maka ya nʼihu ọha nʼihi egwu ndị Juu. Mgbe o ruru nʼetiti mmemme ahụ, Jisọs banyere nʼime ụlọnsọ ukwu ma bido ikuzi ihe. Site nʼoke mgbagwoju anya, ndị Juu jụrịtara onwe ha sị, “Olee otu nwoke a sịrị nweta amamihe dị otu a ebe ọ bụ na o nwebeghị onye kuziri ya ihe ọbụla?” Jisọs zara ha, “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye ahụ zitere m. Onye ọbụla na-achọ ime uche Chineke, ọ ga-achọpụta ma ozizi m ọ bụ nke m ma o sikwanụ na Chineke. Ndị ahụ na-ekwu nke onwe ha na-eme nke a iji wetara onwe ha ugwu, ma onye ahụ na-achọ ugwu nke onye zitere ya bụ onye eziokwu; o nwekwaghị ihe ọbụla bụ ụgha banyere ya. Mosis o nyeghị unu iwu? Ma o nweghị onye ọbụla nʼime unu na-edebe iwu ahụ. Gịnị mere unu ji achọ igbu m?” Igwe mmadụ ahụ zara, “Mmụọ ọjọọ bi nʼime gị, onye chọrọ igbu gị?” Jisọs zara sị ha, “Arụrụ m otu ọrụ, ma unu niile nọ na mgbagwoju anya. Mosis nyere unu iwu ibi ugwu (nʼagbanyeghị na o siteghị na Mosis, kama na nna nna anyị ha), nʼụbọchị izuike unu na-ebikwa mmadụ ugwu. Ọ bụrụ na e nwere ike bie mmadụ ugwu nʼụbọchị izuike ka a ghara imebi iwu Mosis, gịnị mere o ji na-ewute unu na m mere ka ahụ mmadụ zuo oke nʼụbọchị izuike? Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”

JỌN 7:1-24 Bible Nso (IGBOB)

Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus we nējeghari na Galili: n'ihi na Ọ chọghi ijeghari na Judia, n'ihi na ndi-Ju nāchọ uzọ ib͕u Ya. Ma ememe ahu nke ndi-Ju, bú ememe ulo-ikwū, di nso. Ya mere umu-nne-Ya siri Ya, Si n'ebe a pua, je na Judia, ka ndi nēso uzọ-Gi we hu kwa ọlu-Gi nile nke I nālu. N'ihi na ọ dighi onye ọ bula nēme ihe ọ bula na nzuzo, ma asi na ya onwe-ya nāchọ ka ọra madu mara ya. Ọ buru na I nēme ihe ndia, me Onwe-gi ka I puta ìhè nye uwa. N'ihi na ọbuná umu-nne-Ya ekweghi na Ya. Ya mere Jisus si ha, oge nkem akērughi; ma oge nke unu bu ihe edoziworo mb͕e nile. Uwa apughi ikpọ unu asì; ma ọ nākpọ Mu onwem asì, n'ihi na Mu onwem nāb͕ara ya àmà, na ọlu-ya nile jọrọ njọ. Rigonu onwe-unu n'ememe a: Mu onwem agaghi-arigoro ememe a ub͕u a; n'ihi na oge nkem akēzughi. Ma mb͕e Ọ gwasiri ha okwu ndia, Ọ nānọgide na Galili. Ma mb͕e umu-nne-Ya rigosiri ememe ahu, mb͕e ahu Ya onwe-ya rigo-kwa-ra, ọ bughi n'iru ọra madu, kama dika ọ bu na nzuzo. Ya mere ndi-Ju nāchọ Ya n'ememe, nāsi, Òle ebe Onye ahu nọ? Oké ntamu di kwa n'etiti ìgwè madu nile bayere Ya: ufọdu nāsi, Ọ bu ezi madu; ndi ọzọ nāsi, É-è, kama Ọ nēduhie ìgwè madu a. Otú ọ di, ọ dighi onye ọ bula nēkwuwa okwu bayere Ya n'ihi egwu ndi-Ju. Ma mb͕e o ruru n'etiti ememe ahu ub͕u a Jisus rigoro n'ulo uku Chineke, we nēzí ihe. Ya mere o nēju ndi-Ju anya, ha si, Onye a, Ò si aṅa mata akwukwọ ri nne, n'ebe ọ dighi mb͕e Ọ muworo akwukwọ? Ya mere Jisus zara ha, si, Ozizím abughi nkem, kama ọ bu nke Onye ziterem. Ọ buru na onye ọ bula achọ ime ihe Ọ nāchọ, ọ gāmara ihe ozizí a bu, ma o sitere n'aka Chineke, ma-ọbu na Mu onwem nēkwu site n'Onwem. Onye nēkwu site n'onwe-ya nāchọ otuto nke aka ya: ma onye nāchọ otuto nke onye zitere ya, onye ahu bu onye ezi-okwu, ajọ omume adighi kwa nime ya. Ọ̀ bughi Moses nyere unu iwu-unu, ma ọ dighi onye ọ bula nime unu nēme iwu ahu? Gini mere unu nāchọ uzọ ib͕um? Ìgwè madu ahu zara, si, I nwere mọ ọjọ: ònye nāchọ uzọ ib͕u Gi? Jisus zara, si ha, Otù ọlu ka M'luru, o we nēju unu nile anya. Ọ bu n'ihi nka ka Moses nyere unu ibì-úgwù (ọ bughi na o sitere n'aka Moses, kama o sitere n'aka nna-ayi-hà); n'ubọchi-izu-ike unu nēbì kwa madu úgwù. Ọ buru na ebì madu úgwù n'ubọchi-izu-ike, ka ewe ghara imebi iwu Moses; ùnu nwere òlùlù ọjọ n'arum, n'ihi na emerem ka aru dichasia otù madu nma n'ubọchi-izu-ike? Unu elela iru kpe ikpé, kama nēkpenu ikpé ziri ezi.