Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 5:1-18

JỌN 5:1-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe nke a gasịrị, otu mmemme ndị Juu ruru, Jisọs agaa Jerusalem. Ma otu ọdọ mmiri nta dị nʼime Jerusalem nʼakụkụ Ọnụ ụzọ ama Atụrụ. Aha ọdọ mmiri ahụ nʼasụsụ Hibru bụ Betsaida, nke nwere mgbe ọnụ ụzọ ise. Nʼime ya ka igwe ndị ahụ na-esighị ike na-edina; ndị ìsì, ndị ngwụrọ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, ha na-eche mgbe mmiri ahụ ga-enugharị. Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-agbadata site na mgbe ruo na mgbe gbarụọ mmiri ahụ. Onye ọrịa ọbụla buru ụzọ daba nʼime mmiri ahụ ma a gbarụọ ya, ka a na-agwọ ihe ọbụla bụ ọrịa ya. Otu nwoke nọ nʼebe ahụ bụ onye nọrọla nʼọrịa iri afọ atọ na asatọ. Mgbe Jisọs hụrụ ya, matakwa na ọ nọọla nʼọnọdụ a ogologo oge, ọ jụrụ ya sị, “Ị chọrọ ka a gwọọ gị ọrịa?” Onye ọrịa ahụ zara, “Nna m ukwu, enweghị m onye ọbụla ga-enyere m aka kuba m nʼime ọdọ mmiri a ma a gbarụọ ya, mgbe o bụla m chọrọ ka m danye, onye ọzọ na-eburu m ụzọ danye.” Jisọs gwara ya, “Bilie, chilie ute gị jegharịa.” Nʼotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma, ọ chịlịri ute ya, malite ijegharị. Ihe a mere nʼụbọchị izuike. Ma ndị Juu gwara nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa, “Taa bụ ụbọchị izuike, o megidere iwu na ị ga-ebu ute gị.” Ma ọ zaghachiri ha, “Nwoke ahụ mere ka ahụ dị m mma sịrị m, ‘Chilie ute gị laa.’  ” Ha jụrụ ya, “Onye bụ onye ahụ gwara gị ka ị chilie ya laa?” Ma nwoke ahụ a gwọrọ amataghị onye ọ bụ nʼihi na Jisọs zoro onwe ya banye nʼetiti igwe mmadụ. Emesịa, Jisọs hụrụ ya nʼime ụlọnsọ ukwu sị ya, “Lee, e mela ka ahụ dị gị mma, emehiekwala ọzọ ka nke dị njọ karịa nke a hapụ ịbịakwasị gị.” Nwoke a siri nʼebe ahụ pụọ gaa gwa ndị Juu na ọ bụ Jisọs gwọrọ ya. Ya mere, nʼihi na Jisọs na-eme ihe ndị a nʼụbọchị izuike, ndị Juu malitere isogbu ya. Jisọs sịrị ha, “Nna m na-arụ ọrụ mgbe niile ruo ugbu a, mụ onwe m kwa, ana m arụ ọrụ.” Nʼihi nke a, ndị Juu chọsịrị ike igbu ya. Ọ bụghị naanị na o mebiri ụbọchị izuike, kama ọ na-akpọkwa Chineke Nna ya, sitekwa otu a na-eme ka ya na Chineke hara.

JỌN 5:1-18 Bible Nso (IGBOB)

Mb͕e ihe ndia gasiri otù ememe nke ndi-Ju di; Jisus we rigoro Jerusalem. Ma ọdọ-miri ntà di na Jerusalem n'akuku ọnu-uzọ-ama nke aturu, nke anākpọ n'asusu Hibru Betesda, nke nwere ulo-ìbà ise. Nime ndia ka ìgwè madu ndi aru-ha nādighi ike nēdina, ndi-ìsì, ndi-ngwurọ ndi akuku-aru-ha kpọnwuru akpọnwu, [nēche uṅarà nke miri ahu. N'ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nāridata n'ọdọ-miri ntà ahu n'oge ufọdu, we kpasue miri ahu: ya mere onye buru uzọ ba nime ya mb͕e akpasusiri miri ahu, eme ka aru di ya nma, n'ọria ọ bula jidere ya.] Ma otù nwoke nọ n'ebe ahu, onye nọri orú arọ na iri na asatọ na nriaria-ya. Mb͕e Jisus huru onye a ka o nēdina, ebe Ọ ma-kwa-ra na ọ nọri ogologo oge n'ọnọdu ahu, Ọ si ya, Ì nāchọ ka eme ka aru di gi nma? Onye ahu aru nādighi ike zara Ya, si, Onye-nwe-ayi, enweghm madu, ka ọ tubàm n'ọdọ-miri ntà nka, mb͕e ọ bula akpasuru miri: ma mb͕e mu onwem nọ nābia, onye ọzọ eburum uzọ rida. Jisus si ya, Bilie, chiri ute-gi, nējeghari. Ngwa ngwa ewe me ka aru di nwoke ahu nma, o we chiri ute-ya, we nējeghari. Ma ọ bu ubọchi-izu-ike n'ubọchi ahu. Ya mere ndi-Ju nāsi onye ahu emere ka aru-ya di ike, Ọ bu ubọchi-izu-ike, o zighi kwa ezi n'iwu ka i chiri ute-gi. Ma ọ zara ha, si, Onye mere ka aru dim nma, onye ahu sirim, Chiri ute-gi, nējeghari. Ha juru ya, si, Ònye bu Madu ahu Nke siri gi, Chiri ute-gi nējeghari? Ma onye ahu emere ka aru di ya ike amataghi Onye ọ bu: n'ihi na Jisus wezugarari Onwe-ya, n'ihi na ìgwè madu di n'ebe ahu. Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus chọputara ya n'ulo uku Chineke, si ya, Le, emewo ka aru di gi nma: emehiela ọzọ, ka ihe jọkariri njọ ghara ime gi. Nwoke ahu jere, gwa ndi-Ju na ọ bu Jisus mereri ka aru di ya nma. N'ihi nka ka ndi-Ju nēsob͕u kwa Jisus, n'ihi na Ọ nēme ihe ndia n'ubọchi-izu-ike. Ma Jisus zara ha, si, Nnam nālu ọlu rue ub͕u a, Mu onwem nālu kwa ọlu. Ya mere n'ihi nka ka ndi-Ju nāchọ kari uzọ ib͕u Ya, n'ihi na ọ bughi nání na Ọ nēmebi ubọchi-izu-ike, kama Ọ nākpọ kwa Chineke Nna nke aka Ya, nēme ka Ya onwe-ya na Chineke ra.