JỌN 6:8-11
JỌN 6:8-11 Bible Nso (IGBOB)
Otù nime ndi nēso uzọ-Ya, bú Andru nwa-nne Saimon Pita, si Ya, Otù nwa-okoro ntà nọ n'ebe a, onye ji ob͕e achicha barley ise, na azù abua: ma ǹdia bu gini n'etiti ọtutu madu di otú a? Jisus siri, Menu ka madu ndia nọdu ala. Ma ahihia riri nne n'ebe ahu. Ya mere ndikom ahu we nọdu ala, n'ọnu-ọgugu ra ka nnù iri na nnù abua na ọgu iri. Ya mere Jisus nara ob͕e achicha ise ahu, we kele, we kèsa ha nye ndi nānọdu ala; otú ahu O were azù ahu kèsa nye ha ka azù ha chọrọ ra.
JỌN 6:8-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye ọzọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya bụ Andru, nwanne Saimọn Pita, kwupụtara, “Otu nwantakịrị nwoke nọ nʼebe a nwere ogbe achịcha balị ise, na azụ abụọ, ma gịnị ka ha bụ nʼetiti igwe mmadụ ha otu a?” Jisọs sịrị, “Meenụ ka ndị mmadụ ndị a nọdụ ala.” E nwere ọtụtụ ahịhịa nʼebe ahụ, ụmụ nwoke nọdụrụ ala, ha dị ihe ruru puku mmadụ ise. Ya mere, Jisọs weere achịcha ahụ nye ekele, kee ha ndị niile nọdụrụ ala dị ka ha sịrị chọọ. O jikwa azụ ahụ mee otu ihe ahụ.